Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Mụtara Irube Isi

Jizọs Mụtara Irube Isi

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Jizọs Mụtara Irube Isi

Ọ̀ NA-ESIRI gị ike mgbe ụfọdụ irube isi?— * Ọ bụghị ihe ijuanya ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị otú ahụ. Ọ na-esiri onye ọ bụla ike mgbe ụfọdụ irube isi. Ị̀ maara na Jizọs mụtadịrị nrubeisi amụta?—

Ị̀ maara ndị ụmụntakịrị niile kwesịrị irubere isi?— Ee, nne na nna anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:1) Ònye bụ nna Jizọs?— Jehova Chineke, ọ bụkwa ya bụ Nna anyị. (Matiu 6:9, 10) Ma, ọ bụrụ na i kwuo na Josef bụ nna Jizọs nakwa na Meri bụ nne ya, i kwukwara eziokwu. Ị̀ maara otú ha si bụrụ nne na nna ya?—

Mmụọ ozi Gebriel gwara Meri otú ọ ga-esi mụọ nwa n’agbanyeghị na ya na nwoke enwebeghị mmekọahụ. Jehova mere ka Meri dị ime site n’ịrụ otu nnukwu ọrụ ebube. Gebriel kọwaara Meri, sị: “Ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.”—Luk 1:30-35.

Chineke si n’eluigwe tinye ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri. Ya etozie n’akpa nwa Meri otú ụmụ ọhụrụ ndị ọzọ si eto n’akpa nwa nne ha. Mgbe ihe dị ka ọnwa itoolu gachara, a mụrụ Jizọs. Mgbe nke ahụ na-eme, Josef lụrụ Meri, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chekwara na Josef bụ ezigbo nna Jizọs. Ma, Josef abụghị ezigbo nna ya. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na Jizọs nwere nna abụọ!

Mgbe Jizọs dị naanị afọ iri na abụọ, o mere ihe gosiri otú ọ hụruru Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, n’anya. N’oge ahụ, ezinụlọ Jizọs mere njem dị anya gaa Jeruselem maka Ememme Ngabiga, dị ka ha na-emekarị. Mgbe e mechara ememme ahụ, Josef na Meri amaghị na Jizọs esoghị ha mgbe ha na-alaghachi Nazaret. Ò juru gị anya ihe mere ha ga-eji chefuo ya?—

N’oge ahụ, Josef na Meri amụọla ụmụ ndị ọzọ. (Matiu 13:55, 56) Ọ ga-abụkwa na ndị ikwu ha so ha mee njem ahụ, dị ka Jems na Jọn nakwa nna ha Zebedi, na nne ha Salomi, onye nwere ike ịbụ nwanne Meri. N’ihi ya, Meri nwere ike iche na Jizọs so ndị ikwu ha ndị ọzọ ka ha na-ala.—Matiu 27:56; Mak 15:40; Jọn 19:25.

Mgbe Josef na Meri matara na Jizọs esoghị ha, ha ji ọsọ laghachi Jeruselem. Ha chọsiri nwa ha nwoke ike. N’ụbọchị nke atọ, ha chọtara ya n’ụlọ nsọ. Meri gwara ya, sị: “Gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.” Ma, Jizọs zara ha, sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”—Luk 2:45-50.

Ì chere na ihe ahụ Jizọs zara nne ya adịghị mma?— Nne na nna ya maara na ife ofufe n’ụlọ Chineke na-atọ ya ụtọ. (Abụ Ọma 122:1) N’ihi ya, ọ̀ bụ na Jizọs ekwesịghị iche na ebe mbụ ha kwesịrị ịchọ ya bụ n’ụlọ nsọ Chineke?— Meri mechara chewe ihe ahụ Jizọs kwuru n’echiche.

Olee otú Jizọs si akpaso Josef na Meri àgwà?— Baịbụl kwuru, sị: “[Jizọs] wee soro ha gbadaa ma bịaruo Nazaret, ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.” (Luk 2:51, 52) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Jizọs?— Anyị mụtara na anyị onwe anyịkwa kwesịrị irubere nne na nna anyị isi.

Ma, ọ dịrịghị Jizọs mfe irube isi mgbe niile—o sidịịrị ya ike irubere Nna ya nke eluigwe isi.

N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ jụrụ Jehova ma Ọ̀ ga-agbanwe uche Ya n’ihe Ọ chọrọ ka ya mee. (Luk 22:42) Ma, Jizọs rubeere Chineke isi n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe. Baịbụl kwuru na “ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” (Ndị Hibru 5:8) Ì chere na anyị nwekwara ike ịmụta irube isi?—

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Olee otú Meri si ghọọ nne Jizọs, oleekwa ihe mere e nwere ike iji kwuo na Jizọs nwere nna abụọ?

▪ Olee ihe mere nne na nna Jizọs amataghị na Jizọs esoghị ha na-ala?

▪ Olee ebe Jizọs tụrụ anya ka nne na nna ya chọọ ya?

▪ Olee ihe i nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Jizọs?

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee ihe mere i ji chee na ebe mbụ Meri na Josef kwesịrị ịchọ Jizọs bụ n’ụlọ nsọ?