Jeremaya 50:1-46

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Babịlọn (1-46)

    • Sinụ na Babịlọn gbapụ (8)

    • A ga-akpọghachite ndị Izrel (17-19)

    • Mmiri ndị dị na Babịlọn ga-ata (38)

    • Babịlọn agaghịzi abụ ebe a ga-ebi ebi (39, 40)

50  E nwere ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo banyere Babịlọn,+ ya bụ, ndị Kaldia. Ọ sịrị:   “Kọọnụ ya ná mba dị iche iche, kọsaakwanụ ya. Gwunyenụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ gbakọta. Kọsaakwanụ ya. Unu ezola ihe ọ bụla ezo. Sịnụ, ‘E wegharala Babịlọn.+ E menyela Bel ihere.+ Ụjọ ejidela Merodak. E menyela arụsị niile dị na Babịlọn ihere. Ụjọ ejidekwala arụsị ya niile na-asọ oyi.’*   N’ihi na otu mba esila n’ebe ugwu bịa lụso ya agha.+ Mba ahụ mere ala ya ihe na-eju ndị mmadụ anya. E nweghịzi onye bi na ya. Ma mmadụ ma anụ ụlọ agbapụchaala. Ha agbafuola.”  Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, ndị Izrel na ndị Juda ga-abụ otu.+ Ha ga-ebere ákwá na-aga.+ Ha ga-ejikọkwa aka na-arịọ Jehova bụ́ Chineke ha ka ọ na-edu ha.+  Ha ga na-ajụ ajụjụ ụzọ e si aga Zayọn. Ha ga-eche ihu n’ụzọ ahụ,+ na-asị, ‘Bịanụ ka anyị na Jehova gbaa ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghịkwa echefu echefu.’+  Ndị m aghọọla ìgwè atụrụ furu efu.+ Ndị na-azụ ha mere ka ha kpafuo.+ Ha du ha na-agagharị n’ugwu dị iche iche. Ha si n’otu ugwu ha agaa n’ugwu ọzọ. Ha echefuola ebe ha na-anọ ezu ike.  Mgbe ndị iro ha hụrụ ha, ha bibiri ha,+ kwuokwa, sị, ‘Ikpe amaghị anyị, n’ihi na ha emehiela Jehova, onye ezi omume si n’aka ya, ya bụ, Jehova, onye ndị nna nna ha ji nwee olileanya.’”   “Sinụ na Babịlọn gbapụ,Sikwanụ n’ala ndị Kaldia pụọ.+ Dịrịnụ ka mkpi ma ọ bụ ebule nke na-ebutere ìgwè ewu ma ọ bụ ìgwè atụrụ ụzọ.   M ga-eme ka ọtụtụ mba ukwu ndị si n’ala dị n’ebe ugwuBịa lụso Babịlọn agha.+ Ha ga-ahazi onwe ha n’usoro lụso ya agha. Ha ga-esi ebe ahụ weghara ya. Akụ́ ha yiri nke onye aghaNke na-agbawa ndị mụrụ ụmụ aka ụmụ,+Nke na-anaghị alọta n’emeghị ihe ọ gara. 10  Kaldia ga-abụ ihe a kwatara n’agha.+ Afọ ga-eju ndị niile ga-akwakọrọ ihe dị n’ime ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 11  “N’ihi na mgbe unu nọ na-ebukọrọ ngwongwo ndị m,+Unu na-aṅụrị ọṅụ,+ na-enwekwa obi ụtọ. N’ihi na unu nọ na-awụgharị ka nwa ehi nke nọ n’ebe ahịhịa dị. Unu nọkwa na-ebe ubé ka oké ịnyịnya. 12  E menyere nne unu ihere.+ E mechuru nwaanyị mụrụ unu ihu. Mba niile kacha ya. Ọ bụ ala ịkpa mmiri na-adịghị, bụrụkwa ọzara.+ 13  Mmadụ agaghị ebi n’ime ya n’ihi iwe Jehova.+ Ọ ga-atọgbọrọ nkịtị.+ Onye ọ bụla na-agafe Babịlọn ga-ekporopụ anya na-ele ya Ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ọdachi niile dakwasịrị ya.+ 14  Ndị niile na-ekwe ụta,Hazienụ onwe unu n’usoro, si n’akụkụ niile lụso Babịlọn agha. Gbaanụ ya ụta. Unu agbafọkwala akụ́ ọ bụla,+N’ihi na ọ bụ Jehova ka o mehiere.+ 15  Sinụ n’akụkụ niile tie mkpu agha ka a lụso ya agha. Ọ chịliela aka elu. Ogidi ya niile adaala. A kwatuola mgbidi ya niile.+ Ọ bụ otú Jehova si kwụọ ya ụgwọ ihe o mere.+ Megwaranụ ya. Meenụ ya ihe o mere ndị ọzọ.+ 16  Gbuonụ onye na-agha mkpụrụ na BabịlọnNakwa onye ji mma na-ewe ihe ubi.+ Onye ọ bụla ga-alakwuru ndị ya, onye ọ bụla ga-agbalakwa n’ala ya,N’ihi na onye iro ji mma agha na-egbu ndị mmadụ n’emeghị ebere.+ 17  “Ndị Izrel bụ ìgwè atụrụ a chụsasịrị achụsasị.+ Ọ bụ ọdụm chụsasịrị ha.+ Eze Asiria bu ụzọ rie anụ ha,+ Nebukadneza* eze Babịlọn atazie ọkpụkpụ ha.+ 18  N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: ‘M ga-emesi eze Babịlọn na ndị obodo ya ike, otú ahụ m mere eze Asiria.+ 19  M ga-akpọghachite Izrel n’ala ya ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.+ Izrel ga-atakwa ahịhịa n’ugwu Kamel nakwa na Beshan.+ Afọ ga-ejukwa ya* n’ugwu ndị dị n’Ifrem+ nakwa n’ugwu ndị dị na Gilied.’”+ 20  Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ,A ga-achọ ebe Izrel si mehie,Ma a gaghị ahụ. A gaghịkwa ahụ ebe Juda si mehie,N’ihi na m ga-agbaghara ndị m hapụrụ ka ha dịrị ndụ.”+ 21  Jehova kwuru, sị, “Lụso ndị bi na Merateyim na ndị bi na Pikọd agha.+ Ka e gbuchapụ ha, laakwa ha n’iyi. Mee ihe niile m gwara gị mee. 22  A na-anụ mkpọtụ agha n’ala a,Ya bụ, mkpọtụ ọdachi dị egwu. 23  A gbajiela hama na-akụri mba dị iche iche n’ụwa, laakwa ya n’iyi.+ Ihe e mere Babịlọn na-eju mba dị iche iche anya.+ 24  Babịlọn, m siiri gị ọnyà, ya ama gị. Ma ị maghị. A chọtara gị ma jide gị,+N’ihi na ọ bụ Jehova ka ị lụsoro ọgụ. 25  Jehova emegheela ebe ọ na-akwasa ngwá agha. O bupụtakwala ngwá agha o ji egosi na iwe ji ya.+ N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,Nwere ọrụ ọ ga-arụ n’ala ndị Kaldia. 26  Sinụ ebe dị anya bịa lụso ya agha.+ Megheenụ ebe ọ na-echekwa mkpụrụ.+ Chịkọtanụ ihe ya ndị unu chịịrị otú e si achịkọta ọka. Bibienụ ya kpamkpam.+ Ya enwekwala onye ga-afọdụ n’obodo ya. 27  Gbuonụ oké ehi ya niile.+ Ka e gbuo ha niile. Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ụbọchị ha ga-aza ajụjụ eruola,Ya bụ, oge a ga-elebara ha anya. 28  A na-anụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ,Ya bụ, ndị si n’ala Babịlọn na-agbapụ,Na-agbaga Zayọn ka ha kọsaa na Jehova bụ́ Chineke anyị atawala ndị iro ya ahụhụ. Ọ na-ata ha ahụhụ n’ihi ụlọ nsọ ya.+ 29  Kpọkọọnụ ndị na-agba ụtaNa ndị niile na-ekwe ụta ka ha lụso Babịlọn agha.+ Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Unu ekwekwala ka onye ọ bụla si na ya gbapụ. Kwụọnụ ya ụgwọ ihe o mere.+ Meenụ ya ihe niile o mere ndị ọzọ.+ N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,Ka ọ na-egosi na ya dị mpako.+ 30  N’ụbọchị ahụ, ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche.+ A ga-egbukwa ndị agha ya niile.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 31  Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwukwara, sị, “Onye mpako,+ m ga-ata gị ahụhụ,+N’ihi na ụbọchị m ga-elebara gị anya ga-abịa, ya bụ, oge m ga-eme ka ị zaa ajụjụ ihe i metara. 32  Onye mpako, ị ga-ada, daruo ala. E nweghịkwa onye ga-ekulite gị.+ M ga-esunye obodo gị ọkụ. Ọ ga-erepịakwa obodo niile ị na-achị.” 33  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “A na-emegbu ndị Izrel na ndị Juda. Ndị niile dọọrọ ha n’agha ekweghị ahapụ ha.+ Ha ekweghị ahapụ ha ka ha laa.+ 34  Ma, Onye Mgbapụta ha dị ike.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+ Ọ ga-ekpechite ọnụ ha,+Iji mee ka udo dị n’ala ha,+Meekwa ka ndị bi na Babịlọn maa jijiji.”+ 35  Jehova kwukwara, sị, “A ga-eji mma agha gbuo ndị KaldiaNa ndị bi na Babịlọn, ndị isi ha, na ndị ha ma ihe.+ 36  A ga-eji mma agha gbuo ndị na-etu ọnụ.* Ha agaghịkwa ama ihe ha na-eme eme. A ga-eji mma agha gbuo ndị agha Babịlọn, ụjọ ga-ejidekwa ha.+ 37  A ga-eji mma agha gbuo ịnyịnya ha, bibiekwa ụgbọ ịnyịnya agha ha,Gbuokwa ndị niile si ebe dị iche iche nọ n’ime ya. Ha ga-adịkwa ka ụmụ nwaanyị.+ A ga-eji mma agha bibie akụ̀ ya, bukọrọkwa ya.+ 38  A ga-ala mmiri niile dị na Babịlọn n’iyi, ha ataa.+ N’ihi na ọ bụ ala arụsị a pịrị apị juru.+ Ha na-emekwa ara ara n’ihi ọhụụ na-emenye ụjọ ha na-ahụ. 39  N’ihi ya, anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara na anụ ndị na-agbọ ụja ga-ebikọ. Enyí nnụnụ ga-ebikwa na Babịlọn.+ Mmadụ agaghịzi ebi na ya. Ọ gaghịkwa abụ ebe a ga-ebi ebi n’ọgbọ niile.”+ 40  Jehova kwuru, sị, “Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra+ na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na Babịlọn.+ 41  E nwere ndị si n’ebe ugwu na-abịa. A ga-emekwa ka otu nnukwu mba na ndị eze ndị dị ebube+Si n’ime ime ụwa kpara ike na-apụta.+ 42  Ha ma otú e si agba ụta na otú e si atụ árọ̀.+ Obi tara ha mmiri. Ha agaghịkwa eme ebere.+ Ha gbara ịnyịnya ha na-aga,Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri na-eme n’oké osimiri.+ Babịlọn,* ha agbakọọla aka, haziekwa onwe ha n’usoro ịlụso gị agha.+ 43  Eze Babịlọn anụla akụkọ ha,+Obi awụnye ya n’afọ.+ Ezigbo ụjọ ejidela ya. Ahụ́ na-egbukwa ya mgbu ka nwaanyị na-amụ nwa. 44  “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta, ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa na Babịlọn. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya.+ Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 45  N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Babịlọn,+ na ihe o bu n’obi ime ala ndị Kaldia. N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha. Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+ 46  Mgbe a ga-eweghara Babịlọn, ụwa ga-ama jijiji. A ga na-anụkwa mkpu ákwá ndị mmadụ na-eti ná mba dị iche iche.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ndị amụma ụgha.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”