Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ “Na-eri Oriri Mgbe Niile”?

Ị̀ “Na-eri Oriri Mgbe Niile”?

“Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ; ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.”—Ilu 15:15.

GỊNỊ ka ihe a Ilu 15:15 kwuru pụtara? Amaokwu Baịbụl a na-ekwu banyere otú obi na-adị ndị mmadụ. “Onye nọ n’ahụhụ” na-echegbu onwe ya n’ihi nsogbu bịaara ya. Otú a obi na-adị ya na-eme ka ụbọchị ya ‘jọọ njọ.’ Ma, “onye obi dị mma” anaghị echegbu onwe ya, kama obi na-adị ya ụtọ. Ọ bụ obi ụtọ ahụ ọ na-enwe bụ ‘oriri ahụ ọ na-eri mgbe niile.’

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye n’ime anyị na-enweghị ihe nwere ike imebi ya obi mgbe ụfọdụ. Ma, e nwere ihe anyị nwere ike ime ka obi dị anyị ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ụwa. Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru gbasara ha.

  • Echegbula onwe gị banyere ihe ga-eme echi. Jizọs Kraịst sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—Matiu 6:34.

  • Echefula ihe ọma ndị meere gị. Obi jọwa gị njọ, kama ịnọ na-eche banyere ya, gbaa mbọ cheta ihe ọma ndị meere gị. Anọkwala na-eche gbasara ihe ndị ị na-emetaghị n’oge gara aga, kama, mụta ihe na ha. Ị manụ na ọ na-abụ onye na-anya ụgbọala gbatụ gbatụ ya elee anya n’enyo. Ma, anya ya anaghị atọzi n’enyo ahụ. Otú ahụ ka ị na-ekwesịghị ịnọ na-eche ihe ị na-emetaghị n’oge gara aga. Gbalịa chọpụta ihe ị ga-eme ka i mezie ha. Chetakwa na “ezi mgbaghara dị n’aka [Chineke].”—Abụ Ọma 130:4.

  • Ọ bụrụ na o nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi, kọọrọ ya onye nwere ike inyere gị aka. Ilu 12:25 kwuru, sị: “Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” “Okwu ọma” ahụ agaghị esi n’ọnụ onye iro gị, kama o nwere ike isi n’ọnụ onye ezinụlọ gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị.—Ilu 17:17.

Ihe Baịbụl kwuru na-enyere ọtụtụ ndị aka ịna-enwe ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ụwa. Anyị na-ekpe ekpere ka ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru nyere gịnwa aka ịna-enwe ọṅụ.