Abụ Solomọn 8:1-14
-
Nwa agbọghọ Shulem (1-4)
-
“A sị nnọọ na ị bụ nwanne m nwoke” (1)
-
-
Ụmụnne nwoke nwa agbọghọ Shulem (5a)
-
‘Ònye bụ onye a konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?’
-
-
Nwa agbọghọ Shulem (5b-7)
-
“Ịhụnanya siri ike ka ọnwụ” (6)
-
-
Ụmụnne nwoke nwa agbọghọ Shulem (8, 9)
-
“Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, . . . ma ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ, . . .” (9)
-
-
Nwa agbọghọ Shulem (10-12)
-
“Abụ m mgbidi” (10)
-
-
Onye na-azụ atụrụ (13)
-
‘Mee ka m nụ olu gị’
-
-
Nwa agbọghọ Shulem (14)
-
“Gbara ọsọ bịa ka ele”
-
8 “A sị nnọọ na ị bụ nwanne m nwoke,Onye ṅụrụ ara nne m,M ga-esusu gị ọnụ ma m hụ gị n’èzí,+E nweghịkwa onye ga-ele m anya ọjọọ.
2 M ga-eduru gị.
M ga-akpọbata gị n’ụlọ nne m,+Onye kụziiri m ihe.
M ga-enye gị mmanya na-esi ísì ọma ka ị ṅụọNakwa mmiri pomigranet a pịpụtara ọhụrụ.
3 M ga-atụkwasị isi m n’aka ekpe ya,Ọ ga-ekonyekwa m aka nri ya.+
4 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, m na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyiNa unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+
5 “Ònye bụ onye a nke si n’ala ịkpa na-abịa,Nke konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?”
“M kpọtere gị n’okpuru osisi apụl.
Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime gị mere nne gị.
Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime mere nwaanyị mụrụ gị.
6 “Kanye m ka akara n’obi gị,Kanye m ka akara n’ogwe aka gị,N’ihi na ịhụnanya siri ike ka ọnwụ,+Ịhụnanya nke siri ezigbo ike na-emekwa ka mmadụ ghara ịhapụ onye ọ hụrụ n’anya otú ili* na-anaghị ahapụ onye o ji.
Ụdị ihụnanya a dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa.*+
7 Mmiri na-ekwo ekwo enweghị ike imenyụ ịhụnanya,+Osimiri enweghịkwa ike ibupụ ya.+
Ọ bụrụ na mmadụ enye akụ̀ niile dị n’ụlọ ya ka e wee hụ ya n’anya,A ga-eleda ya* nnọọ anya.”
8 “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị.+
Ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyịN’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?”
9 “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,Anyị ga-eji ọlaọcha chọọ elu ya mma.
Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ,Anyị ga-eji ibé osisi sida tụbichie ya.”
10 “Abụ m mgbidi,Ara m dịkwa ka ụlọ elu.
N’ihi ya, n’anya ya,Abụ m onye obi ruru ala.
11 Solomọn nwere otu ubi vaịn+ na Bel-hemọn.
O nyefere ubi vaịn ahụ n’aka ndị ga na-elekọta ya.
Onye nke ọ bụla na-eweta otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha maka mkpụrụ ubi ahụ na-amị.
12 Otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ nke gị, Solomọn,Narị abụọ abụrụ nke ndị na-elekọta mkpụrụ ubi vain ahụ na-amị.
Ma ubi vaịn nke m bụ naanị nke m.”
13 “Gị onye bi n’ubi,+Ndị enyi gị na-eche ka ha nụ olu gị.
Mee ka m nụ ya.”+
14 “Onye m hụrụ n’anya, mee ngwa ngwa.
Gbara ọsọ bịa ka ele+Ma ọ bụ ka oké mgbadaNke nọ n’ugwu ebe ahịhịa na-esi ísì ọma dị.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ O nwere ike ịbụ akụ̀ ya ka a na-ekwu.