Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 124

A Raara Kraịst Nye Ma Jide Ya

A Raara Kraịst Nye Ma Jide Ya

MATIU 26:47-56 MAK 14:43-52 LUK 22:47-53 JỌN 18:2-12

  • JUDAS ARARA JIZỌS NYE N’OGIGE GETSEMENI

  • PITA EBEPỤ NTỊ OTU NWOKE

  • E JIDERE JIZỌS

Ọ gafeela etiti abalị. Ndị isi nchụàjà ekwetala ịkwụ Judas mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka ọ rara Jizọs nye. N’ihi ya, Judas kpọ ìgwè ndị isi nchụàjà na ndị Farisii bịa ka ha jide Jizọs. Ndị ọzọ Judas kpọ bịa bụ ụfọdụ ndị agha Rom ji ngwá ọgụ, na ọchịagha ha.

O nwere ike ịbụ ozugbo Jizọs mechara ka Judas pụọ n’oge ha na-eri nri Ememme Ngabiga, ka Judas gakwuuru ndị isi nchụàjà. (Jọn 13:27) Ndị isi nchụàjà ahụ kpọkọtara ma ndị agha ha ma ndị ọrụ nche ha gaa ijide Jizọs. Ọ ga-abụ na ebe mbụ Judas kpọ ha gaa bụ n’ọnụ ụlọ dị n’elu, bụ́ ebe Jizọs na ndịozi ya nọ mee Ememme Ngabiga. Ma ugbu a, Judas na ndị ha na ya so agafeela Ndagwurugwu Kidrọn ma tinye isi n’ụzọ e si aga ogige Getsemeni. Ha ji ma ngwá ọgụ ma oriọna ma ọwa bịa. Ha kpebisiri ike ijide Jizọs.

Obi siri Judas ike na ya ma ebe ha ga-achọta Jizọs mgbe o du ìgwè mmadụ ahụ na-aga n’Ugwu Oliv. N’izu gara aga tupu mgbe ahụ, Jizọs na ndịozi ya na-esi Betani aga Jeruselem, sikwa Jeruselem lọta. N’oge a niile, ha na-akwụsịkarị n’ogige Getsemeni. Ma ugbu a, chi ejiela, ọchịchịrị gbakwara n’okpuru osisi oliv ndị dị ebe ahụ. O nwere ike ịbụ na Jizọs nọ n’okpuru osisi oliv ndị ahụ. N’ihi ya, olee otú ndị agha ahụ ga-esi amata Jizọs, ebe o nwere ike ịbụ na ha ahụtụbeghị ya? Ka ha nwee ike ịmata ya, ha na Judas kwekọrịtara na ọ ga-enye ha ihe àmà ha ga-eji mata onye bụ́ Jizọs. Ọ gwara ha, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya; jidenụ ya, leziekwanụ anya kpụrụ ya gawa.”—Mak 14:44.

Mgbe Judas kpọ ìgwè mmadụ ahụ na-abanye n’ogige Getsemeni, ọ hụrụ Jizọs na ndịozi ya. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ gakwuuru Jizọs ma kelee ya, sị: “Ndeewo, Rabaị!” Judas jizi nwayọọ susuo ya ọnụ. Jizọs jụrụ ya, sị: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?” (Matiu 26:49, 50) Jizọs ji aka ya zaa ajụjụ a ọ jụrụ ya. Ọ sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ na-arara Nwa nke mmadụ nye?” (Luk 22:48) Mgbe Jizọs gwachara Judas ihe a, ọ hapụrụ Judas gwawazie ndị ọzọ okwu.

Jizọs gakwuuru ndị ahụ ji oriọna na ọwa ma jụọ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha zara ya, sị: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.” Jizọs katara obi, sị ha: “Ọ bụ m.” (Jọn 18:4, 5) Ìgwè mmadụ ahụ atụghị anya na Jizọs ga-akatali ụdị obi ahụ, n’ihi ya, ha lara azụ ma daa n’ala.

Jizọs ejighị ohere ahụ gbaa ọsọ, kama, ọ jụrụ ha ọzọ onye ha na-achọ. Mgbe ha kwuru ọzọ na ọ bụ “Jizọs onye Nazaret,” Jizọs gwara ha, sị: “Agwara m unu na ọ bụ m. Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” N’agbanyeghị na Jizọs nọ ná nsogbu mgbe ahụ, o chetara ihe o kwuburu nke bụ na ọ gaghị atụfu onye ọ bụla n’ime ndịozi ya. (Jọn 6:39; 17:12) Jizọs chebere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, enweghịkwa otu n’ime ha funahụrụ ya “ma e wezụga nwa mbibi ahụ,” ya bụ, Judas. (Jọn 18:7-9) N’ihi ya, Jizọs kwuru ka a hapụ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi.

Mgbe ndị agha ahụ biliri gawa n’ebe Jizọs nọ, ndịozi ya ghọtara ihe a na-achọ ime ya. N’ihi ya, ha jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị gbuo ha mma agha?” (Luk 22:49) Tupu Jizọs azaa ha ya, Pita amịrịla otu n’ime mma agha abụọ ha ji gbuo ya Malkọs, bụ́ ohu nnukwu onye nchụàjà, ma bepụ ya ntị aka nri.

Jizọs bitụrụ ntị Malkọs aka, gwọọ ya. Mgbe ọ gwọchara ya, ọ kụziiri ndịozi ya ihe dị ezigbo mkpa. O nyere Pita iwu, sị: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” Jizọs esighị ọnwụ ka a ghara ijide ya n’ihi na o kwuru, sị: “Olee otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee?” (Matiu 26:52, 54) O kwukwara, sị: “Iko nke Nna m nyere m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ijisi ike ṅụọ ya?” (Jọn 18:11) Jizọs chọrọ ka uche Chineke mezuo n’ebe ọ nọ, ọ bụrụgodị na ọ ga-anwụ.

Jizọs jụrụ ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m dị ka ùnu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe, ma unu ejideghị m. Ma ihe a dum mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”—Matiu 26:55, 56.

Ndị agha ahụ, ọchịagha ha, na ndị ọrụ nche ndị Juu jidere Jizọs kee ya agbụ. Mgbe ndịozi Jizọs hụrụ ihe a, ha gbara ọsọ. Ma, “otu nwa okorobịa” so ìgwè mmadụ ahụ na-aga ka o nwee ike iso Jizọs. Ọ ga-abụ na nwa okorobịa ahụ bụ Mak onye na-eso ụzọ Jizọs. (Mak 14:51) Ìgwè mmadụ ahụ matara onye ọ bụ ma chọọ ijide ya. N’ihi ya, ọ hapụụrụ ha uwe linin ya, gbara ahụ́ ọtọ gbalaga.