Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Chineke Egbubeghị Ekwensu?

Gịnị Mere Chineke Egbubeghị Ekwensu?

Echiche Baịbụl

Gịnị Mere Chineke Egbubeghị Ekwensu?

A SỊ na ị ga-emeli ka onye na-ata ahụhụ kwụsị ịta ahụhụ, ị̀ ga-eme ya? Ndị mmadụ na-agbaga n’ebe e nwere ọdachi ndị na-emere onwe ha ka ha nwee ike nyere ndị ha na-amaghịdị aka, ma ọ bụdị zọpụta ndị nke nọ n’ọnụ ọnwụ. N’ihi nke a, mmadụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnịdị mere Chineke egbubeghị Ekwensu, onye na-akpatara ụmụ mmadụ ahụhụ niile ha na-ata?’

Iji zaa ajụjụ ahụ otú ọ ga-edo anya, were ya na e nwere okwu a na-ekpe n’ụlọ ikpe nke ọtụtụ ndị ma banyere ya. Okwu ahụ bụ maka onye gburu mmadụ. Ebe ọ bụ na onye ahụ ma na ikpe ga-ama ya, ọ chọrọ ka a kwụsị ikpe ahụ. Ọ malitere ikwu na otú ọkàikpe okwu ahụ dị n’aka si ekpe ikpe ahụ adịghị mma, na-ekwudị na ọkàikpe ahụ enyela ndị ọkàiwu so n’ikpe ahụ aka azụ. N’ihi nke a, ọ dị mkpa na a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-abịa gbaa akaebe n’okwu ahụ.

Ọ bụ eziokwu na ọkàikpe ahụ ga-achọ ka ikpe ahụ gwụ ngwa ngwa, ọ maara na ebe ọ bụ na a ga-enwe ọtụtụ ndị akaebe, ikpe ahụ ga-egbu oge, ọ gaghịkwa adịrị ọtụtụ ndị mfe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ maara na ka e nwee ike kpee ikpe ahụ otú a ga-eji ya mere ihe a ga-agbakwasị ụkwụ kpee ikpe ndị yiri ya n’ọdịnihu, ọ dị mkpa na a ga-enye ndị niile okwu ahụ gbasara ohere ikwu ihe ha maara banyere ya.

Olee otú ihe atụ a si gbasa ebubo Ekwensu, onye a na-akpọkwa “dragọn,” “agwọ,” na “Setan,” boro Jehova, “Onye Kasị Elu n’ụwa niile”? (Mkpughe 12:9; Abụ Ọma 83:18) Ònye bụdị Ekwensu? Olee ebubo ndị o boro Jehova Chineke? Oleekwa mgbe Chineke ga-egbu ya?

Ihe A Ga-agbakwasị Ụkwụ Na-ekpe Ikpe

Onye ahụ mechara ghọọ Ekwensu bụbu mmụọ zuru oké, otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke. (Job 1:6, 7) O mere onwe ya Ekwensu mgbe ọ chọwara ka ụmụ mmadụ fewe ya, bụ́kwanụ ihe na-erughịrị ya. N’ihi ya, o mere ihe gosiri na o weere na Chineke erughị eru ịchị, nakwa na e kwesịghị irubere Chineke isi. O kwuru na naanị ihe mere ụmụ mmadụ ji efe Chineke bụ n’ihi ngọzi ndị ha na-enweta n’aka Chineke. Ihe Setan na-ekwu bụ na ọ bụrụ na ihe esiwere onye ọ bụla n’ime anyị ike, onye ahụ ‘ga-akọcha’ Onye kere ya.—Job 1:8-11; 2:4, 5.

Ọ bụghị igbu Setan ozugbo ga-eme ka a mara na ebubo ndị a Setan boro abụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na Chineke gburu Ekwensu ozugbo, ọ gaara eme ka ụfọdụ ndị chewe na ihe ahụ Ekwensu kwuru bụ eziokwu. N’ihi ya, ebe ọ bụ na Chineke nwere ikike kachanụ, ọ malitere ihe ga-eme ka ndị niile maara banyere ebubo ahụ chọpụta nke bụ́ eziokwu.

Ebe ọ bụ na Jehova Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ihe otú o kwesịrị mgbe niile, o mere ka o doo anya na ka oge na-aga, a ga-enwe ndị ga-akwado Ekwensu na ndị ga-akwado Chineke n’okwu a. Oge Chineke nyere maka nke a mere ka ụmụ Adam nwee ike ịdị ndụ ma gosi na ha na-akwado Chineke ma ọ bụrụ na ha erubere ya isi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya n’agbanyeghị otú ihe si siere ha ike.

Chineke Ọ̀ Ga-eche Ruo Ole Mgbe?

Jehova Chineke maara nke ọma na ka a na-edozi okwu a, ụmụ mmadụ ga na-ata ahụhụ. Ma, o kpebisiri ike ịhụ na okwu a biri n’oge na-adịghị anya. Baịbụl kwuru na ọ bụ “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3) O doro anya na “Chineke nke nkasi obi niile” agaghị ekwe ka Ekwensu nọtee aka, ọ gaghịkwa ekwe ka ihe ọjọọ ndị Ekwensu kpatara dịgide. Ma, Chineke agaghị egbu Ekwensu mgbe oge igbu ya na-erubeghị, ya bụ, mgbe a na-ekpebibeghị ikpe ahụ gbasara onye ọ bụla.

E kpebihaala ikpe ahụ, ọ ga-edo anya na ọchịchị Jehova kacha mma. E kpechaa Setan ikpe a, ikpe ahụ ga-aghọ ihe a ga-agbakwasị ụkwụ ekpe onye ọ bụla ọzọ nupụrụ isi ikpe. E nwee onye ọzọ ga-apụta otu ụbọchị bịa mawa Chineke aka, a ga-eji ikpe e kpere Setan maa ya ikpe.

Oge igbu Ekwensu ruo, Jehova Chineke ga-agwa Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka o gbuo Ekwensu ma mezie ihe niile o mebiri. Baịbụl kwuru na a ga-enwe oge Kraịst “ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya, mgbe o meworo ka ọchịchị niile na ikike na ike niile ghara ịdị irè. N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debere ndị iro ya niile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrịnt 15:24-26.

Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl kwere nkwa na ụwa niile ga-aghọ Paradaịs. Ndị mmadụ ga-adị ndụ, biri n’udo na paradaịs otú ahụ Chineke chọrọ ka ọ dịrị na mbụ! “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” N’eziokwu, “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:11, 29.

Legodị ọmarịcha ngọzi Baịbụl kwuru na ndị ohu Chineke ga-enweta: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ebubo Ekwensu boro ma Chineke ma ụmụ mmadụ?—Job 1:8-11.

● Olee àgwà ndị Chineke nwere bụ́ ndị na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-egbu Ekwensu ma oge ruo?—2 Ndị Kọrịnt 1:3.

● Olee nkwa Baịbụl kwere? —Mkpughe 21:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ka e nwee ike ikpe ikpe otú a ga-eji ya mere ihe a ga-agbakwasị ụkwụ kpee ikpe ndị yiri ya n’ọdịnihu, ọ dị mkpa na a ga-enye ndị niile okwu ahụ gbasara ohere ikwu ihe ha maara banyere ya