Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A

Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?

Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?

“M bịara nwee ụdị obi ụtọ m na-enwetụbeghị ná ndụ.”

ỊKỤ ọkpọ na-atọ Hilton ụtọ. Mgbe ọ dị afọ asaa, ọ na-aga akụ ọkpọ ma n’ebe a na-anọ akụ ọkpọ ma n’ebe ndị ọzọ. Mgbe ọ nọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ya na ndị enyi ya na-agagharị na-achọ ndị ha ga-egbu ilu. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, m na-ezu ohi, na-agba chaa chaa, na-ele ndị gba ọtọ, na-emesi ụmụ nwaanyị ike, na-akpọkwa papa m na mama m iyi. Otú m si akpa àgwà mere ka papa m na mama m chee na o nweghị ihe ga-eme ka m gbanwee. Mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, agara m biri nke m.”

Mgbe afọ iri na abụọ gachara, Hilton lọtara. O siiri nne na nna ya ike ikweta na onye a bụ nwa ha n’ihi na ọ gbanweela. Ọ dịzi nwayọọ, na-ejide onwe ya, na-akwanyekwara ndị ọzọ ùgwù. Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe? Mgbe ahụ ọ gara biri nke ya, o chebaara onwe ya echiche. Ọ malitekwara ịgụ Baịbụl ka ọ mara ma ọ̀ ga-enyere ya aka ịgbanwe. O kwuru, sị: “M malitere ime ihe m na-agụta na Baịbụl. M kwụsịrị ịkpa àgwà ọjọọ ma malite ịsọpụrụ nne m na nna m otú ahụ Baịbụl kwuru ná Ndị Efesọs 6:2, 3. M bịara nwee ụdị obi ụtọ m na-enwetụbeghị ná ndụ. Emekwara m ka obi na-adị papa m na mama m mma kama ime ihe ndị ga na-agbawa ha obi.”

Otú Hilton si mechaa gbanwee gosiri na ihe e kwuru na Baịbụl bara uru, na-agbanwekwa ndụ ndị mmadụ. (Ndị Hibru 4:12) Na Teta! a, anyị ga-atụle ihe Baịbụl kwuru gbasara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ, otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị, ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara ịgba n’èzí, na otú anyị ga-esi na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Anyị ga-ahụkwa otú ihe a niile ga-esi baara anyị uru.