Jeremaya 51:1-64

  • E buru amụma ihe ga-eme ndị Babịlọn (1-64)

    • Ndị Midia ga-emeri Babịlọn na mberede (8-12)

    • A tụbara akwụkwọ n’Osimiri Yufretis (59-64)

51  Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka ifufe na-emebi iheFee na Babịlọn,+ feekwa ndị bi na Leb-kemaị.*   M ga-ezi ndị na-afụcha ihe ka ha gaa Babịlọn. Ha ga-afụcha ya, meekwa ka ala ya tọgbọrọ nkịtị. Ha ga-esi ebe niile lụso ya agha n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya.+   Ndị na-agba ụta na Babịlọn agaghị agba ụta ha. Ndị agha ha agaghịkwa eji ngwá agha ha bilie ọtọ. Unu emerela ụmụ okorobịa ha ebere.+ Bibienụ ndị agha ha niile.   A ga-egbu ha n’ala ndị Kaldia. A ga-emerụkwa ha ezigbo ahụ́ n’okporo ámá ha dị iche iche.+   N’ihi na ndị Izrel na ndị Juda adịghị ka nwaanyị isi mkpe. Jehova nke ụsụụ ndị agha ahapụbeghị ha.+ Ma n’anya Onye Nsọ Izrel, ikpe mara ndị Kaldia.*   Sinụ na Babịlọn gbapụ. Zọọnụ onwe unu ndụ.*+ Ka a ghara igbu unu n’ihi mmehie Babịlọn. N’ihi na ọ bụ oge Jehova ga-emegwara ya ihe o mere ndị ọzọ. Ọ ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere.+   Babịlọn bụ iko ọlaedo Jehova bu n’aka. Ọ na-eme ka mmanya gbuwe mba niile. Mba dị iche iche aṅụọla mmanya dị n’ime ya.+ Ọ bụ ya mere ha ji na-eme ara ara.+   Babịlọn adaala na mberede, kụọ righirighi.+ Besierenụ ya ákwá ike.+ Werenụ mmanụ balsam a ga-ete ya maka ahụ́ na-egbu ya mgbu. Ikekwe, a ga-agwọta ya.”   “Anyị gbara mbọ ka anyị gwọọ Babịlọn, ma o kweghị ngwọta. Hapụnụ ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị lawa n’ala ya.+ N’ihi na mmehie a ga-eji ekpe ya ikpe eruola eluigwe. O ruola n’ígwé ojii.+ 10  Jehova ekpeerela anyị ikpe ziri ezi.+ Bịanụ ka anyị gaa na Zayọn kọọ gbasara ihe Jehova bụ́ Chineke anyị rụrụ.”+ 11  “Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta unu dị okirikiri. Jehova emeela ka ịga agha dịrị n’obi ndị eze ndị Midia,+N’ihi na o bu n’obi ibibi Babịlọn. Otú a ka Jehova chọrọ isi taa ndị iro ya ahụhụ n’ihi ụlọ nsọ ya. 12  Gwunyenụ ihe ndị agha ga-eji amata ebe ha ga-agbakọ+ kwatuo mgbidi Babịlọn. Chesienụ nche ike. Dowenụ ndị nche. Meenụ ka e nwee ndị ga-ezoro ezoro lụso Babịlọn agha. Jehova echepụtala ihe ọ ga-eme ya. Ọ ga-emekwa ndị bi na Babịlọn ihe o kwuru ọ ga-eme ha.”+ 13  “Nwaanyị nke bi n’ọtụtụ mmiri,+Nke nwekwara akụ̀ hiri nne,+Nke gị agwụla. Ị gaghịzi enweta uru ị na-enweta.+ 14  Jehova nke ụsụụ ndị agha ejirila onwe ya* ṅụọ iyi, sị,‘M ga-eme ka ndị mmadụ ju n’ime gị ka igurube. Ha ga-eti mkpu, na-enwe aṅụrị na ha emeriela gị.’+ 15  Ọ bụ Chineke ji ike ya kee ụwa,Jiri amamihe ya mee ka elu ala sie ike,+Jirikwa amamihe* ya gbasaa eluigwe ka ákwà.+ 16  Olu ya na-emeKa mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ. Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu. Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.* Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+ 17  Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche nakwa ka onye na-amaghị ihe. Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ. Ha anaghịkwa eku ume.*+ 18  Ha na-emegharị mmadụ anya,*+ na-atọkwa ọchị. N’oge Chineke ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi. 19  Chineke* nke Jekọb adịghị ka arụsị ndị a,N’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile. Izrel bụkwa mkpara ya.*+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.”+ 20  “Ị bụ okpiri m ji alụ agha,N’ihi na m ga-eji gị kụrie mba dị iche iche. M ga-ejikwa gị laa alaeze dị iche iche n’iyi. 21  M ga-eji gị kụrie ịnyịnya na onye na-agba ya. M ga-eji gị kụrie ụgbọ ịnyịnya e ji alụ agha na onye na-agba ya. 22  M ga-eji gị kụrie nwoke na nwaanyị. M ga-eji gị kụrie agadi nwoke na nwatakịrị nwoke. M ga-eji gị kụrie nwa okorobịa na nwa agbọghọ. 23  M ga-eji gị kụrie onye na-azụ atụrụ na ìgwè atụrụ ya. M ga-eji gị kụrie onye ọrụ ubi na anụ ndị o ji akọ ihe. M ga-eji gị kụrie ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị. 24  M ga-anọ n’ihu unu kwụọ Babịlọn na ndị niile bi na KaldiaỤgwọ ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 25  Jehova kwukwara, sị, “Ugwu na-ebibi ihe, nke bibiri ụwa niile,+M ga-emesi gị ike.+ M ga-eweli aka m taa gị ahụhụ. M ga-esi n’elu nkume dị elu kwapụ gị,Meekwa ka ị dị ka ugwu gbara ọkụ.” 26  “Ndị mmadụ agaghịzi na-eji nkume e si na gị wapụta mere nkume ji ụlọ ma ọ bụ nkume e ji atọ ntọala,N’ihi na ị ga-atọgbọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 27  “Gwunyenụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ gbakọta.+ Fụọrọnụ mba dị iche iche opi. Gwanụ mba dị iche iche* ka ha lụso ya* agha. Kpọkọtanụ alaeze Ararat,+ alaeze Minaị na nke Ashkenaz+ ka ha lụso ya agha. Họpụtanụ ọchịagha ga-alụso ya agha. Meenụ ka ịnyịnya ju ebe niile ka ìgwè igurube. 28  Gwanụ mba dị iche iche* ka ha lụso ya agha,Ma ndị eze Midia+ ma ndị gọvanọ ya ma ndị niile na-esote onye na-achị achị na MidiaMa obodo niile ha na-achị. 29  Ụwa ga-ama jijijiN’ihi na Jehova ga-eme ihe o bu n’obi ime Babịlọn. O bu n’obi ime Babịlọn ihe ga-eju ndị mmadụ anya, ka a gharakwa inwe onye ga-ebi na ya.+ 30  Ndị agha Babịlọn akwụsịla ịlụ agha. Ha nọ ọdụ n’ebe ndị ha rụsiri ike. Ike agwụla ha.+ Ha dịzi ka ụmụ nwaanyị.+ A gbaala ụlọ niile dị na Babịlọn ọkụ. A gbajisiela ihe ndị e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá ya.+ 31  Otu onye ozi na-agbakwuru onye ozi ibe ya. Ndị na-akọ ihe merenụ gbakwa ọsọ na-aga,Ka ha kọọrọ eze Babịlọn na e sila n’akụkụ niile weghara obodo ya,+ 32  Nakwa na e wegharala ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe mmiri ya,+Gbaakwa ụgbọ mmiri ya niile e ji ahịhịa papaịrọs rụọ ọkụ,Nakwa na ụjọ ejidela ndị agha ya.” 33  N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Babịlọn* dị ka ebe a na-azọcha ọka. Oge eruola ka a zọsie ya ụkwụ ike. Oge a ga-ewe ya otú e si ewe ihe ubi eruola eruo.” 34  “Nebukadneza* eze Babịlọn adọriela m.+ O meela m ka m ghara ịma ihe m na-eme eme. O meela ka m dịrị ka okpokoro ite. O loola m otú nnukwu agwọ si elo ihe.+ O riela ihe ndị dị mma m nwere, rijuokwa afọ. Ọ ṅachapụla m. 35  Onye bi na Zayọn na-ekwu, sị, ‘Ka ahụ́ e merụrụ m dịrị n’isi Babịlọn.’+ Jeruselem na-ekwukwa, sị, ‘Ka ọbara m dịrị n’isi ndị bi na Kaldia.’” 36  N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: “M ga-ekpechite ọnụ gị.+ M ga-emegwara onye iro gị ihe o mere gị.+ M ga-eme ka oké osimiri ya na olulu mmiri ya taa.+ 37  Babịlọn ga-aghọ ikpo nkume,+Ọgba nkịta ọhịa,+Ihe na-awụ akpata oyi na ihe a na-afụrụ mkpọrọhịhị. A gaghịkwa enwe onye ga-ebi na ya.+ 38  Ha niile ga-agbọ ụja ka ọdụm. Ha ga-abakwa mba ka ụmụ ọdụm.” 39  Jehova kwuru, sị, “Mgbe obi dị ha ụtọ, m ga-emere ha oriri, meekwa ka mmanya gbuwe ha,Ka ha wee na-aṅụrị ọṅụ.+ Ha ga-arahụ ụra ha na-agaghị eteta eteta. Ha agaghị eteta ruo mgbe ebighị ebi.”+ 40  “M ga-akpụrụ ha otú e si akpụrụ nwa atụrụ aga ebe a ga-egbu ya,Nakwa otú e si akpụrụ ebule na ewu aga ebe a ga-egbu ha.” 41  “E wegharala Shishak.*+ E wegharala obodo ụwa niile na-eto.+ Otú Babịlọn dịzi na-eju mba niile anya. 42  Oké osimiri erikpuola Babịlọn. Ebili mmiri nke na-eme na ya ekpuchiela ya. 43  Mmiri adịghịzi n’obodo ya dị iche iche. Ha bụzi ọzara. Otú ha dị na-ejukwa ndị mmadụ anya. Mmadụ agaghị ebi na ha. E nweghịkwa onye ga-esi na ha na-agafe.+ 44  M ga-elebara Bel a na-efe na Babịlọn anya.+ M ga-esi n’ọnụ ya wepụta ihe o loro.+ Mba dị iche iche agaghịzi na-enubata na Babịlọn ife Bel. Mgbidi Babịlọn ga-adakwa.+ 45  Ndị m, sinụ na Babịlọn pụta,+ Gbapụnụ+ ka Jehova ghara iji iwe ya dị ọkụ gbuo unu.*+ 46  Obi amapụla unu, unu atụkwala ụjọ n’ihi akụkọ unu ga-anụ n’ala a. Unu ga-anụ otu akụkọ n’afọ a,N’afọ ọzọ, unu anụ akụkọ ọzọ. Akụkọ ahụ bụ gbasara tigbuo zọgbuo dị n’ala a nakwa gbasara otú otu onye na-achị achị si alụso onye ọzọ na-achị achị agha. 47  N’ihi ya, oge na-abịa mgbe m ga-elebara arụsị a pịrị apịNdị dị na Babịlọn anya. A ga-emenye ala ya niile ihere. Ndị ya niile e gburu egbu ga-atọgbọrọkwa ebe niile na Babịlọn.+ 48  Eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime haGa-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọdịda Babịlọn,+N’ihi na ndị na-ebibi ihe ga-esi n’ebe ugwu bata na ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 49  “Ọ bụghị naanị na ọ bụ Babịlọn mere ka e gbuo ndị Izrel,+Kamakwa, ọ bụ na Babịlọn ka a nọ gbuo ndị niile e gburu egbu n’ụwa. 50  Ndị gbanahụrụ mma agha, na-aganụ. Unu eguzola otu ebe.+ Nọrọnụ ebe dị anya cheta Jehova. Ka Jeruselem batakwa unu n’obi.”+ 51  E menyere anyị ihere, n’ihi na anyị anụla mkparị a kparịrị anyị. E mechuola anyị ihu,N’ihi na ndị ala ọzọ* abatala n’ebe ndị dị nsọ n’ụlọ Jehova mebisie ihe.”+ 52  Jehova kwuru, sị, “N’ihi ya, oge na-abịa mgbe m ga-elebaraArụsị ya a pịrị apị anya. Ndị e merụrụ ahụ́ ga na-asụkwa ude n’ala ya niile.”+ 53  “Ọ bụrụgodị na Babịlọn arịgoo n’eluigwe,+Ọ bụrụgodị na ọ rụsie ụlọ elu ya dị iche iche ike,M ga-edunye ndị ga-aga bibie ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 54  “Geenụ ntị. A na-eti mkpu ákwá na Babịlọn.+ A na-anụ ụzụ nnukwu ọdachi n’ala ndị Kaldia,+ 55  N’ihi na Jehova na-ebibi Babịlọn. Ọ ga-akwụsị mkpọtụ ọ na-eme. Ụzụ ndị iro ya na-eme ga-adị ka ebili mmiri. A ga na-anụkwa ụda olu ha. 56  N’ihi na onye na-ebibi ihe ga-alụso Babịlọn agha.+ A ga-ejide ndị agha Babịlọn,+Gbajisiekwa ụta ha,N’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-akwụ onye ọ bụla ụgwọ kwesịịrị ya.+ Ọ ga-akwụrịrị onye ọ bụla ụgwọ ihe o mere.+ 57  M ga-eme ka mmanya gbuwe ma ndị isi ya ma ndị ya ma ihe,+Ma ndị gọvanọ ya ma ndị ya na-esote onye na-achị achị ma ndị agha ya. Ha ga-arahụ ụra ha na-agaghị eteta eteta. Ha agaghị eteta ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a. 58  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị: “A ga-akwada mgbidi Babịlọn n’agbanyeghị na ọ dị igbidi.+ A ga-agbakwa ọnụ ụzọ ámá ya ọkụ n’agbanyeghị na ọ dị elu. Ndị dị iche iche ga-arụgbu onwe ha n’ọrụ na nkịtị. Ọkụ ga-agbakwa ihe mba dị iche iche ji maka ya rụgbuo onwe ha n’ọrụ.”+ 59  E nwere ihe Jeremaya onye amụma gwara Seraya nwa Neraya nwa Masaya ka o mee.+ Ọ gwara ya ihe a mgbe Seraya so Zedekaya bụ́ eze Juda gaa Babịlọn n’afọ nke anọ n’ọchịchị Zedekaya. N’oge ahụ, ọ bụ Seraya na-elekọta ihe niile eze nwe. 60  Jeremaya dere ọdachi niile ga-adakwasị Babịlọn n’otu akwụkwọ. Ihe niile o dere bụ ihe ga-eme Babịlọn. 61  Jeremaya gwakwara Seraya, sị: “I ruo Babịlọn, gụpụtara ha ihe a niile. 62  Kwuokwa, sị, ‘Jehova, i kwuru na a ga-ebibi obodo a ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ gharazie ibi na ya. I kwukwara na ọ ga-atọgbọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.’+ 63  Ị gụpụtachaara ha ihe dị n’akwụkwọ a, kegide ya na nkume, tụbakwa ya n’etiti Osimiri Yufretis. 64  Kwuzie, sị, ‘Otú a ka Babịlọn ga-esi mie ala. Ọ gaghịkwa apụta ọzọ+ n’ihi ọdachi Chineke ga-eme ka ọ dakwasị ya. Ike ga-agwụkwa ndị bi na ya.’”+ Ebe a ka ihe Jeremaya kwuru gwụrụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O yiri ka Leb-kemaị bụ aha a na-akpọ Kaldia ma a chọọ imegharị mmadụ anya.
Na Hibru, “ikpe mara ala ha.”
Ma ọ bụ “Zọọnụ mkpụrụ obi unu ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “nghọta.”
Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-emeghekwara mmiri ozuzo ụzọ.”
Ma ọ bụ “Ha adịghịkwa ndụ.”
Ma ọ bụ “Ha enweghị isi.”
Na Hibru, “Òkè.”
Na Hibru, “mkpara o ketara.”
Na Hibru, “Doonụ mba dị iche iche nsọ.”
Ya bụ, Babịlọn.
Na Hibru, “Doonụ mba dị iche iche nsọ.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
O yiri ka Shishak bụ aha a na-akpọ Babel (ya bụ, Babịlọn) ma a chọọ imegharị mmadụ anya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “ndị si esi bịa.”