Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?
Ì chere na ọ bụ . . .
-
akwụkwọ mmadụ nkịtị dere?
-
akwụkwọ akụkọ ifo?
-
akwụkwọ si n’aka Chineke?
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
“Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 Timoti 3:16.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Ị ga-amata azịza ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ.—Ilu 2:1-5.
Ọ ga-enyere gị aka ibi ezigbo ndụ.—Abụ Ọma 119:105.
Ọ ga-eme ka obi sie gị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.—Ndị Rom 15:4.
Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Ee. Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:
-
Baịbụl anaghị emegide onwe ya. O were ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii iji dee Baịbụl. Ihe dị ka mmadụ iri anọ dere ya. Ụfọdụ n’ime ha anọghị ndụ mgbe ibe ha dere nke ha. Ma, ha niile doro aha Chineke nsọ, gosikwa na ọ bụ yanwa ruru eru ịchị ụmụ mmadụ.
-
Baịbụl na-akọ otú ihe si mee. Ọ na-abụ ndị mmadụ kọwa akụkọ ndụ ha, ha anaghị ekwe akọta ihe ndị ha mejọrọ. Ma, ndị Chineke ji dee Baịbụl kwuru hoo haa ihe ndị ha mejọrọ, kwuokwa ihe ndị obodo ha mejọrọ.—2 Ihe E Mere 36:15, 16; Abụ Ọma 51:1-4.
-
Ihe Baịbụl kwuru na-emezu. Baịbụl kwuru na a ga-ebibi obodo Babịlọn. O kwukwara otú a ga-esi bibie ya na aha onye ga-ebibi ya. (Aịzaya 13:17-22; 45:1-3) Mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gachara, ihe ndị ahụ o kwuru mezuru.
O nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru, ha emechaa mee otú ahụ o si kwuo ha. Ihe ndị a na-egosi na Baịbụl bụ Okwu Chineke.—2 Pita 1:21.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Olee otú Okwu Chineke ga-esi enyere gị aka ka ị na-ebi ezigbo ndụ?
Ị gụọ AỊZAYA 48:17, 18 na 2 TIMOTI 3:16, 17, ị ga-amata azịza ya.