Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?

Chineke Chọrọ Ka Gị na Ya Dịrị ná Mma

Chineke Chọrọ Ka Gị na Ya Dịrị ná Mma

“Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.”—JỌN 6:44.

IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Ọ na-adị ọtụtụ ndị kweere na Chineke ka ha na ya enweghị ike ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị Ayaland aha ya bụ Christina. Ọ na-aga chọọchị kwa izu. Ma o kwuru, sị: “M weere Chineke ka onye kere ihe niile. Ma, amaghị m onye ọ bụ. O nwetụbeghị mgbe ọ dị m ka mụ na ya ọ̀ dị ná mma.”

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Mgbe ọ bụla ọ dị anyị ka o nweghị ihe jikọtara anyị na Chineke, Chineke anaghị elefuru anyị anya. Jizọs mere ihe atụ gosiri na Chineke na-eche banyere anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu?” Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ a? Jizọs sịrị: “N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”—Matiu 18:12-14.

Onye ọ bụla “n’ime ndị a dị nta ” bara ezigbo uru n’anya Chineke. Oleekwanụ otú Chineke si achọ “nke ahụ kpafuru akpafu”? Amaokwu Akwụkwọ Nsọ e dere ná mmalite isiokwu a kwuru na Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ.

Ole ndị taa na-aga n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’ebe ọhaneze na-anọ agwa ha ihe Baịbụl kwuru gbasara Chineke?

Ka anyị leba anya n’otú Chineke sirila dọta ndị ji obi ha niile chọọ ife ya. N’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, Chineke zipụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst aha ya bụ Filip ka ọ gakwuru otu nwoke na-arụ ọrụ n’obí eze nwaanyị ndị Itiopia ma kọwaara ya amụma Baịbụl ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-agụ. (Ọrụ Ndịozi 8:26-39) O nwekwara mgbe Chineke gwara Pita onyeozi ka ọ gaa n’ụlọ ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Kọnịliọs. Kọnịliọs na-ekpe ekpere, na-agbalịkwa ike ya niile ka o fee Chineke. (Ọrụ Ndịozi 10:1-48) Chineke mekwara ka Pọl onyeozi na ndị ha na ya so gaa ná mmiri dị nso n’obodo Filipaị. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Lidia, bụ́ ‘onye na-efe Chineke.’ ‘Jehova meghere obi nwaanyị a, ya anabata ihe Pọl nọ na-ekwu.’—Ọrụ Ndịozi 16:9-15.

Ná nke ọ bụla n’akụkọ ndị a, Jehova mere ka ndị chọrọ ịmata onye ọ bụ mata ya. Ole ndị taa na-aga n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’ebe ọhaneze na-anọ agwa ha ihe Baịbụl kwuru gbasara Chineke? Ọtụtụ ndị ga-asị na ọ bụ “Ndịàmà Jehova.” Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ ga-abụ na Chineke ji ha na-eme ka mụ na ya dịrị ná mma?’ Anyị na-agba gị ume ka ị rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka ị nabata mbọ ọ na-agba ka gị na ya dịrị ná mma. *

^ para. 8 Ị chọọ ịmatakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, lee vidio aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ dị n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com/ig.