Diuterọnọmi 4:1-49

  • A gwara ndị Izrel ka ha rubere Chineke isi (1-14)

    • Unu echefula ihe ndị Chineke mere (9)

  • Jehova chọrọ ka a na-efe naanị ya (15-31)

  • E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ Jehova (32-40)

  • Obodo mgbaba ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (41-43)

  • Iwu Mosis nyere ndị Izrel (44-49)

4  “Ugbu a, ndị Izrel, geenụ ntị ná ntụziaka na iwu ndị m na-akụziri unu ka unu na-edebe, ka unu wee dị ndụ+ banye n’ala Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu ma weghara ya.  Unu etinyela ihe n’ihe m na-enye unu n’iwu, unu ewepụkwala ihe na ya,+ ka unu wee na-eme ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu, nke m na-agwa unu.  “Unu ejirila anya unu hụ ihe Jehova mere n’ihi Bel nke Piọ. Jehova bụ́ Chineke unu bibiri onye ọ bụla n’ime unu nke sooro Bel nke Piọ.+  Ma unu niile ndị na-ahapụghị Jehova bụ́ Chineke unu dịcha ndụ taa.  Lee, m kụzierela unu ntụziaka na iwu dị iche iche,+ otú Jehova bụ́ Chineke m nyere m n’iwu, ka unu wee na-eme ha n’ala ahụ unu ga-ebi na ya.  Lezienụ anya na-eme ha+ n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ga-anụ banyere ntụziaka niile a mata na unu ma ihe+ nakwa na unu na-aghọta ihe.+ Ha ga-asịkwa, ‘N’eziokwu, mba ukwu a bụ mba ndị bi na ya ma ihe, na-aghọtakwa ihe.’+  N’ihi na olee mba ukwu nke nwere chi nọ ya nso otú Jehova bụ́ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe ọ bụla anyị kpọrọ ya?+  Oleekwa mba ukwu nke nwere ezigbo ntụziaka na ihe ndị e kpebiri ka ndị bi na ya na-eme bụ́ ndị yiri Iwu a niile m na-enye unu taa?+  “Lezienụ anya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ka unu ghara ichefu ihe ndị anya unu hụrụ, ka ha gharakwa ịpụ apụ n’obi unu n’oge niile unu dị ndụ. Unu ga-emekwa ka ụmụ unu na ụmụ ụmụ unu mara ha.+ 10  N’ụbọchị unu guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu na Horeb, Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu m+ n’oge niile ha ga-adị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+ 11  “Unu wee bịa nso ma guzo n’ala ala ugwu ahụ. Ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ, anwụrụ ọkụ ya rukwara na mbara igwe. Itiri na oké ọchịchịrị gbara, ígwé ojii gbachikwara.+ 12  Jehova wee si n’ọkụ ahụ gwawa unu okwu.+ Unu nụrụ naanị okwu, ma e nweghị onye unu hụrụ.+ Naanị olu ka unu nụrụ.+ 13  O wee gwa unu banyere ọgbụgba ndụ unu na ya,+ nke o nyere unu iwu ka unu na-edebe, ya bụ, Iwu Iri ahụ.*+ Mgbe e mechara, o dere ha ná mbadamba nkume abụọ.+ 14  N’oge ahụ, Jehova nyere m iwu ka m kụziere unu ntụziaka na iwu dị iche iche, bụ́ ndị unu ga na-edebe n’ala unu ga-abanye iweghara. 15  “N’ihi ya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ebe ọ bụ na e nweghị onye unu hụrụ n’ụbọchị ahụ Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16  ka unu ghara imere onwe unu arụsị a pịrị apị nke yiri ihe ọ bụla, si otú ahụ merụọ onwe unu. Unu emela ihe ọ bụla yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17  ihe yiri anụmanụ ọ bụla dị n’ụwa ma ọ bụ ihe yiri nnụnụ ọ bụla na-efe na mbara igwe,+ 18  ihe yiri ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala ma ọ bụ ihe yiri azụ̀ ọ bụla dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+ 19  Mgbe unu lere anya n’eluigwe hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, ya bụ, ihe niile dị n’eluigwe, unu ekwela ka a rafuo unu, unu ewee kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Jehova bụ́ Chineke unu enyela ha ndị niile nọ n’ụwa* niile. 20  Ma, ọ bụ unu ka Jehova si n’Ijipt, n’ọkụ na-agbaze ígwè, kpọpụta, ka unu bụrụ ndị nke ya,*+ otú unu bụ nke ya taa. 21  “Jehova wesara m iwe n’ihi unu,+ ọ ṅụkwara iyi na agaghị m agafe Osimiri Jọdan ma ọ bụ banye n’ezigbo ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara.+ 22  N’ihi na m ga-anwụ n’ala a. Agaghị m agafe Osimiri Jọdan.+ Ma unu ga-agafe ya weghara ezigbo ala ahụ. 23  Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu gbara.+ Unu emekwarala onwe unu arụsị a pịrị apị, nke yiri ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu iwu banyere ya.+ 24  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ọkụ na-erechapụ ihe,+ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ 25  “Ọ bụrụ na unu amụọ ụmụ, mụtakwa ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume ọjọọ, meekwa ụdị arụsị ọ bụla a pịrị apị+ ma mee ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ka unu kpasuo ya iwe,+ 26  eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na a ga-ebibirịrị unu ngwa ngwa n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu weghara. Unu agaghị ebite aka na ya, kama a ga-ala unu n’iyi kpamkpam.+ 27  Jehova ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ Naanị mmadụ ole na ole n’ime unu ga-afọ+ ná mba ndị Jehova ga-achụga unu. 28  N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche ndị mmadụ ji osisi na nkume mee,+ chi ndị na-enweghị ike ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì. 29  “Ọ bụrụ na unu anọrọ n’ebe ahụ chọọ Jehova bụ́ Chineke unu, unu ga-achọta ya+ ma unu jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile jụọ ase ya.+ 30  Mgbe unu na-ahụsi anya, ihe a niile emechaakwa mee unu, unu ga-alọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu ma gee ntị n’olu ya.+ 31  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere.+ Ọ gaghị ahapụ unu ma ọ bụ bibie unu ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara.+ 32  “Cheenụ echiche banyere oge gara aga tupu oge unu, malite n’ụbọchị Chineke kere mmadụ n’ụwa. Sikwanụ n’otu nsọtụ eluigwe chọwa ruo na nsọtụ ọzọ nke eluigwe. Ụdị nnukwu ihe a ò metụla? È nwere onye nụtụrụla ihe dị ka ya?+ 33  È nwere ndị ọzọ nụtụrụla olu Chineke ka o si n’ọkụ na-ekwu okwu otú unu nụrụ ya ma ka dịrị ndụ?+ 34  Ka è nwetụla mgbe Chineke ji ikpe ya, ihe àmà, ọrụ ebube,+ agha,+ aka ya siri ike,+ ike ya, na ihe ndị na-atụ egwu o mere+ gbalịa ka o si ná mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, otú Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu? 35  E gosila unu ihe ndị a ka unu wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ ya.+ 36  O mere ka unu nụ olu ya mgbe o si n’eluigwe na-agwa unu okwu ka ọ dọọ unu aka ná ntị. O mekwara ka unu hụ oké ọkụ ya n’ụwa, unu sikwa n’ọkụ nụ olu ya.+ 37  “Ebe ọ bụ na ọ hụrụ nna nna unu hà n’anya ma họrọ ụmụ* ha ndị nọchiri ha,+ ọ nọnyeere unu ma jiri ike ya dị ukwuu kpọpụta unu n’Ijipt. 38  Ọ chụpụụrụ unu mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu, ka ọ kpọbata unu n’ala ha ma nye ya unu ka ọ bụrụ nke unu, otú ọ bụ nke unu taa.+ 39  N’ihi ya, maranụ taa, burukwanụ n’obi na Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+ E nweghị Chineke ọzọ.+ 40  Unu ga na-edebe iwu ya na ntụziaka ya ndị m na-agwa unu taa, ka ihe wee gaziere unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, ka unu wee bitee aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.”+ 41  N’oge ahụ, Mosis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ 42  Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị ya asị,+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+ 43  Obodo nke mbụ bụ Biza+ nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị. Ọ bụ maka ụmụ Ruben. Nke abụọ bụ Remọt+ nke dị na Gilied. Ọ bụ maka ụmụ Gad. Nke atọ bụ Golan+ nke dị na Beshan. Ọ bụ maka ụmụ Manase.+ 44  Ihe a bụ Iwu+ Mosis nyere ndị Izrel. 45  Ihe ndị a bụ ihe Mosis chetaara ndị Izrel, na ntụziaka na iwu ndị o nyere ha. Mosis gwara ha ihe ndị a mgbe ha pụtachara n’Ijipt,+ 46  ná mpaghara Osimiri Jọdan, na ndagwurugwu chere Bet-piọ ihu,+ n’ala Eze Saịhọn onye chịrị ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ onye Mosis na ndị Izrel meriri mgbe ha pụtachara n’Ijipt.+ 47  Ha wee weghara ala ya nakwa ala Eze Ọg+ onye chịrị Beshan, ya bụ, ndị eze abụọ chịrị ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, 48  malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo n’Ugwu Sayọn, ya bụ, Hemọn,+ 49  nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ruo n’Oké Osimiri Araba,* n’ala ala mkpọda Pisga.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Okwu Iri.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Ma ọ bụ “ndị o nwe.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.