Ndị Eze nke Mbụ 21:1-29

  • Ehab chọrọ ịnara Nebọt ubi vaịn ya (1-4)

  • Jezibel kpara nkata, e gbuo Nebọt (5-16)

  • Ịlaịja kwuru ihe ga-eme Ehab (17-26)

  • Ehab wedara onwe ya ala (27-29)

21  Mgbe ihe ndị a mechara, e nwere ihe merenụ gbasara otu ubi vaịn bụ́ nke Nebọt onye Jezril. Ubi vaịn a dị na Jezril,+ n’akụkụ obí Ehab eze Sameria.  Ehab gwara Nebọt, sị: “Nye m ubi vaịn gị ka m jiri ya mere ubi akwụkwọ nri, n’ihi na ọ dị nso n’ụlọ m. M ga-enye gị ubi vaịn ka ya mma ka i jiri dochie ya. Ma ọ bụkwanụ, ị chọọ, mụ enye gị ego ole o ruru.”  Ma Nebọt sịrị Ehab: “Tụfịakwa! Agaghị m enye gị ihe m ketara n’aka nna nna m hà, maka na Jehova sị anyị anwakwala ya anwa.”+  Ehab baziri n’ụlọ ya. Ma obi adịghị ya mma, ihu ya gbarụkwara agbarụ n’ihi ihe Nebọt onye Jezril gwara ya. Ọ gwara ya, sị: “Agaghị m enye gị ihe m ketara n’aka nna nna m hà.” Ehab wee dinara n’àkwà* ya, chee ihu n’ahụ́ ụlọ, jụkwa iri nri.  Jezibel nwunye ya+ bịakwutekwara ya ma jụọ ya, sị: “Gịnị mere obi ji na-ajọ gị njọ nke na i kweghị eri nri?”  Ya asị ya: “M gwara Nebọt onye Jezril, sị, ‘Resị m ubi vaịn gị. Ma ọ bụkwanụ, ị chọọ, mụ enye gị ubi vaịn ọzọ ka i jiri dochie ya.’ Ma ọ sịrị, ‘Agaghị m enye gị ubi vaịn m.’”  Jezibel nwunye ya asị ya: “Ọ́ bụghị gịnwa na-achị Izrel? Bilie rie nri, ka obi bụrụkwa gị sọ aṅụrị. M ga-enye gị ubi vaịn Nebọt onye Jezril.”+  O deziri akwụkwọ ozi n’aha Ehab, jirikwa ihe eze ji aka ihe akara kaa ha akara,+ ma zigara ha ndị okenye+ na ndị a ma ama bi n’obodo Nebọt hà.  Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ: “Wepụtanụ otu ụbọchị unu ga-ebu ọnụ, kọsaakwanụ ya, gwakwanụ Nebọt ka ọ nọrọ n’isi oche. 10  Gwakwanụ ụmụ nwoke abụọ na-abaghị uru ka ha nọrọ n’ihu ya bo ya ebubo+ na ọ bụrụ Chineke na eze ọnụ.+ Kpọpụtazienụ ya n’azụ obodo ma jiri nkume tụgbuo ya.”+ 11  Ndị okenye na ndị a ma ama n’obodo ya mere nnọọ ihe Jezibel dere n’akwụkwọ ozi ahụ o ziteere ha. 12  Ha kpọsara ụbọchị a ga-ebu ọnụ, gwakwa Nebọt ka ọ nọrọ n’isi oche n’ụbọchị ahụ. 13  N’ụbọchị ahụ, ụmụ nwoke abụọ ndị na-abaghị uru batara ma nọrọ ọdụ n’ihu ya. Ha malitekwara ibo ya ebubo n’ihu ndị nọ ebe ahụ. Ha sịrị: “Nebọt bụrụ Chineke na eze ọnụ!”+ Mgbe ha kwuchara ihe a, a kpọpụtara Nebọt n’azụ obodo ahụ ma jiri nkume tụgbuo ya.+ 14  Ha zigakwaara Jezibel ozi, sị: “A tụgbuola Nebọt na nkume.”+ 15  Ozugbo Jezibel nụrụ na a tụgbuola Nebọt na nkume, ọ gwara Ehab, sị: “Gaa weghara ubi vaịn ahụ Nebọt onye Jezril+ jụrụ iresị gị, n’ihi na ọ nwụọla, ọ dịghịzi ndụ.” 16  Ozugbo Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, ọ gawara ka o weghara ubi vaịn Nebọt onye Jezril. 17  Ma Jehova gwara Ịlaịja+ onye Tishbe, sị: 18  “Bilie, gaa Sameria ka ị hụ Ehab eze Izrel.+ Ọ nọ n’ubi vaịn Nebọt. Ọ gara ebe ahụ ka o weghara ya. 19  Gwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ kwa i gbuola mmadụ,+ wegharakwa ala ya?”’+ Gwakwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “N’ebe ahụ nkịta rachara ọbara Nebọt ka nkịta ga-aracha ọbara nke gị.”’”+ 20  Ehab wee sị Ịlaịja: “Onye iro m,+ ị̀ chọrọkwala m bịa?” Ya asị ya: “Achọrọla m gị bịa. Chineke kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i siri ọnwụ* na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova,+ 21  m ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. M ga-ebibi gị. M ga-egbu ma nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ gị+ ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel.+ 22  M ga-emekwa ka ezinụlọ gị dịrị ka ezinụlọ Jeroboam+ nwa Nibat na ezinụlọ Beasha+ nwa Ahaịja, n’ihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka ndị Izrel mehie.’ 23  Jehova kwukwara gbasara Jezibel, sị: ‘Nkịta ga-eri Jezibel n’ala dị na Jezril.+ 24  Onye ezinụlọ Ehab ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya. Onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya.+ 25  N’eziokwu, e nwetụbeghị onye dị ka Ehab.+ Jezibel nwunye ya duhiere ya, ya esie ọnwụ* na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 26  Ọ kpara arụ na-enweghị atụ, gaa fewe arụsị dị iche iche na-asọ oyi,* otú ndị Amọraịt niile mere, ndị Jehova chụpụrụ n’ala ha, nye ya ndị Izrel.’”+ 27  Ozugbo Ehab nụrụ ihe ndị a, ọ dọwara uwe ya, yiri ákwà iru uju, na-ebukwa ọnụ. Ọ na-eyi ákwà iru uju ahụ alakpu, ọ na-ejegharịkwa ka onye ike ụwa gwụrụ. 28  Jehova gwaziri Ịlaịja onye Tishbe, sị: 29  “Ọ̀ kwa ị hụrụ otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m?+ Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eme ka ọdachi ahụ dakwasị ezinụlọ ya n’oge ọ nọ ndụ. M ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ezinụlọ ya ma nwa ya chịwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “i reela onwe gị.”
Na Hibru, “ya eree onwe ya.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.