Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

N’eziokwu, Onye nyere anyị ndụ ga-emeli ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ

Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ebe ọ bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị akpọliteli ndị nwụrụ anwụ? Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15) Ma, gịnị mere ọ ga-eji kpọlite ha?

Ihe Onye kere anyị bu n’obi kee anyị bụ ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 1:31; 2:15-17) Ọ ka bụkwa ihe ọ chọrọ imere anyị. Ọ na-ewute ya na ndụ anyị jupụtara ná nsogbu nakwa na ọ naghị ara ahụ́ anyị anwụọ.—Gụọ Job 14:1, 14, 15.

Olee ebe ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-ebi?

Chineke ò kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’eluigwe? Mba. Chineke kere ndị mmụọ ozi ka ha biri n’eluigwe. Ma, o kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’ụwa. (Jenesis 1:28; Job 38:4, 7) Ngwa, chegodị gbasara ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Ọ kpọlitere ha, ha adịrịkwa ndụ n’ụwa ebe a. Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ọtụtụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ha ga-adịghachikwa ndụ n’ụwa.Gụọ Jọn 5:28, 29; 11:44.

Ma, e nwere mmadụ ole na ole Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. Ha ga-enwe ahụ́ nke mmụọ. (Luk 12:32; 1 Ndị Kọrịnt 15:49, 50) Ndị ahụ ga-aga eluigwe ga-eso Kraịst chịa ụwa dị ka ndị eze.—Gụọ Mkpughe 5:9, 10.