Jenesis 44:1-34

  • A hụrụ iko ọlaọcha Josef n’akpa Benjamin (1-17)

  • Juda rịọchiteere Benjamin arịrịọ (18-34)

44  Mgbe e mechara, Josef nyere onye na-elekọta ụlọ ya iwu, sị: “Kponye ihe oriri n’akpa ụmụ nwoke ahụ otú ha ga-ebuli, tinyekwa ego onye nke ọ bụla n’ọnụ akpa ya.+  Ma ị ga-etinye iko m, ya bụ, iko ọlaọcha m, n’ọnụ akpa nke ọdụdụ nwa, ya na ego o ji bịa ịzụ ọka.” O wee mee ihe Josef gwara ya.  Mgbe chi bọrọ n’ụtụtụ, a hapụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha akpụrụ jakị ha lawa.  Mgbe ọ na-adịchabeghị anya ha hapụrụ obodo ahụ, Josef gwara onye na-elekọta ụlọ ya, sị: “Bilie! Chụwa ụmụ nwoke ndị ahụ. Ị chụkwuru ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji jiri ihe ọjọọ kwụọ nna m ukwu ụgwọ ihe ọma?  Gịnị mere unu ji were iko nna m ukwu ji aṅụ mmanya, nke o jikwa amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ihe a unu mere bụ ihe ọjọọ.’”  Onye na-elekọta ụlọ Josef wee chụkwuru ha ma gwa ha ihe a.  Ma ha sịrị ya: “Gịnị mere onyenwe m ji ekwu ụdị ihe a? Ndị ohu gị agaghị anwa anwa eme ụdị ihe a.  Ọ̀ kwa anyị si na Kenan weghachiri gị ego anyị hụrụ n’ọnụ akpa anyị?+ Oleezi otú anyị ga-esi zuru ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo n’ụlọ nna gị ukwu?  Ka e gbuo onye ọ bụla n’ime ndị ohu gị a hụrụ ya n’akpa ya, ndị fọrọ n’ime anyị ga-abụkwara nna m ukwu ndị ohu.” 10  O wee sị ha: “Ka ọ dị otú unu kwuru: Onye a hụrụ ya n’akpa ya ga-abụ ohu m, ma a ga-ewere ndị fọrọ n’ime unu ka ndị aka ha dị ọcha.” 11  N’ihi ya, onye nke ọ bụla n’ime ha buturu akpa ya ọsọ ọsọ ma meghee ya. 12  Ọ chọrọ iko ahụ nke ọma. Ọ malitere n’akpa nke okenye wee kwụsị na nke ọdụdụ nwa. N’ikpeazụ, a hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin.+ 13  Ha wee dọwaa ákwà ha. Onye nke ọ bụla n’ime ha buuru ibu ya dọkwasị n’elu jakị ya. Ha wee laghachi n’obodo ahụ. 14  Mgbe Juda+ na ụmụnne ya banyere n’ụlọ Josef, ọ ka nọ n’ebe ahụ. Ha wee daara ya n’ala.+ 15  Josef sịrị ha: “Gịnị mere unu ji mee ihe a? Ọ̀ bụ na unu amaghị na nwoke dị ka m na-amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu?”+ 16  Juda zara ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-agwa nna m ukwu? Gịnị ka anyị ga-ekwu? Oleekwa otú anyị ga-esi gosi na anyị bụ ndị ezi omume? Ọ bụ ezi Chineke na-akwụ ndị ohu gị ụgwọ mmehie ha.+ Anyị bụzi ndị ohu nna m ukwu, ma anyịnwa ma onye a hụrụ iko a n’akpa ya.” 17  Ma Josef sịrị: “Agaghị m anwa anwa mee otú a. Ọ bụ onye a hụrụ iko a n’akpa ya ga-abụ ohu m.+ Ma ndị nke ọzọ n’ime unu, lawanụ n’udo lakwuru nna unu.” 18  Juda gara ya nso, sị ya: “Nna m ukwu, m na-arịọ gị arịrịọ. Biko, ka ohu gị gwatụ gị okwu. Ewesala ohu gị iwe, n’ihi na gị na Fero bụ otu.+ 19  Nna m ukwu jụrụ ndị ohu ya, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ? Ùnu nwere nwanne nwoke ọzọ?’ 20  N’ihi ya, anyị zara nna m ukwu, sị, ‘Ee, nna anyị ka nọ ndụ. O meela agadi. Anyị nwekwara nwanne nwoke nke nna anyị mụrụ n’agadi ya, bụ́ ọdụdụ nwa ya.+ Ma onye nne ji ya na ya anwụọla.+ Ọ bụ naanị ya fọrọ n’ime ha,+ nna ya hụkwara ya n’anya.’ 21  Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Kpọtaranụ m ya ka m hụ ya.’+ 22  Ma anyị gwara nna m ukwu, sị, ‘Nwa ahụ agaghị ahapụli nna ya. Nna ya ga-anwụ ma ọ hapụ ya.’+ 23  Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Ọ bụrụ na nwanne unu nke ọdụdụ agaghị eso unu bịa, unu abịakwala ịhụ m ọzọ.’+ 24  “N’ihi ya, anyị lakwuuru ohu gị nna m kọọrọ ya ihe nna m ukwu kwuru. 25  Mgbe e mechara, nna anyị sịrị anyị, ‘Gaghachinụ zụta obere ihe oriri anyị ga-eri.’+ 26  Ma anyị sịrị ya, ‘Anyị agaghị aga. Ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ ga-eso anyị, anyị ga-aga, maka na nwoke ahụ agaghị ekwe ka anyị hụ ya ma ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ esoghị anyị.’+ 27  Ohu gị nna m gwaziri anyị, sị, ‘Unu ma nke ọma na nwunye m mụụrụ m naanị ụmụ nwoke abụọ.+ 28  Ma, otu n’ime ha anọghịzi. M wee sị: “Ọ ga-abụrịrị na anụ ọhịa adọriela ya!”+ Ahụbeghịkwa m ya ruo ugbu a. 29  Ọ bụrụ na unu akpọrọkwa onye nke a pụọ, ihe emee ya, ya anwụọ, unu ga-eme ka obi mgbawa gbuo m.’+ 30  “Ugbu a, ọ bụrụ na mụ edughị nwa a lakwuru ohu gị nna m, ebe ọ bụ na nna m hụrụ nwa a n’anya otú ọ hụrụ onwe ya, 31  ọ ga-anwụ ozugbo ọ hụrụ na nwa a esoghị anyị. Ọ pụtara na ndị ohu gị emeela ka ohu gị nna anyị rugide uju n’isi awọ́ ya nwụọ. 32  Ohu gị kwere nna m nkwa n’ihi nwa a, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ pụtara na emehiela m nna m ruo mgbe ebighị ebi.’+ 33  N’ihi ya, kama nwa a ga-anọ, m na-arịọ ka ohu gị nọrọ ma bụrụ ohu nna m ukwu, ka nwa a wee soro ụmụnne ya laa. 34  Olee otú m ga-esi lakwuru nna m ma ọ bụrụ na nwa a esoghị m? Agaghị m achọ ịhụ ihe ọjọọ ga-eme nna m.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji