Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka

JEHOVA bụ Chineke na-emesapụ aka. (Jems 1:17) Ihe niile Jehova kere na-egosi na ọ na-emesapụ aka, ma kpakpando ndị na-eju na mbara igwe n’abalị ma osisi ndị juru n’ụwa.—Ọma 65:12, 13; 147:7, 8; 148:3, 4.

Otú obi si dị́ Devid ụtọ maka ihe Chineke kere mere ka o dee abụ iji too ọrụ aka Jehova. Gụọ Abụ Ọma nke 104, ka ị hụ ma ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị otú ọ dị ya. Devid dere, sị: “M ga-abụku Jehova abụ n’oge niile m dị ndụ; m ga-abụku Jehova abụ olu ụtọ n’oge ndụ m niile.” (Ọma 104:33) Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

ONYE KACHA EMESAPỤ AKA

Jehova chọrọ ka anyị na-emesapụ aka otú ahụ ọ na-eme. Ọ gwakwara anyị ihe mere anyị ga-eji na-emesapụ aka. Buru n’obi ihe Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee. Ọ sịrị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ; ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, ka ha dịrị njikere inye ndị ọzọ ihe, ka ha na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Tim. 6:17-19.

Mgbe Pọl degaara ọgbakọ dị́ na Kọrịnt akwụkwọ ozi nke abụọ, o kwusiri ike banyere otú anyị kwesịrị isi na-ele inye onyinye anya. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Kọr. 9:7) Pọl kwukwara ndị imesapụ aka na-abara uru. Nke mbụ bụ onye e nyere onyinye, bụ́ onye e gboro mkpa ya. Nke abụọ abụrụ onye nyere onyinye, ya bụ, onye Chineke ga-agọzi nke ukwuu.—2 Kọr. 9:11-14.

Ihe ikpeazụ Pọl kwuru banyere onyinye n’akwụkwọ ozi ahụ bụ ihe kacha gosi na Chineke na-emesapụ aka. Ọ sịrị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Kọr. 9:15) O doro anya na ihe só n’onyinye Pọl kwuru okwu ya bụ ihe ọma niile Chineke si n’aka Jizọs Kraịst na-emere ndị ya. Uru ọ bara abụghị ihe e ji ọnụ akọ.

Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova na Ọkpara ya meere anyị nakwa ihe ndị ha ga-emere anyị n’ọdịnihu? Otu ụzọ bụ iji oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-akwado ofufe Jehova, ma ihe anyị ga-emeli ọ̀ dị ntakịrị ma ò buru ibu.—1 Ihe 22:14; 29:3-5; Luk 21:1-4.