Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 103

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ

MATIU 21:12, 13, 18, 19 MAK 11:12-18 LUK 19:45-48 JỌN 12:20-27

  • JIZỌS BỤRỤ OSISI FIG ỌNỤ, MEEKWA KA ỤLỌ NSỌ DỊ ỌCHA

  • JIZỌS GA-ANWỤRỊRỊ KA ỌTỤTỤ NDỊ NWEE IKE NWETA NDỤ EBIGHỊ EBI

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọọla abalị atọ na Betani kemgbe ha si Jeriko lọta. Ma ugbu a, n’isi ụtụtụ Mọnde, abalị iri n’ọnwa Naịsan, ha na-aga Jeruselem. N’oge ahụ, agụụ na-agụ Jizọs. N’ihi ya, mgbe ọ hụrụ osisi fig, ọ gawara n’ebe ọ dị ka ọ mara ma ọ̀ ga-aghọta mkpụrụ na ya. Osisi fig ahụ ọ̀ mịalanụ mkpụrụ?

Ọnwa Mach agwụwala mgbe ahụ. Ma mgbe osisi fig ji amị mkpụrụ bụ n’ọnwa Jun. N’agbanyeghị ya, osisi fig ahụ ruru akwụkwọ ngwa ngwa. N’ihi ya, Jizọs tụrụ anya na o kwesịla ịmị mkpụrụ, ọ bụ eziokwu na oge o ji amị mkpụrụ erubeghị. Ma, o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ hụrụ na ya. Akwụkwọ fig ahụ mere ka o yie ka mkpụrụ ọ̀ dị n’osisi fig ahụ. N’ihi ya, Jizọs sịrị: “Amịla mkpụrụ onye ọ bụla ga-eri ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.” (Mak 11:14) Ozugbo Jizọs kwuchara ihe a, osisi fig ahụ bidoro kpọnwụwa. N’ụtụtụ echi ya, ọ ga-eji ihe a merenụ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe.

Obere oge ihe a mechara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya rutere Jeruselem. Jizọs banyere n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ọ bara n’ehihie ụnyaahụ ya gaa legharịa anya. Ma, ihe mere o ji banye n’ụlọ nsọ ahụ taa abụghị naanị ka o legharịa anya. O mere ụdị ihe ahụ o mere n’afọ atọ ya gara aga n’oge Ememme Ngabiga nke afọ 30. (Jọn 2:14-16) Jizọs chụpụrụ “ndị na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ.” O kpukwara “tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu.” (Mak 11:15) O kwedịghị ka onye ọ bụla buru ihe ma jiri ogige ụlọ nsọ ahụ mere ụzọ ọ ga-esi aga ebe ndị ọzọ na Jeruselem.

Gịnị mere Jizọs ji kata obi chụpụ ndị na-agbanwe ego na ndị na-ere anụmanụ n’ụlọ nsọ? Ọ sịrị: “Ọ̀ bụ na e deghị, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị mba niile’? Ma unu emewo ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Mak 11:17) Ihe mere o ji kpọọ ha ndị na-apụnara mmadụ ihe bụ na ego ole ha na-eresị ndị mmadụ anụmanụ ha ga-eji chụọ àjà karịrị akarị. Jizọs weere ihe ahụ ha na-eme ka ịpụnara mmadụ ihe ma ọ bụ izu ohi.

Mgbe ndị isi nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndị ọzọ a ma ama nụrụ ihe Jizọs mere, ha gbalịsiwere ike igbu ya. Ma, nsogbu ha bụ na ha amaghị otú ha ga-esi egbu Jizọs n’ihi na ndị mmadụ na-esogharị ya ka ọ kụziere ha ihe.

Ọ bụghị naanị ndị Juu bịara Ememme Ngabiga ahụ, ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu bịakwara. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Grik. Ha gakwuuru Filip gwa ya na ha chọrọ ịhụ Jizọs. O nwere ike ịbụ otú ahụ Filip zara aha Grik mere ha ji gakwuru ya. Ọ ga-abụ na Filip amaghị ma Jizọs ọ̀ ga-achọ ka ha na ya hụ. N’ihi ya, ọ gara kọsara ya Andru, ha abụọ esorozie gaa gwa ya Jizọs. Ọ ga-abụ na Jizọs ka nọ n’ụlọ nsọ mgbe ahụ.

Jizọs ma na ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka ọ nwụọ. N’ihi ya, ihe ahụ abụghị oge ọ ga-eji zawa ndị mmadụ ajụjụ niile ha nwere ma ọ bụ chọwa ka a nụwa aha ya. O meere Filip na Andru ihe atụ, sị: “Oge awa eruwo ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na otu mkpụrụ ọka wit adaghị n’ala wee nwụọ, ọ na-abụ otu mkpụrụ ọka; ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ na-amị ọtụtụ mkpụrụ.”—Jọn 12:23, 24.

Otu mkpụrụ ọka nwere ike iyi ihe na-abachaghị uru. Ma a kụọ ya, ya ‘anwụọ,’ o nwere ike ipu, ma mechaa ghọọ okporo ọka nwere ọtụtụ mkpụrụ na ya. Ọ bụkwa otú ọ dị Jizọs. Ọ bụ nwoke zuru okè. Ma, ebe o fere Chineke ruo ọnwụ, Chineke ga-esi n’aka ya nye imeriime ndị dị ka ya na-anaghị achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru, ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Onye hụrụ mkpụrụ obi ya n’anya na-ebibi ya, ma onye kpọrọ mkpụrụ obi ya asị n’ụwa a ga-echebe ya maka ndụ ebighị ebi.”—Jọn 12:25.

Jizọs anaghị eche naanị banyere onwe ya. N’ihi ya, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m, ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù.” (Jọn 12:26) Ngọzi a enweghị atụ. Ndị ahụ Chineke ga-eme ka ha nwee ùgwù ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze ya.

Mgbe Jizọs chetara otú ọ ga-esi taa ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ike, o kwuru, sị: “Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m ugbu a, gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’oge awa a.” Ma Jizọs chọrọ imezu uche Chineke. N’ihi ya, o kwuru, sị: “Otú o sina dị, ọ bụ nke a mere m ji bịaruo n’oge awa a.” (Jọn 12:27) Ọ chọkwara ka ihe niile bụ́ uche Chineke mezuo, nke otu n’ime ya bụ ka o jiri ndụ ya chụọ àjà.