Jenesis 30:1-43

  • Bilha mụrụ Dan na Naftalaị (1-8)

  • Zilpa mụrụ Gad na Asha (9-13)

  • Lia mụrụ Ịsaka na Zebulọn (14-21)

  • Rechel mụrụ Josef (22-24)

  • Jekọb nwekwuru ìgwè anụ ụlọ (25-43)

30  Mgbe Rechel hụrụ na ya amụtaghịrị Jekọb nwa, Rechel malitere imere nwanne ya nwaanyị anyaụfụ. O wee malite ịsị Jekọb: “Nye m nwa, ma ọ́ bụghị ya, m ga-anwụ.”  Jekọb wee weso Rechel nnukwu iwe ma sị ya: “Àbụ m Chineke, onye mere ka ị ghara ịmụta nwa?”*  Rechel wee sị: “Lekwa Bilha ohu m nwaanyị.+ Gị na ya nwee mmekọahụ ka ọ mụtara m nwa,* ka m wee si n’aka ya nweta ụmụ.”  Ọ kpọnyeziri Jekọb Bilha bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi ka ọ bụrụ nwunye ya, ya na Jekọb wee nwee mmekọahụ.+  Bilha wee dịrị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke.  Rechel wee sị: “Chineke ekpeerela m ikpe. O geela m ntị, nke mere na o nyere m nwa nwoke.” Ọ bụ ya mere o ji gụọ ya Dan.*+  Bilha, nwaanyị na-ejere Rechel ozi, wee dịrị ime ọzọ, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke abụọ.  Rechel wee sị: “Mụ na nwanne m nwaanyị agbaala ezigbo mgba. Emeriekwala m ya.” O wee gụọ ya Naftalaị.*+  Mgbe Lia hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.+ 10  Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi, wee mụọrọ Jekọb nwa nwoke. 11  Lia wee sị: “Ihe ọma adabarala m.” O wee gụọ ya Gad.*+ 12  Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi, mechara mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 13  Lia wee sị: “Obi atọgbuola m! N’ihi na ụmụ nwaanyị ga-akpọ m onye obi ụtọ.”+ O wee gụọ ya Asha.*+ 14  N’oge a na-ewe ọka wit n’ubi, Ruben+ nọ na-agagharị, o wee hụ mkpụrụ mandrek* n’ubi. Ọ chịtaara ha Lia nne ya. Rechel wee sị Lia: “Biko, nye m ụfọdụ n’ime mkpụrụ mandrek nwa gị wetara.” 15  Lia sịrị ya: “Ọ̀ bụ na di m ị naara m ezubereghị gị?+ Ị̀ chọkwuru ịnara m mkpụrụ mandrek nwa m wetara?” Rechel wee sị ya: “Nsogbu adịghị. Gị na Jekọb ga-edina n’abalị a ka m jiri ya kwụọ gị ụgwọ mkpụrụ mandrek nwa gị wetara.” 16  Mgbe Jekọb si n’ọhịa na-alọta ná mgbede, Lia gakwuuru ya ma sị ya: “Ọ bụ mụ na gị ga-enwe mmekọahụ, n’ihi na ejirila m mkpụrụ mandrek nwa m wetara gobie gị.” Ya na ya wee dinaa n’abalị ahụ. 17  Chineke nụrụ olu Lia ma za ya. O wee dị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke ise. 18  Lia wee sị: “Chineke akwụọla m ụgwọ ọrụ m* maka na m kpọnyere di m nwaanyị na-ejere m ozi.” O wee gụọ ya Ịsaka.*+ 19  Lia wee dị ime ọzọ, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke isii.+ 20  Lia sịziri: “Chineke enyela m ezigbo onyinye. N’ikpeazụ, di m ga-anabata m,+ n’ihi na amụọrọla m ya ụmụ nwoke isii.”+ O wee gụọ ya Zebulọn.*+ 21  Lia mechara mụọ nwa nwaanyị ma gụọ ya Daịna.+ 22  N’ikpeazụ, Chineke chetara Rechel. Chineke wee nụ olu ya, za ya ekpere ma mee ka o nwee ike ịdị ime.*+ 23  O wee dị ime mụọ nwa nwoke, sị: “Chineke ewepụla nkọcha a na-akọcha m.”+ 24  O wee gụọ ya Josef,*+ sị: “Jehova enyela m nwa nwoke ọzọ.” 25  Mgbe Rechel mụchara Josef, Jekọb gwara Leban ozugbo, sị: “Hapụ m ka m laa n’ụlọ m, n’obodo m.+ 26  Kpọnye m ndị nwunye m na ụmụ m, ndị m ji maka ha jeere gị ozi, ka m kpọrọ ha laa, n’ihi na ị ma na m ji obi m niile jeere gị ozi.”+ 27  Leban wee sị ya: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,—ihe àmà* egosila m na Jehova na-agọzi m n’ihi gị.” 28  O kwukwara, sị: “Gwa m ihe m ga-eji kwụọ gị ụgwọ ọrụ, m ga-enyekwa gị ya.”+ 29  Jekọb sịrị ya: “Ị ma otú m si jiri obi m niile jeere gị ozi na otú m si lekọta ìgwè anụ gị nke ọma.+ 30  E nweghị oké ihe i nwere tupu mụ abịa, ma ìgwè anụ gị amụbaala, dịkwa ọtụtụ, Jehova agọziekwala gị kemgbe m bịara. Oleekwanụ mgbe m ga-emere ndị ezinụlọ nke m ihe?”+ 31  Leban wee sị ya: “Gịnị ka m ga-enye gị?” Jekọb sịrị ya: “Enyela m ihe ọ bụla. M ka ga na-azụrụ gị ìgwè anụ gị ma na-elekọta ha ma i meere m ihe a.+ 32  Anyị ga-aga leruo ìgwè anụ gị niile anya taa. Kpụrụ atụrụ ọ bụla tụrụ àgwà na nke nwere ụcha dị iche iche na ebule ọ bụla na-acha nchara nchara nakwa nne ewu ọ bụla tụrụ àgwà na nke nwere ụcha dị iche iche. Si ugbu a gawa, nke ọ bụla ga-adị otú ahụ ga-abụzi ụgwọ ọrụ m.+ 33  Ụbọchị ọ bụla ị ga-abịa ileru ụgwọ ọrụ m anya, ị ga-ahụ na m bụ onye ezi omume.* Ọ bụrụ na ị hụ na m nwere nne ewu na-atụghị àgwà na nke na-enweghị ụcha dị iche iche nakwa ebule na-anaghị acha nchara nchara, mara na m zuru ya ezu.” 34  Leban wee sị: “Ọ dị mma. Ka ọ dị otú i kwuru.”+ 35  N’ụbọchị ahụ, Leban kpụụrụ mkpi ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà na nne ewu niile tụrụ àgwà na ndị nwere ụcha dị iche iche nakwa ebule ọ bụla tụrụ àgwà ọcha na nke ọ bụla na-acha nchara nchara kpụnye ụmụ ya ndị nwoke ka ha lekọtawa. 36  Mgbe e mechara, ọ kpụụrụ ha si n’ebe Jekọb nọ gaa n’ebe ga-ewe ụbọchị atọ iru. Jekọb nọkwa na-azụ ìgwè anụ Leban ndị fọrọ afọ. 37  Jekọb wee gbute osisi stọraks, osisi almọnd, na osisi plen, kpechatụ azụ ha ka e nwee ike ịna-ahụ ebe ndị na-acha ọcha n’okporo osisi ndị ahụ. 38  O dosaziri okporo osisi ndị ahụ o kpechatụrụ ekpecha n’ihu ìgwè anụ ahụ, n’ọwa mmiri ha, n’efere anụ ndị ahụ ji aṅụ mmiri, bụ́ ebe ìgwè anụ ahụ na-abịa aṅụ mmiri, ka ha wee gbaa ibe ha n’ihu osisi ndị ahụ mgbe ha bịara ịṅụ mmiri. 39  Ìgwè anụ ahụ wee na-agba ibe ha n’ihu okporo osisi ndị ahụ. Ha na-amụkwa ụmụ ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà. 40  Jekọb wee kpụpụta ebule iche ma chee ìgwè anụ ahụ ihu n’ebe ndị ahụ nwere ụcha dị iche iche nọ nakwa n’ebe ndị niile na-acha nchara nchara n’ìgwè anụ Leban nọ. Ọ kpụpụziri ìgwè anụ nke ya iche. O dokọtaghị ha na ìgwè anụ Leban. 41  Mgbe ọ bụla anụ ndị siri ike chọrọ ịgba anụ ibe ha, Jekọb na-edosa okporo osisi ndị ahụ n’ọwa mmiri ahụ, n’ihu ìgwè anụ ahụ, ka ha gbaa ibe ha n’akụkụ okporo osisi ndị ahụ. 42  Ma ọ naghị edosa okporo osisi ndị ahụ n’ihu anụ ndị na-esighị ike. N’ihi ya, anụ ndị na-esighị ike na-abụ nke Leban, ma ndị siri ike na-abụ nke Jekọb.+ 43  Nwoke ahụ* wee baa ezigbo ọgaranya. O nwere ọtụtụ ìgwè anụ ụlọ, nweekwa ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke ndị na-ejere ya ozi nakwa ọtụtụ kamel na ọtụtụ jakị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye jụrụ inye gị mkpụrụ nke afọ.”
Na Hibru, “ọ mụọ nwa n’ikpere m.”
Dan pụtara “Onyeikpe.”
Naftalaị pụtara “Mgba M Gbara.”
Gad pụtara “Ihe Ndabara Ọma.”
Asha pụtara “Obi Ụtọ.”
Ụmụ nwaanyị na-eri mkpụrụ ahịhịa a maka na ha chere na ọ ga-eme ka ha dị ime.
Ma ọ bụ “ụgwọ ọrụ onye e goro ọrụ.”
Ịsaka pụtara “Ọ Bụ Ụgwọ Ọrụ.”
Zebulọn pụtara “Nnabata”
Na Hibru, “Chineke wee gee ya ntị ma meghee akpa nwa ya.”
Josef bụ mkpọbiri aha bụ́ Josifaya. Ọ pụtara “Ka Jaa Gbakwụnye Ihe (Mụbaa).”
Ma ọ bụ “ihe m gbatara n’afa.”
Ma ọ bụ “m na-akwụwa aka ọtọ.”
Ya bụ, Jekọb.