Daniel 5:1-31

  • Eze Belshaza mere oriri (1-4)

  • Mkpịsị aka dere ihe n’ahụ́ ájá (5-12)

  • A kpọrọ Daniel ka ọ kọwaa ihe ahụ e dere (13-25)

  • Ihe e dere pụtara na Babịlọn ga-ada (26-31)

5  Eze Belshaza+ meere otu puku ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya nnukwu oriri, ọ nọkwa n’ihu ha na-aṅụ mmanya.+  Mgbe mmanya gbuwere Belshaza, o nyere iwu ka a chịtara ya arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha ndị Nebukadneza nna ya* bukọọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem.+ Eze chọrọ ka ya na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya na ndị iko ya nwaanyị na ndị nwunye ya ndị ọzọ jiri ha ṅụọ mmanya.  Ha wee chịta arịa ọlaedo ndị ahụ e bukọọrọ n’ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem. Eze na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya na ndị iko ya nwaanyị na ndị nwunye ya ndị ọzọ wee jiri ha ṅụọ mmanya.  Ha ṅụrụ mmanya ma too chi ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo, ọla kọpa, na ígwè kpụọ, chi ndị e ji osisi pịa, nakwa chi ndị e ji nkume tụọ.  N’oge ahụ, mkpịsị aka mmadụ pụtara na-ede ihe n’ahụ́ ájá, n’ebe dị nso n’ebe ihe e ji adọsa ọkụ* dị n’obí eze. Eze nọ na-ahụ azụ aka ahụ ka ọ nọ na-ede ihe.  Ihu eze wee gbanwee, ihe ọ na-eche n’obi ya* menyekwara ya ụjọ. Ụkwụ malitere ịma ya jijiji,+ ikpere ya nọkwa na-akụkọta ọnụ.  Eze ji oké olu kwuo ka a kpọtara ya ndị dibịa afa, ndị Kaldia,* na ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Eze gwara ndị ma ihe na Babịlọn, sị: “Onye ọ bụla nke ga-agụtali ihe a e dere ma kọwaara m ihe ọ pụtara, a ga-eyiwe ya uwe na-acha pọpụl, yinye ya ihe olu ọlaedo n’olu,+ ọ ga-abụkwa onye nke atọ na-achị n’alaeze a.”+  Ndị niile ma ihe, bụ́ ndị na-ejere eze ozi, wee bata. Ma ha enweghị ike ịgụ ihe ahụ e dere ma ọ bụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.+  N’ihi ya, nnukwu ụjọ tụrụ Eze Belshaza, ihu ya gbanwekwara. Ihe a na-emenụ gbagwojuru ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya anya.+ 10  N’ihi ihe eze na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya nọ na-ekwu, nne eze* batara n’ebe ahụ a nọ na-eri oriri. Nne eze wee sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ekwela ka ihe ị na-eche n’obi gị* menye gị ụjọ, ka ihu gị gharakwa ịgbanwe. 11  E nwere otu nwoke nọ n’alaeze gị nke mmụọ chi dị iche iche dị nsọ na-akpa ike n’ahụ́ ya. Mgbe nna gị* na-achị, a chọpụtara na nwoke a nwere ọgụgụ isi, na-aghọta ihe, marakwa ihe ka chi dị iche iche.+ Eze Nebukadneza bụ́ nna gị* mere ya onyeisi ndị dibịa anwansi, ndị dibịa afa, ndị Kaldia,* na onyeisi ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Eze, ọ bụ ihe nna gị* mere. 12  N’ihi na mmụọ pụrụ iche na-akpa ike n’ahụ́ Daniel, onye eze gụrụ Belteshaza.+ Ọ ma ihe, na-aghọtakwa ihe nke na o nwere ike ịkọwa nrọ, ilu, nakwa ihe tara akpụ.*+ Ka a kpọọ Daniel ka ọ bịa. Ọ ga-akọwara gị ihe a.” 13  N’ihi ya, a kpọtara Daniel n’ihu eze. Eze jụrụ Daniel, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Daniel, onye so ná ndị Juda a dọtara n’agha,+ ndị nna m,* eze, si Juda kpọta?+ 14  Anụla m banyere gị, na mmụọ nke chi dị iche iche na-akpa ike n’ahụ́ gị+ nakwa na i nwere ọgụgụ isi, na-aghọta ihe, marakwa ihe nke ukwuu.+ 15  A kpọtara ndị ma ihe na ndị dibịa afa n’ihu m ka ha gụọ ihe a e dere ma kọwaara m ihe ọ pụtara, ma ha enweghị ike ịkọwara m ya.+ 16  Ma anụla m banyere gị, na i nwere ike ịkọwa ihe dị iche iche+ nakwa ihe tara akpụ.* Ọ bụrụ na i nwere ike ịgụ ihe a e dere ma kọwaara m ihe ọ pụtara, a ga-eyiwe gị uwe na-acha pọpụl, yinye gị ihe olu ọlaedo n’olu, ị ga-abụkwa onye nke atọ na-achị n’alaeze a.”+ 17  Daniel wee sị eze: “Jidewe onyinye gị, kwụọkwa ndị ọzọ ụgwọ ahụ. Ma, m ga-agụrụ eze ihe a e dere ma kọwaara ya ihe ọ pụtara. 18  Eze, Chineke Onye Kacha Elu nyere Nebukadneza nna gị* alaeze a, mee ka ọ bụrụ onye ukwu na onye a na-akwanyere ùgwù na onye a na-asọpụrụ.+ 19  N’ihi otú Chineke si mee ka ọ bụrụ onye ukwu, ndị niile, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche tụrụ ya egwu.+ Ọ na-egbu onye ọ bụla ọ chọrọ igbu, hapụkwa onye ọ bụla ọ chọrọ ịhapụ ndụ. Ọ na-ebuli onye ọ bụla masịrị ya n’ọkwá, wedakwa onye ọ bụla masịrị ya ala.+ 20  Ma mgbe ọ dịwara mpako, ya akpọchiekwa obi ya, o buliri onwe ya elu,+ e wee chụtuo ya n’ocheeze ya, n’alaeze ya. A kpụkwara ùgwù ya n’ala. 21  E si n’ebe ndị mmadụ bi chụpụ ya. E mekwara ka obi ya dị ka nke anụ ọhịa, ya na jakị ọhịa wee biri. Ọ tara ahịhịa ka ehi, igirigi nke si n’eluigwe dekwara ya ahụ́, ruo mgbe ọ matara na ọ bụ Chineke Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ nakwa na ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.+ 22  “Ma gị, Belshaza nwa ya,* i wedaghị onwe gị ala n’agbanyeghị na ị ma ihe a niile. 23  Kama i buliri onwe gị elu wee nupụrụ Onyenwe eluigwe isi,+ i nyekwara iwu ka a chịpụtara gị arịa ndị si n’ụlọ ya.+ Gị na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị gị na ndị iko gị nwaanyị na ndị nwunye gị ndị ọzọ wee jiri ha ṅụọ mmanya. Unu tokwara chi ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo, ọla kọpa, na ígwè kpụọ, chi ndị e ji osisi pịa, nakwa chi ndị e ji nkume tụọ, ya bụ, chi ndị na-anaghị ahụ ụzọ, ndị na-anaghị anụ ihe, ndị na-amaghịkwa ihe.+ Ma i toghị Chineke onye ndụ gị na ihe niile ị na-eme dị n’aka.+ 24  Ọ bụ ya mere o ji zite aka ahụ, e wee dee ihe a.+ 25  Ihe e dere bụ: MINI, MINI, TIKEL, na PASỊN. 26  “Lekwa ihe okwu ndị a pụtara: MINI pụtara na Chineke agụọla ụbọchị ị ga-achị n’alaeze gị ọnụ, meekwa ka ọ gwụ.+ 27  “TIKEL pụtara na e jirila ihe e ji atụ̀ ihe tụọ gị, ma e nweghị ihe ị datara. 28  “PIRES* pụtara na e kewaala alaeze gị, were ya nye ndị Midia na ndị Peshia.”+ 29  Belshaza nyeziri iwu, e wee yiwe Daniel uwe na-acha pọpụl, yinyekwa ya ihe olu ọlaedo n’olu. A makwara ọkwa na ọ ga-abụ onye nke atọ na-achị n’alaeze ahụ.+ 30  N’abalị ahụ, e gburu Belshaza eze ndị Kaldia.+ 31  Darayọs+ onye Midia wee malite ịchị alaeze ahụ. Ọ dị ihe dị ka afọ iri isii na abụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nna nna ya.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
N’Arameik, “echiche ya.”
Ya bụ, ndị bụ́ aka ochie n’ịgba afa nakwa n’iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Na Hibru, “eze nwaanyị.”
N’Arameik, “echiche gị.”
Ma ọ bụ “nna nna gị.”
Ma ọ bụ “nna nna gị.”
Ya bụ, ndị bụ́ aka ochie n’ịgba afa nakwa n’iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Ma ọ bụ “nna nna gị.”
N’Arameik, “nakwa ịtọpe ihe mara akpụ.”
Ma ọ bụ “nna nna m.”
N’Arameik, “nakwa ịtọpe ihe mara akpụ.”
Ma ọ bụ “nna nna gị.”
Ma ọ bụ “nwa nwa ya.”
Pires na Pasịn bụ nwanne. A na-akpọ ya Pires ma ọ bụrụ otu, kpọọ ya Pasịn ma ọ karịa otu.