Jenesis 16:1-16

  • Hega na Ishmel (1-16)

16  Seraị, nwunye Ebram, amụtaraghị ya nwa.+ Ma o nwere nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi aha ya bụ Hega.+  Seraị sịrị Ebram: “Lee, Jehova egbochiela m ịmụ nwa. Biko, gị na nwaanyị na-ejere m ozi nwee mmekọahụ. Ma eleghị anya, ọ ga-amụtara m ụmụ.”+ Ebram wee kweta ime ihe Seraị kwuru.  Mgbe Ebram bichara afọ iri na Kenan, Seraị nwunye Ebram, kpọọrọ Hega, nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi, kpọnye di ya Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya.  Ya na Hega wee nwee mmekọahụ, Hega adịrị ime. Mgbe ọ matara na ya dị ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu anya.  Seraị wee sị Ebram: “Ọ bụ gị kpatara ihe ọjọọ a o mere m. Ọ bụ m kpọnyere gị nwaanyị na-ejere m ozi, ma mgbe ọ matara na ya adịla ime, ọ malitere ileda m anya. Ka Jehova kpee ikpe mụ na gị.”  Ebram wee sị Seraị: “Ebe ọ bụ nwaanyị na-ejere gị ozi, mee ya ihe ọ bụla masịrị gị.” Seraị wee megbuwe ya, ya esi n’ụlọ ya gbapụ.  Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova hụrụ Hega n’otu isi iyi dị n’ala ịkpa. Isi iyi ahụ dị n’ụzọ gawara Shọọ.+  O wee sị: “Hega, nwaanyị na-ejere Seraị ozi, olee ebe i si bịa, ebeekwa ka ị na-aga?” O wee zaa, sị: “M si n’ụlọ Seraị nne m ukwu na-agbapụ.”  Mmụọ ozi Jehova gwara ya, sị: “Laghachikwuru nne gị ukwu, wedakwa onwe gị n’okpuru ya.” 10  Mmụọ ozi Jehova sịkwara ya: “M ga-eme ka ụmụ* gị mụbaa nke ukwuu nke na a gaghị agụta ha ọnụ n’ihi otú ha ga-esi dị ọtụtụ.”+ 11  Mmụọ ozi Jehova kwukwara, sị: “Lee, ị dị ime. Ị ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Ishmel,* n’ihi na Jehova anụla na ị na-ata ahụhụ. 12  Ma ọ ga na-eme ka jakị ọhịa.* Ọ ga na-alụso onye ọ bụla ọgụ, onye ọ bụla ga na-alụsokwa ya ogụ. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ga-eche ụmụnne ya niile ihu.”* 13  Hega wee too* aha Jehova, onye nọ na-agwa ya okwu. Ọ sịrị: “Ị bụ Chineke na-ahụ ụzọ.”+ O kwuru ihe a maka na ọ gwara onwe ya, sị: “M nọrọla ebe a hụ onye ahụ nke na-ahụ m.” 14  Ọ bụ ya mere e ji kpọọ olulu mmiri ahụ Bia-lehaị-rọị.* (Ọ dị n’agbata Kedesh na Bired.) 15  Hega wee mụọrọ Ebram nwa nwoke. Ebram wee gụọ nwa ya nwoke ahụ Hega mụụrụ ya Ishmel.+ 16  Ebram dị afọ iri asatọ na isii mgbe Hega mụụrụ ya Ishmel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ishmel pụtara “Chineke Na-anụ.”
Ụfọdụ na-ekwu na anụ e kwuru okwu ya ebe a bụ ịnyịnya ọhịa. O nwere ike ịbụ na ihe ọ pụtara bụ na Ishmel agaghị achọ ịnọ n’okpuru onye ọ bụla.
O nwere ike ịbụ, “Ya na ụmụnne ya niile agaghị ebi n’udo.”
Na Hibru, “kpọkuo.”
Bia-lehaị-rọị pụtara “Olulu Mmiri Onye Dị Ndụ nke Na-ahụ M.”