Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?
Gịnị ka i chere?
-
Ee. Ha ga-adị ndụ ọzọ.
-
Ee e. Ha agaghị adị.
-
Ha nwere ike ịdị ndụ ọzọ.
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
‘Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’—Ọrụ Ndịozi 24:15.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Nkwa a Chineke kwere anyị ga-akasi gị obi ma onye nke gị nwụọ.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.
Ọ ga-eme ka ị ghara ịna-atụ ọnwụ ụjọ.—Ndị Hibru 2:15.
Ị ga-enwekwa olileanya na ị ga-ahụ ndị gị nwụrụ anwụ ọzọ.—Jọn 5:28, 29.
Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Ee. Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:
-
Ọ bụ Chineke kere mmadụ. Baịbụl kwuru na Jehova Chineke bụ Onye “na-enye ndụ.” (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ Ndịozi 17:24, 25) Ebe ọ bụ Chineke kere ihe niile, ọ ga-emeli ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.
-
N’oge ochie, Chineke kpọlitere ndị ụfọdụ. Baịbụl kwuru banyere mmadụ asatọ a kpọlitere n’ọnwụ n’oge ochie. Ndị ahụ a kpọlitere bụ ma ndị agadi ma ụmụaka ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Ụfọdụ bụ n’ụbọchị ha nwụrụ ka a kpọlitere ha, ma e nwere onye nke nọrọ abalị anọ n’ili tupu a kpọlite ya.—Jọn 11:39-44.
-
Chineke chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ọzọ. Jehova kpọrọ ọnwụ asị. Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ onye iro. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ọ na-agụsi Chineke agụụ ike ịkwụsị ọnwụ. Ọ ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa a.—Job 14:14, 15.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Gịnị mere anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?
Ị gụọ JENESIS 3:17-19 na NDỊ ROM 5:12, ị ga-amata azịza ajụjụ a.