Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?

Chineke ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Chineke ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?

Mba; Chineke ji alụmdi na nwunye mbụ ọ malitere n’ogige Iden gosi na ya chọrọ ka otu nwoke lụọ otu nwaanyị. Jizọs Kraịst mechakwara gwa ndị na-eso ụzọ ya na Chineke chọrọ ya otú ahụ.—Jenesis 2:18-24; Matiu 19:4-6.

Ọ̀ bụ na ndị ikom dị ka Ebreham, Jekọb, Devid, na Sọlọmọn, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst, alụghị ihe karịrị otu nwaanyị? Ee, ma olee ihe Baịbụl kọọrọ anyị banyere ya? Ọ gwara anyị na e nwere esemokwu n’ezinụlọ Ebreham na Jekọb n’ihi na ha lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị. (Jenesis 16:1-4; 29:18–30:24) Iwu Chineke mechara kwuo banyere eze nke ọ bụla n’Izrel, sị: “Ọ gaghịkwa alụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe m nọ.” (Diuterọnọmi 17:15, 17) Sọlọmọn leghaara iwu ahụ anya lụọ narị nwunye asaa! Ọ dị mwute na obi Sọlọmọn mechara pụọ n’ebe Jehova nọ n’ihi ọtụtụ ụmụ nwaanyị ọ lụrụ. (1 Ndị Eze 11:1-4) O doro anya na Baịbụl akọghị akụkọ ọma banyere ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị.

Ma, ụfọdụ nwere ike ịnọ na-eche ihe mere Chineke ji hapụ ndị ya ka ha na-alụ ihe karịrị otu nwaanyị n’oge ochie. Tụlee nke a: Ọ̀ dịtụla mgbe ị hapụrụ otu arịa dị n’ụlọ gị ruo oge ụfọdụ n’agbanyeghị na ị maara na i kwesịrị ịgbanwe ya, ikekwe chee na iwepụ ya mgbe ahụ nwere ike imebi ihe? N’ezie, ụzọ Chineke na echiche ya dị elu karịa nke anyị. (Aịzaya 55:8, 9) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ike ịhụ ihe ụfọdụ mere o ji hapụ ndị ya ka ha lụọ ihe karịrị otu nwaanyị ruo oge ụfọdụ.

Cheta na n’Iden, Jehova kwere nkwa na a ga-enwe otu “mkpụrụ” nke ga-emecha bibie Setan. E mechara gwa Ebreham na ọ ga-abụ nna nke nnukwu mba nakwa na Mkpụrụ ahụ e buru n’amụma ga-esi n’ezinụlọ ya bịa. (Jenesis 3:15; 22:18) Setan kpebisiri ike ịhụ na Mkpụrụ ahụ abịaghị. Ọ bụ ya mere o ji chọsie ike ibibi mba Izrel. Mgbe mgbe, ọ rabara Izrel ná mmehie ka Chineke wee jụ ha ma kwụsị ichebe ha.

Iji zọpụta ndị Izrel n’aka Setan, Jehova zigara ndị amụma ya ugboro ugboro ka ha gaa dọọ ndị ya aka ná ntị mgbe ha hiewere ụzọ. Ma, o burula ụzọ mara na ndị ya agadịghị erube isi n’iwu ndị bụ́ isi, dị ka iwu o nyere ha ka ha ghara ikpere arụsị. (Ọpụpụ 32:9) Ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ike irube isi n’iwu ahụ bụ́ isi, olee otú ha ga-esi rubelie isi n’iwu o nyere ha ka ha ghara ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị? Ebe ọ bụ na Jehova ghọtara ụmụ mmadụ nke ọma, ọ hụrụ na oge erubeghị ka ọ kwụsị ndị ya ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị, bụ́ nke gbanyerela mgbọrọgwụ n’oge ahụ. A sị na o mere nke ahụ, ọ gaara adịrị nnọọ Setan mfe ịraba Izrel ná mmehie.

O nwere uru ndị ọzọ Chineke ịhapụ ndị ya ka ha lụọ ihe karịrị otu nwaanyị ruo oge ụfọdụ bara. O mere ka mba ahụ mụbaa ngwa ngwa. Ọtụtụ mba ahụ dị mere ka ha dịgide ruo mgbe Mesaya bịara. O nwekwara ike ịbụ na ndokwa ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị chebere ụfọdụ ụmụ nwaanyị, mee ka ha nwee ụlọ obibi na ezinụlọ n’oge ihe siri ike.

Ma, cheta na ọ bụghị Jehova malitere ndokwa a. Ọ hapụrụ ya ruo oge ụfọdụ, ma nye iwu ndị mere ka a ghara iji ya megbuo onye ọ bụla. (Ọpụpụ 21:10, 11; Diuterọnọmi 21:15-17) Mgbe Jehova kpebiri ịkwụsị ndị na-efe ya ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị, o si n’ọnụ Ọkpara ya chetaghachiri ndị mmadụ ihe ọ chọrọ n’alụmdi na nwunye bụ́ nke o gosiri n’Iden. Jizọs si otú ahụ machiere ndị na-eso ụzọ ya ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị. (Mak 10:8) Nke a meziri ka eziokwu a dokwuo anya, nke bụ́: Iwu Mozis dị mma n’oge ya, ma “iwu nke Kraịst” ka ya mma.—Ndị Galeshia 6:2.