Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?
“Achọrọ m ịdị ka ụmụ akwụkwọ ibe m. Echere m na ọ bụ ya mere m ji mụta ịkpọ iyi.”—Melanie. *
“N’oge ahụ, echeghị m na e nwere oké ihe ọjọọ dị n’ịkpọ iyi. M na-anụ ka ndị mmadụ na-akpọ iyi mgbe niile—ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ anyị.”—David.
OLEE ihe mere o ji abụ ndị toro eto kpọọ mmadụ iyi, ma ọ bụ kwuo okwu rere ure, ndị mmadụ anaghị akpọkarị ya ihe ọjọọ, ma, onye na-eto eto mee ya, e lewe ya anya dị ka ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́? Ọ̀ bụ afọ ndụ mmadụ na-ekpebi ma onye ahụ ò kwesịrị ịdị na-akpọ iyi? Ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ na-ekwu okwu rere ure—ebe ọ bụkwa na a na-ele nke ndị toro eto kwuru anya dị ka ihe ọ na-enweghị ihe ọ bụ ma na-akatọ nke ndị na-eto eto kwuru—i nwere nnọọ ike ịjụ, sị, “Olee oké ihe ọjọọ dị n’ịkpọ iyi?”
Otú E Si Amụta Okwu Ọjọọ
O doro anya na ọtụtụ mmadụ na-akpọ iyi. N’ezie, ụfọdụ ndị na-eto eto na-ekwu na a sị na a na-akwụ ha otu naịra maka okwu ọ bụla rere ure ha nụrụ n’ụlọ akwụkwọ, na ọ gaghị adị ha mkpa ịga rụwa ọrụ ego, na ndị mụrụ ha nwekwara ike ịkwụsị ọrụ. Eve, bụ́ nwata nwaanyị dị afọ iri na ise kwuru, sị: “Gị na ụmụ klas m kwurịta okwu ruo nwa oge, ha ga-ekwu okwu rere ure ugboro ugboro n’otu ahịrịokwu. Ọ bụrụ na ị na-anụ ụdị okwu ndị ahụ mgbe ọ bụla, ọ ga-esiri gị ike ịghara iso na-ekwu ya.”
Ndị na-akpọ iyi hà gbara gị gburugburu dị ka ha gbara Eve? Ị̀ mụtala ịkpọ iyi? * Ya bụrụ otú ahụ, chetụgodị echiche banyere ihe na-akpali gị ịkpọ iyi. Ozugbo ị chọpụtara ihe ọ bụ, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịkwụsị ya.
Buru nke a n’obi zaa ajụjụ ndị a.
Olee ihe na-akasị eme ka ị kpọọ iyi?
□ Iji gosi na iwe ji m
□ Iji mee ka ndị mmadụ mara na m nọ
□ Iji dị ka ndị ọgbọ m
□ Iji mee ka a tụwa m ụjọ
□ Iji maa ndị isi aka
□ Ihe ọzọ ․․․․․
Olee ebe ị na-akpọkarị iyi?
□ N’ụlọ akwụkwọ
□ N’ebe ọrụ
□ N’ozi e-mail, mgbe mụ na ndị ọzọ ji kọmputa na-ezirịta ozi, ma ọ bụ mgbe m ji ekwe ntị m na-edegara mmadụ ihe
□ Mgbe m nọ naanị m
Olee ihe ị na-ekwu iji gọpụrụ onwe gị?
□ Ndị ọgbọ m na-eme ya
□ Ndị mụrụ m na-eme ya
□ Ndị nkụzi m na-eme ya
□ Ndị na-eme egwuregwu na-ekwukarị ya
□ Ọ dịghị oké ihe ọ bụ—ọ bụ okwu nkịtị
□ M na-akpọ iyi naanị mgbe mụ na ndị na-adịghị ele ya anya dị ka ihe ọjọọ nọ
□ Ihe ọzọ ․․․․․
Oleedị ihe mere mmadụ ga-eji chọwa ịkwụsị ịkpọ iyi? Ịkpọ iyi ọ̀ dị oké njọ? Tụlee ihe ndị a.
Ọ bụghị okwu nkịtị. Jizọs kwuru, sị: “Okwu gị na-egosi ihe dị gị n’obi.” (Luk 6:45, Contemporary English Version) Buru n’uche na okwu anyị anaghị egosi naanị ụdị onye anyị ga-achọ ịbụ—ọ na-egosi ụdị mmadụ anyị bụ ugbu a. Ya bụrụgodị na ị na-ekwu okwu ọjọọ naanị n’ihi na ndị ọzọ na-ekwu ya, iṅomi ha na-egosi na ị ‘na-esonye ìgwè mmadụ,’ nakwa na ị naghị emere onwe gị mkpebi.—Ọpụpụ 23:2.
Ma ọ bụghị naanị nke ahụ. James V. O’Connor, bụ́ onye ọkachamara n’asụsụ, kwuru, sị: “Ndị na-akpọ iyi na-abụkarị ndị na-adịghị ekwe ekwe, ndị nkatọ, ndị ihe ndị ọzọ mere na-anaghị eju afọ, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị na-arụ ụka, ndị obi na-ajọ njọ mgbe niile, na ndị na-eme mkpesa.” Dị ka ihe atụ, ndị na-akpọ iyi mgbe ọ bụla ihe gajọrọ na-egosi na ha chere na ihe ga na-agazi agazi mgbe niile. Ọ dị nnọọ ka hà anatụghịdị achọ ka e nwee ihe e mehiere. O’Connor kwuru na n’aka nke ọzọ, ndị na-adịghị akpọ iyi “na-adịkarị nwayọọ, . . . ha na-abụkarị ndị tozuru okè bụ́ ndị [nwere ike] idi iwe a na-akpasu ha kwa ụbọchị.” Olee ụdị onye ị ga-achọ ịbụ?
Ịkpọ iyi na-emebi aha gị. Dị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto, o nwere ike ịbụ na ị na-achọ ịdị mma n’anya. Ị chọrọ ka ọdịdị gị na-amasị ndị mmadụ. Ma, ị̀ maara na otú i si ekwu okwu nwere ike imetụta ndị ọzọ karịa otú ị dị n’anya? Nke bụ́ eziokwu bụ na okwu ọnụ gị nwere ike ikpebi ihe ndị dị ka
▪ Ndị ga-achọ imete gị enyi.
▪ Ma à ga-ewere gị n’ọrụ ma ọ bụ na a gaghị ewere gị.
▪ Otú a ga na-akwanyeruru gị ùgwù.
N’eziokwu, ihe mbụ ndị mmadụ chere banyere anyị n’ihi ọdịdị anyị na-agbanwekarị mgbe anyị malitere ikwu okwu. O’Connor kwuru, sị: “O nwetụghị otú ị ga-esi amata enyi ndị ọhụrụ ị gaara emete, ma ọ bụ ugboro ole i mere ka mmadụ gbaara gị ọsọ ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ gharazie ịkwanyere gị ùgwù otú ha sibu akwanyere gị n’ihi okwu ọjọọ i kwuru.” Olee ihe nke ahụ kụziiri gị? Na ọ bụrụ na ị na-ekwu okwu rụrụ arụ, ọ bụ onwe gị ka ị na-emebiri ihe.
Ịkpọ iyi na-egosi na ị naghị akwanyere Onye nyere anyị ikike ikwu okwu ùgwù. Ka e were ya na i nyetụrụ enyi gị uwe. Olee otú ọ ga-adị gị ma ị hụ ka enyi gị ji uwe ahụ mere nkịrịka ákwà? Chezienụ echiche otú ọ ga-adị Onye kere anyị mgbe anyị ji ire o nyere anyị na-ekwu okwu ọjọọ. Ka a sịkwa ihe mere Okwu Chineke ji kwuo, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:31.
Ị hụlanụ na e nwere ezi ihe mere i kwesịrị iji kwụsị ịkpọ iyi. Ọ bụrụkwanụ
na ọ marala gị ahụ́, olee otú ị pụrụ isi kwụsị ya?Nke Mbụ: Ghọta na ọ dị gị mkpa ịgbanwe. O yighị ka ị̀ ga-akwụsị ịkpọ iyi ruo mgbe ị ghọtara uru ọ ga-abara gị ime otú ahụ. Olee ihe ndị dị n’okpuru ebe a bụ́ ndị ga-akpali gị ịkwụsị ịkpọ iyi?
□ Ime ka obi tọọ Onye nyere m ikike ikwu okwu ụtọ
□ Ime ka ndị ọzọ kwanyewekwuoro m ùgwù
□ Ịmụta okwu ndị ọhụrụ
□ Ime ka àgwà m ka mma
Nke Abụọ: Chọpụta ihe na-akpali gị ịkpọ iyi. Melanie kwuru, sị: “Ịkpọ iyi mere ka ndị mmadụ na-atụ m ụjọ. Achọghị m mmadụ ịkparị m. Achọrọ m ka ndị ọzọ na-asọpụrụ m, chọọkwa ịdị na-abara ndị mmadụ mba otú ndị enyi m niile na-eme.”
Gịnwakwanụ? Isi ihe ga-enyere gị aka ịkwụsị ịkpọ iyi bụ ịghọta ihe na-eme gị ikwu ụdị okwu ahụ. Dị ka ihe atụ, ya bụrụ na ị na-akpọ iyi n’ihi na onye ọ bụla na-eme ya, i kwesịrị ịmụta ijidesi ezi àgwà ndị i nwere ike. Iji ezi àgwà ndị i nwere anya isi bụ nnọọ ihe dị mkpa na-egosi na ị topụtawala ogo mmadụ—ọ ga-enyekwara gị nnọọ aka ịkwụsị ịkpọ iyi.
Nke Atọ: Chọta ụdị okwu ndị ọzọ ị ga na-ekwu. Ọ bụghị naanị ijisi onwe gị ike ịghara ikwu okwu ọjọọ. Otu n’ime ihe ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ikwu okwu ọjọọ bụ iyiri “mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Efesọs 4:22-24) Nke ahụ ga-enyere gị aka ijidekwu onwe gị, meekwa ka ị na-akwanyere ma onwe gị ma ndị ọzọ ùgwù.
Amaokwu Baịbụl ndị a ga-enyere gị aka iyiri mmadụ ọhụrụ—ma nọgide na-eyi ya.
Ndị Kọlọsi 3:2: “Na-atụkwasịnụ uche n’ihe ndị dị n’elu.”
Ihe ọ pụtara: Zụọ uche gị ịdị na-eche banyere ihe ndị ziri ezi. Ihe ị na-eche n’echiche ga-ekpebi ihe ị ga-ekwu.
Ilu 13:20: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”
Ihe ọ pụtara: I nwere ike ịmụta ikwu okwu dị ka ndị enyi gị.
Abụ Ọma 19:14: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova.”
Ihe ọ pụtara: Jehova na-ahụ ihe anyị ji ire o nyere anyị na-ekwu.
Ị̀ chọkwuru enyemaka? I jirikwanụ chaatị ahụ dị n’elu lee otú ị na-eme site n’idetu ugboro ole i kwuru okwu ọjọọ? O nwere ike iju gị anya otú ị ga-esi kwuwekwuo okwu ndị dị mma n’oge na-adịghị anya!
Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.
^ par. 8 E nwere ezi ihe mere Ndị Kraịst ga-eji zere okwu rere ure, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”—Ndị Efesọs 4:29; Ndị Kọlọsi 4:6.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Olee otú ịkpọ iyi nwere ike isi metụta
▪ ụdị ndị ga-achọ ịbụ ndị enyi gị?
▪ ma à ga-ewere gị n’ọrụ?
▪ otú ndị ọzọ ga-esi na-ele gị anya?
[Chaatị dị na peeji nke 21]
MATA OTÚ Ị NA-EME
Monday Tuesday Wednesday Thursday Friday Saturday Sunday
Izu nke 1 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․
Izu nke 2 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․
Izu nke 3 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․
Izu nke 4 ․․․․․․ ․․․․․․․ ․․․․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․ ․․․․․․․․ ․․․․․․
[Foto dị na peeji nke 20]
Ị gaghị eji onyinye i ji kpọrọ ihe gwurie egwú. Olee ihe mere ị ga-eji jiri onyinye nke ikwu okwu gwurie egwú?