Diuterọnọmi 28:1-68

  • Ihe ọma ndị ga-abịara ndị rubere isi (1-14)

  • Ihe ọjọọ ndị ga-eme ndị nupụrụ isi (15-68)

28  “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile m na-enye unu taa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile dị n’ụwa.+  A ga-agọzi unu nke ukwuu, ihe ọma niile a ga-abịakwara unu+ maka na unu na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu:  “A ga-agọzi unu n’obodo, gọziekwa unu n’ubi.+  “A ga-agọzi ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta nakwa ụmụ anụ ụlọ unu, ya bụ, ehi unu na atụrụ unu.+  “A ga-agọzi nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka.*+  “A ga-agọzi unu mgbe unu na-abata abata, gọziekwa unu mgbe unu na-apụ apụ.  “Jehova ga-eme ka unu merie ndị iro unu na-alụso unu agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ bịa ịlụso unu agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu unu.+  Jehova ga-agọzi ebe unu na-akwasa ihe,+ gọziekwa ihe ọ bụla unu na-eme. Ọ ga-agọzi unu n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.  Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị ya dị nsọ,+ otú ọ ṅụụrụ unu n’iyi,+ maka na unu na-edebe ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu ma na-eme uche ya. 10  Ndị niile bi n’ụwa ga-ahụ na unu na-aza aha Jehova,+ ha ga-atụkwa unu egwu.+ 11  “Jehova ga-eme ka unu nwee ọtụtụ ụmụ na ọtụtụ anụ ụlọ, meekwa ka ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu+ na-emepụta ihe n’ụba.+ 12  Jehova ga-emepere unu eluigwe ya otú mmadụ si emepe ebe ọ kwasara ezigbo ihe ma mee ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya,+ gọziekwa ihe niile unu na-eme. Unu ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma e nweghị ihe ga-eme ka unu gbaziri ihe.+ 13  Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị isi, ọ bụghị ndị ọdụ. Unu ga-anọ n’elu,+ ọ bụghị n’ala, ma ọ bụrụ na unu ana-erube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu, bụ́ ndị m na-enye unu taa ka unu na-edebe ma na-eme. 14  Unu anwala anwa hapụ ihe niile m na-enye unu n’iwu taa gaa mewe ihe ọzọ,+ ka unu wee soro chi ọzọ dị iche iche ma fewe ha ofufe.+ 15  “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+ 16  “A ga-abụ unu ọnụ n’obodo, bụọkwa unu ọnụ n’ubi.+ 17  “A ga-abụ nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka ọnụ.+ 18  “A ga-abụ ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta ọnụ, bụọkwa ụmụ ehi unu na atụrụ unu ọnụ.+ 19  “A ga-abụ unu ọnụ mgbe unu na-abata abata, bụọkwa unu ọnụ mgbe unu na-apụ apụ. 20  “Jehova ga-abụ unu ọnụ, mee ka unu nọrọ n’ọgba aghara, taakwa unu ahụhụ n’ihe ọ bụla unu na-eme ruo mgbe e bibiri unu, unu ewee laa n’iyi n’egbughị oge, n’ihi omume ọjọọ unu nakwa n’ihi na unu hapụrụ ya.*+ 21  Jehova ga-eme ka unu rịawa ọrịa na-anaghị ala ala ruo mgbe o bibichara unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.+ 22  Jehova ga-eme ka unu rịawa ụkwara nta, oké ahụ́ ọkụ,+ ahụ́ ọzịza, na oké okpomọkụ. Ọ ga-eme ka a lụso unu agha,+ meekwa ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ nakwa ka ha maa ebù.+ Ihe ndị a ga-emegide unu ruo mgbe unu ga-anwụcha. 23  Mbara igwe unu ga-adị ka ọla kọpa,* ala unu ga-adịkwa ka ígwè.*+ 24  Jehova ga-eme ka ntụ na uzuzu si n’eluigwe na-ezo n’ala unu ka mmiri ruo mgbe unu lara n’iyi. 25  Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+ 26  Ozu unu ga-abụrụ nnụnụ niile na-efe n’eluigwe na anụmanụ ndị na-agagharị n’ala ihe oriri, e nweghịkwa onye ga-achụpụ ha.+ 27  “Jehova ga-eme ka etuto toro ndị Ijipt too unu, meekwa ka ọkpụ ikè, ụ́gwọ̀, na ọkọ, bụ́ ndị a na-agaghị agwọ agwọ, mee unu. 28  Jehova ga-eme ka ara gbaa unu, mee ka unu kpuo ìsì,+ meekwa ka uche ghara ịkpakọ unu ọnụ. 29  Unu ga na-asọgharị ìsì n’ehihie otú onye ìsì si asọgharị ìsì n’ọchịchịrị,+ e nweghịkwa ihe unu na-eme ga-agara unu nke ọma. A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-ezu unu ohi, e nweghịkwa onye ga-azọpụta unu.+ 30  Unu ga-ekwe nwaanyị nkwa na unu ga-alụ ya, ma nwoke ọzọ ga-edina ya n’ike. Unu ga-arụ ụlọ, ma unu agaghị ebi na ya.+ Unu ga-akọ ubi vaịn, ma unu agaghị amalite iri mkpụrụ ya.+ 31  A ga-egbu ehi unu n’ihu unu, ma unu agaghị eri anụ ya ọ bụla. A ga-ezuru jakị unu n’ihu unu, ma a gaghị akpọghachiri ya unu. A ga-akpụnye ndị iro unu atụrụ unu, ma e nweghị onye ga-azọpụta unu. 32  Unu ga na-ele anya a kpọrọ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ndị ọzọ.+ Agụụ ịhụ ha ga na-agụ unu mgbe niile, ma e nweghị ihe unu ga-emeli. 33  Ndị unu na-amaghị ga-eri ihe ala unu mepụtara na ihe niile unu rụtara.+ A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-echikwa unu ọnụ n’ala. 34  Ihe unu ga-eji anya unu ahụ ga-agbaka unu isi. 35  “Jehova ga-eme ka etuto na-afụ ụfụ nke a na-anaghị agwọta agwọta too unu n’ikpere nakwa n’ụkwụ, malite n’ọbụ ụkwụ unu ruo n’opu isi unu. 36  Jehova ga-achụga unu na onye unu ga-eme eze ná mba unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ Unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche n’ebe ahụ, chi ndị e ji osisi na nkume mee.+ 37  Ihe ndị ga-eme unu ga-emenye ndị bi n’ebe niile Jehova ga-achụga unu ụjọ. Ha ga-eji unu mere ihe ọchị,* ha agaghịkwa eji unu kpọrọ ihe.+ 38  “Unu ga-agha ọtụtụ mkpụrụ n’ubi, ma ihe unu ga-eweta ga-adị ole na ole,+ n’ihi na igurube ga-erichapụ ha. 39  Unu ga-akọ ubi vaịn, lekọtakwa ya, ma unu agaghị aṅụ mmanya ọ bụla, unu agaghịkwa aghọta ihe ọ bụla,+ n’ihi na ọtị ga-erichapụ ya. 40  Unu ga-enwe osisi oliv n’ala unu niile, ma unu agaghị ete mmanụ ọ bụla n’ahụ́, n’ihi na mkpụrụ oliv unu ga-adapụcha. 41  Unu ga-amụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, ma ha agaghị abụ nke unu, n’ihi na a ga-adọrọ ha n’agha.+ 42  Ụmụ ahụhụ dị iche iche ga-eju n’osisi unu niile nakwa n’ihe ala unu mepụtara. 43  Onye mbịarambịa nke binyeere unu ga na-adị ike karịa unu, ma ike ga na-agwụkwu unu. 44  Ọ ga-agbazinye unu ihe, ma unu agaghị agbazinye ya ihe.+ Ọ ga-abụ onyeisi, ma unu ga-abụ ndị ọdụ.+ 45  “A ga-abụrịrị unu ọnụ,+ ihe ọjọọ niile a ga-emekwa unu ruo mgbe unu lara n’iyi,+ n’ihi na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu, unu edebeghị iwu ya ma soro ntụziaka ndị o nyere unu.+ 46  Unu na ụmụ unu ga na-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Ọnụ ahụ a bụrụ unu ga-abụkwa ihe àmà ga-adịgide adịgide na ihe ịdọ aka ná ntị,+ 47  n’ihi na unu ejighị ọṅụ na obi ụtọ fee Jehova bụ́ Chineke unu* mgbe unu nwejuru ihe niile enweju.+ 48  Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi. 49  “Jehova ga-eme ka mba dị n’ebe dị anya si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa lụso unu agha.+ Ọ ga-alụso unu agha n’ike otú ugo si efekwasị n’ihe ọ chọrọ iburu.+ Ọ ga-abụ mba unu na-agaghị aghọta asụsụ ha,+ 50  mba nke na-emenye mmadụ ụjọ, nke na-agaghị akwanyere agadi ùgwù ma ọ bụ meere onye na-eto eto ebere.+ 51  Ha ga-eri ụmụ anụ ụlọ unu na ihe ala unu mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ unu. Ha agaghị ahapụrụ unu ọka* ọ bụla, mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi ma ọ bụ ụmụ atụrụ ọ bụla ruo mgbe ha bibiri unu.+ 52  Ha ga-anọchibido unu, ghara ikwe ka unu si n’obodo niile dị n’ala unu pụta, ruo mgbe mgbidi ndị dị elu unu rụsiri ike, bụ́ ndị unu tụkwasịrị obi, ga-ada. N’eziokwu, ha ga-anọchibido unu n’obodo niile dị n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+ 53  N’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala, unu ga-eri ụmụ* unu, ya bụ, anụ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ bụ́ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu. 54  “Nwoke nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe kacha emetụ n’ahụ́ n’ime unu, agaghịdị emetere nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ụmụ ya ndị fọrọ afọ ebere. 55  Ọ gaghịkwa enyetụ ha anụ nwa ya nke ọ bụla ọ ga-eri, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ọzọ o nwere n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.+ 56  Nwaanyị nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe na-emetụkwa n’ahụ́, nke na-agaghịdị eche echiche ịzọ ụkwụ ya n’ala maka na ọ na-eme nwayọọ nwayọọ+ agaghị emetere di ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ebere. 57  Ọ gaghịdị enyetụ ha ihe ọ bụla na-esi n’ahụ́ ya apụta mgbe ọ mụchara nwa nakwa anụ ụmụ ndị ọ ga-amụ. Ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa n’ihi otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala. 58  “Ọ bụrụ na unu elezighị anya mee ihe niile e kwuru n’Iwu a, bụ́ ndị e dere n’akwụkwọ a,+ gharakwa ịtụ egwu aha a dị ebube ma dị egwu,+ ya bụ, aha Jehova+ Chineke unu, 59  Jehova ga-ata unu na ụmụ unu ezigbo ahụhụ, nnukwu ahụhụ na-agaghị ebi ebi,+ meekwa ka unu rịawa ajọ ọrịa ndị na-anaghị ala ala. 60  Ọ ga-eme ka unu rịa ọrịa niile ndị Ijipt rịara, bụ́ ọrịa ndị unu na-atụ egwu, ndị na-agaghịkwa ala ala. 61  Jehova ga-emedị ka unu rịa ọrịa ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a, taakwa unu ahụhụ ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a ruo mgbe unu lara n’iyi. 62  N’agbanyeghị na unu adịla ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe,+ unu ga-afọ mmadụ ole na ole+ maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu. 63  “Otú ahụ obi dị Jehova mma ime ka ihe gaziere unu nakwa ka unu mụbaa ka obi ga-adịkwa Jehova mma ibibi unu na ịla unu n’iyi. A ga-ekpochapụkwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara. 64  “Jehova ga-achụsasị unu ná mba niile, malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee, chi ndị unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ 65  Obi agaghị eru unu ala ná mba ndị ahụ,+ unu agaghịkwa ahụ ebe ụkwụ unu ga-ezu ike. Kama, Jehova ga-eme ka obi koro unu n’elu,+ ka ike gwụ anya unu, nakwa ka unu daa mbà n’obi.+ 66  Ihe ndị ga-ata isi unu ga-agba unu gburugburu, ụjọ ga na-atụkwa unu abalị na ehihie. Unu agaghị eji ndụ unu n’aka. 67  N’ụtụtụ, unu ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ mgbede!’ Ná mgbede, unu ga-asịkwa, ‘A sị nnọọ na ọ bụ ụtụtụ!’ n’ihi na unu ga-achị obi unu n’aka nakwa n’ihi ihe anya unu ga-ahụ. 68  Jehova ga-eji ụgbọ mmiri bughachi unu n’Ijipt, bụ́ ebe m gwara unu banyere ya, sị, ‘Unu agaghị ahụ ya ọzọ.’ N’ebe ahụ, unu ga-achọ ka unu resị ndị iro unu onwe unu ka unu bụrụ ohu ha ndị nwoke na ohu ha ndị nwaanyị, ma e nweghị onye ga-azụrụ unu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”
Ya bụ, na ọka ga na-adị na nkata ha, ntụ ọka ga na-adịkwa n’efere ha ji agwọ ntụ ọka.
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”
Na Hibru, “m.”
Ya bụ, mmiri agaghị ezo.
Ya bụ, ala ga-akpọ nkụ.
Na Hibru, “ga-eji unu na-atụ ilu.”
Na Hibru, “jeere ya ozi.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”