Abụ Solomọn 3:1-11

  • Nwa agbọghọ Shulem (1-5)

    • ‘N’abalị, m nọ na-eche banyere onye m hụrụ n’anya’ (1)

  • Ụmụ nwaanyị Zayọn (6-11)

    • A kọrọ otú e si ebugharị Solomọn

3  “M dina n’elu àkwà* m n’abalịNa-eche banyere onye m hụrụ n’anya.+ M tụrụ anya ya, ma ahụghị m ya.+   M ga-ebili gagharịa n’obodo. M ga-achọ onye m hụrụ n’anyaN’okporo ámá nakwa n’ámá obodo. M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.   Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.+ M jụrụ ha, sị, ‘Ùnu hụrụ onye m hụrụ n’anya?’   Ozugbo m gafere ha,M hụrụ onye m hụrụ n’anya. M jidere ya aka. Ekweghị m ahapụ yaRuo mgbe m kpọbatara ya n’ụlọ nne m,+N’ime ime ụlọ nwaanyị mụrụ m.   Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele na nne mgbada bi n’ọhịaNa-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyiNa unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+   “Gịnị bụ ihe a si n’ala ịkpa na-abịa nke yiri anwụrụ ọkụ,Nke e ji mea na frankinsensNa ihe dị iche iche na-esi ísì ọma onye ahịa na-ere mee ka ọ na-esi ísì ọma?”+   “Lee, ọ bụ ihe e ji ebu Solomọn. Ndị dike iri isii n’ime ndị dike IzrelGbara ya gburugburu.+   Ha niile ji mma agha. Ha niile bụ ndị agha a zụrụ nke ọma. Onye ọ bụla kere mma agha ya n’úkwùKa ha jiri ya chebe ya, ka ihe ọ bụla ghara imenye ya ụjọ n’abalị.”   “Ọ bụ ihe e ji ebu* Eze Solomọn. O ji osisi si Lebanọn rụọrọ ya onwe ya.+ 10  O ji ọlaọcha rụọ ogidi* ya dị iche iche,Jirikwa ọlaedo rụọ ebe ọ na-adabere. E ji ajị anụ na-acha pọpụl rụọ ebe a na-anọ ọdụ na ya. Ụmụ nwaanyị Jeruselem mere ka ime yaMaa ezigbote mma.” 11  “Ụmụ nwaanyị Zayọn, gaanụKirie Eze SolomọnKa o kpu okpu nne ya+ kpaara yaN’ụbọchị ọ lụrụ nwaanyị,N’ụbọchị obi bụ ya sọ aṅụrị.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ihe a yiri oche ma ọ bụ ihe e ji edina ala e kpuchiri elu ya ekpuchi. E ji ya ebu ndị ukwu.
Ọ ga-abụ na ogidi ndị a bụ idé ndị ji elu ya.