Esta 4:1-17

  • Mọdekaị ruru uju (1-5)

  • Mọdekaị gwara Esta ka ọ rịọchitere ndị Juu arịrịọ (6-17)

4  Mgbe Mọdekaị+ nụrụ ihe niile merenụ,+ ọ dọwara uwe ya, yiri ákwà iru uju, kpokwasị onwe ya ntụ. Ọ gakwara n’etiti obodo ahụ na-eti mkpu, na-ebekwa ákwá n’ihi otú ihe a si na-ewute ya.  Ọ garuru n’ọnụ ụzọ ámá eze kwụsị, n’ihi na o nweghị onye na-eyi ákwà iru uju agafe ọnụ ụzọ ámá eze.  N’ógbè* ọ bụla+ a gwara ndị mmadụ iwu eze tiri, ndị Juu bi ebe ahụ na-amalite iru ezigbo uju, na-ebu ọnụ,+ na-ebe ákwá, na-etikwa mkpu arịrị. Ọtụtụ n’ime ha yikwa ákwà iru uju dinara ná ntụ.+  Mgbe ụmụ agbọghọ na-ejere Esta nwunye eze ozi na ndị ọnaozi ya bịara kọọrọ ya ihe na-emenụ, o wutere ya nke ukwuu. O wee chịnye ndị mmadụ uwe ka ha chịgara Mọdekaị ka o were ya gbanwee ákwà iru uju o yi. Ma ọ naraghị ya.  Esta wee kpọọ Hetak, bụ́ otu n’ime ndị ọnaozi eze, onye eze họpụtara ka ọ na-ejere Esta ozi, ma gwa ya ka ọ gaa jụta Mọdekaị ihe merenụ na ihe ihe a ọ na-eme pụtara.  Hetak wee gakwuru Mọdekaị n’ámá obodo nke dị n’ihu ọnụ ụzọ ámá eze.  Mọdekaị kọọrọ ya ihe niile mere ya nakwa ego ole+ Heman kwere nkwa ịkwụnye n’ebe eze na-edebe akụ̀, ka e wee bibie ndị Juu.+  O nyekwara ya akwụkwọ e dere iwu ahụ e tiri na Shushan*+ ka a laa ndị Juu n’iyi. Ọ ga-egosi ya Esta ma kọọrọ ya gbasara ya. Ọ ga-agwakwa ya+ ka ọ gakwuru eze rịọ ya ka o meere ha amara, gaakwa ihu na ihu rịọchitere ndị ya arịrịọ.  Hetak wee bịa kọọrọ Esta ihe Mọdekaị kwuru. 10  Esta wee gwa Hetak ka ọ gwa Mọdekaị,+ sị: 11  “Ndị niile na-ejere eze ozi na ndị niile nọ n’ógbè* niile eze na-achị ma na nwoke ọ bụla ma ọ bụ nwaanyị ọ bụla banyere n’ogige eze nke dị n’ime+ ma ọ́ bụghị eze kpọrọ ya, ihe iwu kwuru bụ na a ga-egbu onye ahụ, ọ gwụla ma eze ò setịịrị ya mkpanaka ọlaedo ya.+ Eze akpọbeghịkwanụ m ka m bịa kemgbe ụbọchị iri atọ ugbu a.” 12  Mgbe a gwara Mọdekaị ihe Esta kwuru, 13  ọ gwara Esta, sị: “Echekwala na a ga-egbu ndị Juu ndị ọzọ niile ma hapụ gịnwa maka na ị nọ n’ezinụlọ eze. 14  N’ihi na ọ bụrụ na ị gbachi nkịtị ugbu a, a ga-esi ebe ọzọ nyere ndị Juu aka ma napụta ha.+ Ma gị na ezinụlọ nna gị ga-ala n’iyi. Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka o ji dabara gị ịbụ nwunye eze?”+ 15  Esta wee gwa Mọdekaị, sị: 16  “Gaa kpọkọta ndị Juu niile nọ na Shushan,* buokwaranụ m ọnụ.+ Unu erikwala ihe ma ọ bụ ṅụọ mmanya ụbọchị atọ,+ ehihie na abalị. Mụ na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi ga-ebukwa ọnụ. M ga-agakwuru eze n’agbanyeghị na ọ bụ ịda iwu. Ọ bụrụ na m ga-anwụ, ka m nwụọ.” 17  Mọdekaị wee gaa mee ihe niile Esta gwara ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “Susa.”