Esta 9:1-32

  • Mgbe ndị Juu meriri ndị iro ha (1-19)

  • Mgbe a malitere ime ememme Purim (20-32)

9  N’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda,*+ mgbe oge ruru ka e mee ihe eze kwuru na ihe o tiri n’iwu,+ n’ụbọchị ndị iro ndị Juu nọ na-eche ka ha merie ha, egwú dagharịrị, ndị Juu emerie ndị kpọrọ ha asị.+  Ndị Juu zukọrọ n’obodo ha dị iche iche, n’ógbè* niile Eze Ahazuirọs na-achị,+ iji lụso ndị ahụ niile chọrọ ime ha ihe ọjọọ ọgụ. O nweghịkwa onye pụtaliri ịlụso ha ọgụ, n’ihi na mmadụ niile na-atụ ha ụjọ.+  Ndị isi ógbè* niile na ndị setrap+ na ndị gọvanọ na ndị na-arụrụ eze ọrụ nọ na-enyere ndị Juu aka, n’ihi na ụjọ Mọdekaị na-atụ ha.  Mọdekaị bụzi nnukwu mmadụ+ n’ụlọ* eze. Ọ na-edekwa ude n’ógbè* niile, n’ihi na ka chi na-abọ, ka ọ na-esikwu ike n’ọchịchị.  Ndị Juu ji mma agha sụọ ndị iro ha niile akwụ, gbuo ha, bibiekwa ha. Ha mekwara ndị kpọrọ ha asị otú o si masị ha.+  Ndị Juu gbukwara ndị mmadụ na Shushan,*+ bụ́ ebe obí eze dị.* Ha gburu narị mmadụ ise (500).  Ha gbukwara Pashandeta, Dalfọn, Aspeta,  Poreta, Adelaya, Arideta,  Pamashta, Arisaị, Aridaị, na Vaịzeta. 10  Ndị a bụ ụmụ iri Heman nwa Hamedeta, onye iro ndị Juu.+ Ma mgbe ha gbuchara ha, ha akwakọrọghị ngwongwo ha.+ 11  N’ụbọchị ahụ, a gwara eze mmadụ ole e gburu na Shushan,* bụ́ ebe obí eze dị.* 12  Eze wee gwa Esta nwunye ya, sị: “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise (500) na Shushan,* bụ́ ebe obí eze dị,* gbuokwa ụmụ iri Heman. Gịnị ka ha mere n’ógbè* ndị ọzọ eze na-achị?+ Gịnịkwa ka ị na-arịọ? M ga-emere gị ya. Gịnịkwa ka ị chọkwuru ka m meere gị? M ga-emere gị ya.” 13  Esta wee sị: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma,+ nye ndị Juu nọ na Shushan* ikike ka ha mekwuo ihe iwu kwuru ha mere taa echi.+ Ka a kwụwakwa ụmụ iri Heman n’elu osisi.”+ 14  Eze wee kwuo ka e mee otú ahụ. E wee tie iwu na Shushan,* kwụwakwa ụmụ iri Heman n’elu osisi. 15  Ndị Juu bi na Shushan* wee zukọta n’abalị iri na anọ n’ọnwa Eda+ gbuo narị mmadụ atọ (300) na Shushan.* Ma ha akwakọrọghị ngwongwo ha. 16  Ndị Juu ndị ọzọ bi n’ógbè* dị iche iche eze na-achị gbakọkwara, zọọ onwe ha ndụ.*+ Ha bibiri ndị iro ha,+ gbuo puku mmadụ iri asaa na puku ise (75,000) ndị kpọrọ ha asị. Ma ha akwakọrọghị ngwongwo ha. 17  Ihe a mere n’abalị iri na atọ n’ọnwa Eda. Ha zukwara ike n’abalị iri na anọ, jirikwa ụbọchị ahụ mere ụbọchị oriri na ụbọchị ịṅụrị ọṅụ. 18  N’abalị iri na atọ+ nakwa n’abalị iri na anọ,+ ndị Juu bi na Shushan* gbakọtara. Ha zukwara ike n’abalị iri na ise, jirikwa ya mere ụbọchị oriri na ụbọchị ịṅụrị ọṅụ. 19  Ọ bụ ya mere ndị Juu bi n’ime ime obodo dị iche iche ji jiri abalị iri na anọ n’ọnwa Eda mere ụbọchị ịṅụrị ọṅụ, ụbọchị oriri, ụbọchị ikpori ndụ,+ na ụbọchị ha ji enyerịta ibe ha nri.+ 20  Mọdekaị+ dere ihe ndị a n’akwụkwọ ma zigara ha ndị Juu niile nọ n’ógbè* niile Eze Ahazuirọs na-achị, ma ebe ndị dị nso ma ebe ndị dị anya. 21  Ọ gwara ha ka ha na-echeta abalị iri na anọ na abalị iri na ise n’ọnwa Eda n’afọ ọ bụla, 22  n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ndị ahụ ka ndị Juu zuuru ndị iro ha ike. Ọ bụkwa n’ọnwa ahụ ka e mere ka ákwá ha na-ebe bụrụzie ọṅụ, meekwa ka ụbọchị ha na-eru uju+ bụrụzie ụbọchị ikpori ndụ. Ha ga na-eji ụbọchị ndị ahụ na-eri, na-aṅụ, na-enwekwa aṅụrị. Ha ga-ejikwa ha na-enyerịta ibe ha nri, na-enyekwa ndị ogbenye onyinye. 23  Ndị Juu kwetara ịna-eme ememme ahụ ha maliterela, kwetakwa ịna-eme ihe Mọdekaị dere n’akwụkwọ ozi o ziteere ha. 24  N’ihi na Heman+ nwa Hamedeta, onye agbụrụ Egag,+ onye iro ndị Juu niile, kpara nkata ibibi ndị Juu.+ O fekwara Pua,+ ya bụ, Nza, iji mee ka ụjọ jide ha nakwa iji bibie ha. 25  Ma mgbe Esta gakwuuru eze, eze nyere iwu, e deekwa ya edee,+ sị: “Ka nkata ọjọọ a ọ kpaara ndị Juu+ kpudo ya.” Ha kwụwakwara ya na ụmụ ya n’elu osisi.+ 26  Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ụbọchị ndị a Purim. O si n’okwu bụ́ Pua.*+ N’ihi ihe niile e dere n’akwụkwọ ozi a na ihe ndị Juu ji anya ha hụ gbasara okwu a nakwa ihe mere ha, 27  ha kpebisiri ike na ha na ụmụ ha nakwa ndị niile sonyeere ha+ ga na-echeta ụbọchị abụọ ndị a otú ahụ e dere ka a na-eme ya n’oge a kara aka n’afọ ọ bụla. 28  Ọgbọ ọ bụla, ezinụlọ ọ bụla, ógbè* ọ bụla na obodo ọ bụla ga na-echeta ụbọchị ndị a, na-emekwa ememme e ji echeta ha. Ndị Juu agaghị akwụsị icheta ụbọchị Purim. Ụmụ ha agaghịkwa akwụsị ime ememme e ji echeta ụbọchị ndị a. 29  Esta nwunye eze, nwa Abihel, na Mọdekaị onye Juu ji ikike ha nwere dee akwụkwọ ozi nke abụọ gbasara Purim iji kwadosie ya ike. 30  Mọdekaị zigaara ndị Juu niile bi n’otu narị ógbè* na iri abụọ na asaa (127),+ ebe Ahazuirọs na-achị,+ akwụkwọ ozi e dere ihe ndị na-emeda mmadụ obi na ihe ndị bụ́ eziokwu. 31  O dere ya iji kwado ka ndị Juu na-echeta ụbọchị ndị a bụ́ Purim, na-ebu ọnụ+ ma na-arịọ Chineke arịrịọ+ n’oge a kara aka, otú ahụ Mọdekaị onye Juu na Esta nwunye eze kwuru ka ha na-eme+ nakwa otú ha kpebisiri ike na ha na ụmụ ha ga na-eme.+ 32  Ihe Esta kwuru ka ha na-eme kwadosiri okwu gbasara Purim ike.+ E dekwara ya n’akwụkwọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B15.
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ebe a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Susa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
“Pua” pụtara “Nza.” A na-akpọ ya “Purim” ma ọ karịa otu. “Purim” bụkwa aha a na-akpọ ememme ndị Juu na-eme n’ọnwa nke iri na abụọ. Gụọ B15.
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”