Ilu 30:1-33

  • OKWU EGỌ KWURU (1-33)

    • Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba (8)

    • Ihe ndị afọ na-anaghị eju eju (15, 16)

    • Ihe ndị na-agba mmadụ gharịị (18, 19)

    • Nwaanyị na-akwa iko (20)

    • Ihe ndị ma nnọọ ihe (24)

30  Okwu gbara ọkpụrụkpụ Egọ nwa Jeke kwuru, nke ọ gwara Itiel na Yukal.   Mmadụ niile ma ihe karịa m,+Anaghịkwa m aghọta ihe otú mmadụ kwesịrị isi ghọta ihe.   Amụtabeghị m ihe bụ́ amamihe,Amaghịkwa m ihe Onye Kacha Nsọ ma.   Ònye gbagorola n’eluigwe ma gbadata?+ Ònye ji ọbụ aka ya abụọ kpokọta ifufe? Ònye ji ákwà kechie mmiri?+ Ònye kere ebe niile ụwa sọtụrụ?+ Gịnị bụ aha ya, gịnịkwa bụ aha ọkpara ya, ma ọ bụrụ na ị ma?   Okwu niile Chineke na-ekwu enweghị ntụpọ.*+ Chineke bụụrụ ndị na-agbaba n’ime ya ọta.+   Etinyela ihe ọ bụla n’okwu ya,+Ka ọ ghara ịbara gị mba,Gị abụrụzie onye ụgha.   Chineke, m na-arịọ gị ihe abụọ. Ajụla imere m ha tupu mụ anwụọ.   Nyere m aka ka m ghara ịna-ekwu ihe na-abụghị eziokwu, ka m ghara ịna-agha ụgha.+ Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Naanị nye m nri ga-ezuru m,+   Ka afọ wee ghara iju m, mụ agọnahụ gị, sị, “Ònye bụ Jehova?”+ Ekwekwala ka m daa ogbenye, ka m wee ghara izu ohi ma mebie aha Chineke m. 10  Ekwutọla onye na-eje ozi ná ntị nna ya ukwu,Ka onye ahụ na-eje ozi ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe ewee ma gị.+ 11  E nwere ndị* na-akpọ nna ha iyi,*Ha anaghịkwa agọzi nne ha.+ 12  E nwere ndị* chere na ha dị ọcha,+Ma a sapụbeghị ha unyi dị ha n’ahụ́.* 13  E nwere ndị* na-ebuli onwe ha elu,Ndị dịkwa nnọọ mpako.+ 14  E nwere ndị* ezé ha dị ka mma agha,Ndị agba ha dịkwa ka mma e ji egbu anụ. Ha na-eripịa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà haNakwa ndị ogbenye.+ 15  Etu mụrụ ụmụ abụọ ndị na-ebe ákwá, sị: “Nye m! Nye m!” E nwere ihe atọ afọ na-anaghị eju eju,Ihe anọ na-anaghị asị, “O zuola!” 16  Ha bụ ili*+ na akpa nwa nwaanyị agaNa ala na-anaghị enweta mmiri,Nakwa ọkụ nke na-anaghị asị, “O zuola!” 17  Onye na-akwa nna ya emo ma na-eleda nne ya anya,+Ugoloọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta anya ya,Ụmụ ugo ga-erikwa ya.*+ 18  E nwere ihe atọ gbara m gharịị,Ihe anọ m na-aghọtabeghị: 19  Otú ugo si efegharị n’eluigwe,Otú agwọ si arịgharị n’elu nkume,Otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri,Nakwa ije nwoke na nwaanyị. 20  Ihe nwaanyị na-akwa iko na-eme bụ: O richaa, ya ehichaa ọnụ ya,Sịzie, “E nweghị ihe ọjọọ m mere.”+ 21  E nwere ihe atọ na-emenye ụwa egwu,Ihe anọ ndị mmadụ na-enweghị ike idi: 22  Mgbe ohu ghọrọ eze,+Mgbe onye iberiibe rifere nri ókè, 23  Mgbe ọ bụ nwaanyị a kpọrọ asị ka nwoke gara lụọ,Nakwa mgbe nwa agbọghọ na-eje ozi nọchiri nne ya ukwu.+ 24  E nwere ihe anọ so n’ihe ndị kacha nta n’ụwa,Ma ha ma nnọọ ihe:*+ 25  Ndanda esighị ike,Ma ha na-akwadebe ihe oriri ha n’ọkọchị.+ 26  Ewi nkume+ esighị ike,Ma ha na-arụ ụlọ ha ná nnukwu nkume.+ 27  Igurube+ enweghị eze na-achị ha,Ma ha niile na-aga n’usoro.*+ 28  Agụ ụlọ*+ na-agagidesi aka ike n’ihe,Ọ na-abanyekwa n’obí eze. 29  E nwere ihe atọ otú ha si aga mara ezigbo mma,Ihe anọ otú ha si aga dị ebube. 30  Ha bụ ọdụm, bụ́ anụ kacha anụ ọhịa niile ike,Nke na-anaghị agbara onye ọ bụla ọsọ;+ 31  Na nkịta ntá; na mkpi;Nakwa eze nke ya na ìgwè ndị agha ya so. 32  Ọ bụrụ na i zuzurula bulie onwe gị elu+Ma ọ bụ na i cheela echiche ime otú ahụ,Kpuchie ọnụ gị aka.+ 33  N’ihi na otú ahụ a na-enweta bọta ma a kpagharịsie mmiri ara ehi ikeNakwa otú ahụ ọzọimi* na-agba mmadụ ma a pịsie ya aka n’imi ike,Ka esemokwu na-amalite ma a kpasuo mmadụiwe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “bụ okwu e ji ọkụ nụchaa.”
Ma ọ bụ “na-abụ nna ha ọnụ.”
Na Hibru, “ọgbọ.”
Na Hibru, “ọgbọ.”
Na Hibru, “nsị ha.”
Na Hibru, “ọgbọ.”
Na Hibru, “ọgbọ.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, anya ya.
Ma ọ bụ “ha bu amamihe pụta ụwa.”
Ma ọ bụ “ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè.”
Ma ọ bụ “Ncheke.”
Ma ọ bụ “ọbara.”