Joshụa 2:1-24

  • Joshụa ziri ụmụ nwoke abụọ ka ha gaa nyopụta otú Jeriko dị (1-3)

  • Rehab zoro ndị bịara inyopụta otú Jeriko dị (4-7)

  • Ha kwere Rehab nkwa (8-21a)

    • E ji ụdọ na-acha uhie uhie hụwa ụlọ ama (18)

  • Ndị gara nyopụta otú ala Jeriko dị lọghachikwutere Joshụa (21b-24)

2  Joshụa nwa Nọn wee si na Shitim+ zipụ ụmụ nwoke abụọ na nzuzo. Ọ sịrị ha: “Gaanụ nyopụta otú ala ahụ dị, karịchaa Jeriko.” Ha wee gawa. Mgbe ha ruru Jeriko, ha bara n’ụlọ otu nwaanyị akwụna aha ya bụ Rehab+ wee nọrọ ebe ahụ.  A gbaara eze Jeriko àmà, sị: “E nwere ụmụ nwoke Izrel bịara n’abalị a inyopụta otú ala anyị dị.”  Eze Jeriko wee zigara Rehab ozi, sị: “Kpọpụta ụmụ nwoke ahụ bịara ebe a, ndị nọkwa n’ụlọ gị, n’ihi na ha bịara inyopụta otú ala a niile dị.”  Ma nwaanyị ahụ zoro ụmụ nwoke abụọ ahụ ma sị: “N’eziokwu, ụmụ nwoke ahụ bịara na nke m, ma amaghị m ebe ha si bịa.  Ha pụwara mgbe a chọrọ imechi ọnụ ụzọ ámá mgbe chi jiri. Amaghị m ebe ha gawara. Ọ bụrụ na unu achụrụ ha gawa ozugbo, unu ga-achụkwute ha.”  (Ma, o bula ụzọ gwa ha ka ha rịgoro n’uko ụlọ, ha arịgoro zoo ebe e dowere okporo ogho n’ùkwù n’ùkwù.)  Ndị ahụ eze zipụrụ chụụrụ ha gawa n’ụzọ gara ebe a na-eji ụkwụ agafe Osimiri Jọdan.+ E mechikwara ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ozugbo ha chụụrụ ha pụwa.  Tupu ụmụ nwoke abụọ ahụ ehie ụra, Rehab bịakwutere ha n’uko ụlọ,  sị ha: “Ama m na Jehova ga-enye unu ala a.+ Ụjọ unu ejidela anyị,+ ndị niile bi n’ala a chịzi obi n’aka n’ihi unu.+ 10  N’ihi na anyị nụrụ otú Jehova si mee ka Oké Osimiri Uhie taa, unu esi na ya gafee mgbe unu si n’Ijipt na-apụta.+ Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn+ na Ọg,+ bụ́ ndị eze abụọ na-achị ndị Amọraịt, ndị unu lara n’iyi n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. 11  Mgbe anyị nụrụ ya, ụjọ tụwara anyị. O nweghịkwa onye n’ime anyị obi kara ịlụso unu ọgụ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa.+ 12  Ugbu a, bikonụ, jirinụ aha Jehova ṅụọrọ m iyi na unu ga-egosi na unu hụrụ ezinụlọ nna m n’anya* ebe ọ bụ na mụnwa gosiri na m hụrụ unu n’anya. Unu ga-emekwa ihe ga-eme ka obi sie m ike na unu ga-eme ihe unu kwuru. 13  Unu ga-ahapụ nne m na nna m ndụ, hapụkwa ụmụnne m ndị nwoke na ụmụnne m ndị nwaanyị nakwa ndị nke ha niile. Unu agaghịkwa egbu anyị.”*+ 14  Ụmụ nwoke abụọ ahụ asị ya: “Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe a, anyị* ga-anwụ kama ununwa ga-anwụ. Ọ bụrụ na unu agwaghị onye ọ bụla ihe mere anyị ji bịa, anyị ga-egosi na anyị hụrụ unu n’anya* mgbe Jehova ga-enye anyị ala a, anyị ga-emekwa ihe anyị kwuru.” 15  Mgbe ha kwuchara, o wetara ụdọ, ha ejiri ya si na windo rịtuo n’ala, n’ihi na ụlọ ya dị ná mgbidi obodo ahụ. N’eziokwu, o bi n’elu mgbidi.+ 16  Ọ sịziri ha: “Gaanụ ebe bụ́ ugwu ugwu zoo ụbọchị atọ, ka ndị na-achụ unu ghara inweta unu. Ọ bụrụ na ndị na-achụ unu alọghachite, unu nweziri ike lawa.” 17  Ụmụ nwoke abụọ ahụ asị ya: “Anyị ga-eme ihe a anyị ṅụụrụ gị n’iyi+ naanị 18  ma ọ bụrụ na anyị abata n’ala a hụ na i kegidere ụdọ a na-acha uhie uhie* na windo anyị si na ya rịtuo. Kpọkọtakwa nne gị na nna gị na ụmụnne gị na ndị ezinụlọ nna gị niile n’ụlọ a ị nọ.+ 19  Ọ bụrụ na onye ọ bụla esi n’ụlọ gị pụọ èzí, ọbara ya ga-adị ya n’isi, ikpe agaghịkwa ama anyị. Ma, e nwee ihe mere* onye ọ bụla gị na ya nọ n’ime ụlọ, ọbara ya ga-adị anyị n’isi. 20  Ọ bụrụ na ị gwa onye ọ bụla ihe mere anyị ji bịa,+ ihe ọ bụla mere gị dị gị n’isi n’agbanyeghị iyi a anyị ṅụụrụ gị.” 21  Ya asị ha: “Ka ọ dị otú unu kwuru.” O wee sị ha lawa, ha alawa. E mechaa, ya ekegide ụdọ ahụ na-acha uhie uhie na windo ya. 22  Mgbe ha lawara, ha rutere ebe bụ́ ugwu ugwu ma nọrọ ebe ahụ ụbọchị atọ, ruo mgbe ndị na-achụ ha laghachiri. Ndị ahụ na-achụ ha nọ na-achọgharị ha n’okporo ụzọ niile, ma ha ahụghị ha. 23  Ụmụ nwoke abụọ ahụ wee si ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu gbadata, gafee osimiri, ma bịakwute Joshụa nwa Nọn. Ha wee kọọrọ ya ihe niile mere ha. 24  Ha gwakwara Joshụa, sị: “Jehova enyefeela ala ahụ niile n’aka anyị.+ N’eziokwu, ndị niile bi n’ala ahụ chịzi obi n’aka n’ihi anyị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ga-egosi ezinụlọ nna m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “ga-egosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “ọ bụrụ na aka akpa.”