Ndị Ikpe 2:1-23

  • Mmụọ ozi Jehova dọrọ ndị Izrel aka ná ntị (1-5)

  • Ọnwụ Joshụa (6-10)

  • Jehova nyere ndị Izrel ndị ikpe ga-azọpụta ha (11-23)

2  Mmụọ ozi Jehova+ wee si na Gilgal+ gbagoo Bokim wee sị: “M kpọpụtara unu n’Ijipt ma kpọbata unu n’ala m ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na m ga-enye ha.+ M sịkwara, ‘Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu.+  Unu na ndị bi n’ala a agbala ndụ.+ Kwatuonụ ebe ịchụàjà ha.’+ Ma unu egeghị ntị n’olu m.+ Gịnị mere unu ji mee ihe a?  Ọ bụ ya mere m ji kwuokwa, sị, ‘Agaghị m achụpụ ha n’ebe unu nọ.+ Ha ga-abụrụ unu ọnyà,+ ha ga-aratakwa unu ka unu fewe chi ha.’”+  Mgbe mmụọ ozi Jehova gwara ndị Izrel niile ihe ndị a, ha malitere ibesi ákwá ike.  Ha wee kpọọ ebe ahụ Bokim,* chụọkwara Jehova àjà n’ebe ahụ.  Mgbe Joshụa gwara ndị Izrel lawa, onye nke ọ bụla gawara n’ala o ketara ka o weghara ya.+  Ha nọ na-efe Jehova n’oge niile Joshụa nọ ndụ nakwa n’oge niile ndị okenye ndị dịrị ndụ mgbe Joshụa nwụchara nọ ndụ, bụ́ ndị hụrụ ọrụ niile dị ebube Jehova rụụrụ Izrel.+  Joshụa nwa Nọn, bụ́ ohu Jehova, wee nwụọ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri (110).+  Ha wee lie ya n’ala o ketara nke dị na Timnat-hires,+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, n’ebe ugwu nke Ugwu Geash.+ 10  Ọgbọ ahụ niile nwụkwara otú ndị nna nna ha nwụrụ. Ọgbọ ọzọ wee nọchie ha, bụ́ ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ihe o meere Izrel. 11  Ndị Izrel wee mee ihe dị njọ n’anya Jehova, na-efekwa Bel.+ 12  Ha wee hapụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt.+ Ha fewere chi dị iche iche, bụ́ chi nke ndị gbara ha gburugburu.+ Ha kpọọrọ ha isiala ma kpasuo Jehova iwe.+ 13  Ha hapụrụ Jehova ma malite ife Bel na Ashtọret.+ 14  Jehova wee wesa Izrel ezigbo iwe. O nyefere ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe, ha wee na-akwakọrọ ihe ha.+ O nyefere ha n’aka* ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+ 15  Ebe ọ bụla ha gara, Jehova* na-emegide ha, na-eme ka ọdachi dakwasị ha,+ otú Jehova kwuru nakwa otú Jehova ṅụụrụ ha n’iyi.+ Ha wee na-atagbu onwe ha n’ahụhụ.+ 16  N’ihi ya, Jehova na-enye ha ndị ikpe ga-azọpụta ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ha.+ 17  Ma ha ekweghịdị ege ndị ikpe ahụ ntị, kama ha kpara àgwà ka ndị akwụna hapụ Chineke gaa na-efe chi dị iche iche, na-akpọkwara ha isiala. N’egbughị oge, ha hapụrụ ibi ndụ otú ndị nna nna ha si bie ndụ, bụ́ ndị rubeere iwu Jehova isi.+ Ha emeghị ka ha. 18  Mgbe ọ bụla Jehova nyere ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ ma zọpụta ha n’aka ndị iro ha n’oge niile onyeikpe ahụ nọ ndụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ndị na-emegide ha na ndị na-echi ha ọnụ n’ala na-eme ka ha na-asụ ude.+ 19  Ma mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-ebidokwa kpawa àgwà ọjọọ karịa ndị nna nna ha, na-efe chi dị iche iche ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na isi ike ha. 20  N’ikpeazụ, Jehova wesara Izrel ezigbo iwe+ ma sị: “Ebe ọ bụ na mba a emebiela ọgbụgba ndụ m+ nke m nyere ndị nna nna ha iwu ka ha debe, ha enupụkwarala m isi,+ 21  agaghị m achụpụ mba ọ bụla n’ime mba ndị Joshụa hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.+ 22  M ga-eji ya ele ma ndị Izrel hà ga na-eje ije n’ụzọ Jehova+ otú ndị nna nna ha mere.” 23  N’ihi ya, Jehova hapụrụ mba ndị a ka ha nọrọ. Ọ chụpụghị ha ngwa ngwa, o nyefeghịkwa ha n’aka Joshụa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Bokim pụtara “Ndị Obe Ákwá.”
Na Hibru, “O resịrị ha.”
Na Hibru, “aka Jehova.”