Abụ Solomọn 7:1-13

  • Eze (1-9a)

    • “Nwa agbọghọ m hụrụ n’anya, ị mara ezigbo mma” (6)

  • Nwa agbọghọ Shulem (9b-13)

    • “Abụ m nke onye m hụrụ n’anya, ọ bụkwa m na-agụ ya agụụ” (10)

7  “Gị nwa agbọghọ a na-akwanyere ùgwù,Ụkwụ gị mara ezigbo mma n’akpụkpọ ụkwụ i yi. Úkwù gị mara mma ka ihe e ji achọ mmaNke onye na-akpụ ihe nke ọma kpụrụ.   Otubo gị dị ka efere dị okirikiri. Ka mmanya a gwara agwa ghara ịkọ na ya mgbe ọ bụla. Afọ gị dị ka ikpo ọka witNke e ji okooko lili gbaa gburugburu.   Ara gị abụọ yiri ụmụ ele abụọ,Bụ́ ụmụ ejima nne ele mụrụ.+   Olu gị+ yiri ụlọ elu e ji ọdụ́ rụọ.+ Anya gị+ dị ka ọdọ mmiri ndị dị na Heshbọn,+N’akụkụ ọnụ ụzọ ámá Bat-rabim. Imi gị dị ka ụlọ elu Lebanọn,Nke chere Damaskọs ihu.   Isi gị mara mma ka Ugwu Kamel,+Ntutu isi gị*+ dịkwa ka ajị anụ na-acha pọpụl.+ Otú ogologo ntutu isi gị si awụgharị masịrị eze.   Nwa agbọghọ m hụrụ n’anya, ị mara ezigbo mma,Ị mara mma karịa ihe niile na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.   Ị dị ka nkwụ,*Ara gị yikwara ụyọkọ mkpụrụ nkwụ.+   M sịrị, ‘M ga-arịgo n’elu nkwụKa m ghọrọ ụyọkọ mkpụrụ ya.’ Ka ara gị dịrị ka ụyọkọ mkpụrụ vaịn. Ka ume ị na-ekupụ na-esi ísì ọma ka apụl.   Ka ọnụ* gị dịrịkwa ka ezigbo mmanya.” “Ka o jiri nwayọọ na-agbada n’akpịrị onye m hụrụ n’anya,Jirikwa nke nta nke nta na-abanye n’ọnụ ndị ụra na-eburu.” 10  Abụ m nke onye m hụrụ n’anya,+Ọ bụkwa m na-agụ ya agụụ. 11  Onye m hụrụ n’anya, bịa. Ka anyị gaa n’ọhịa. Ka anyị nọrọ n’ebe okooko osisi hena dị.+ 12  Ka anyị bilie n’isi ụtụtụ gaa n’ubi vaịnKa anyị hụ ma mkpụrụ vaịn ò puola,Ma okooko ya ọ̀ gbawaala,+Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.+ M ga-anọ ebe ahụ gosi gị na m hụrụ gị n’anya.+ 13  Ahịhịa mandrek*+ na-esipụta ísì ọma ya. Ụdị ọmarịcha mkpụrụ osisi ọ bụla dị n’ọnụ ụzọ anyị.+ Onye m hụrụ n’anya, m doweere gịMa ndị ochie ma ndị ọhụrụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Isi gị.”
Nkwụ a bụ ụdị nkwụ a na-ahụkarị na Palestaịn.
Na Hibru, “okpo ọnụ.”
Ụmụ nwaanyị na-eri mkpụrụ ahịhịa a maka na ha chere na ọ ga-eme ka ha dị ime.