Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Baptizim?

Gịnị Bụ Baptizim?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baptizim bụ imikpu mmadụ ná mmiri. a Na Baịbụl, e dere banyere ọtụtụ ndị e mere baptizim. (Ọrụ Ndịozi 2:41) Otu onye n’ime ha bụ Jizọs, onye e mere baptizim n’Osimiri Jọdan. (Matiu 3:13, 16) Ka ọtụtụ afọ gachara, e mere otu nwoke Etiopia baptizim “n’otu mmiri” dị nso n’okporo ụzọ ọ na-aga.​—Ọrụ Ndịozi 8:36-40.

 Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-emerịrị baptizim. (Matiu 28:19, 20) Pita onyeozi kwukwara ihe yiri ihe ahụ Jizọs kwuru.​—1 Pita 3:21.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Gịnị bụ baptizim?

 Baptizim bụ ihe mmadụ na-eme n’ihu ọha iji gosi na ya echegharịala ná mmehie ya nakwa na ya ekwela Chineke nkwa na ya ga na-emezi uche ya otú ihe sọkwara ya dị. Ọ pụtara na onye ahụ ga na-erubere Chineke na Jizọs isi n’ihe niile ọ na-eme ná ndụ ya. Ndị mere baptizim nwere ike inweta ndụ ebighị ebi n’ihi na ha na-ebizi ndụ otú Chineke chọrọ.

 Imikpu mmadụ ná mmiri bụ ihe dabara adaba ime iji gosi na mmadụ agbanweela ihe ná ndụ ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Baịbụl ji ime mmadụ baptizim tụnyere ili mmadụ. (Ndị Rom 6:4; Ndị Kọlọsi 2:12) Mgbe e mikpuru mmadụ ná mmiri, e nwere ike ikwu na onye ahụ anwụọla n’otú o si ebibu ndụ, ya bụ, na onye ahụ akwụsịla ibi ndụ otú o si ebibu. Mgbe o si ná mmiri bilite, ọ na-egosi na ọ na-amalitezi ibi ndụ ọhụrụ dị ka Onye Kraịst nyefere Chineke onwe ya.

 Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ime ụmụ ọhụrụ baptizim?

 Baịbụl ekwughị na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Baịbụl kwuru na e nwere ihe ụfọdụ onye chọrọ ime baptizim ga-emerịrị. Dị ka ihe atụ, onye ahụ ga-aghọtarịrị eziokwu ndị bụ́ isi dị n’Okwu Chineke, na-ebikwa ndụ otú dabara na ha. O kwesịrị ichegharị ná mmehie ya. Ọ ga-ekpekwa ekpere nyefee Chineke ndụ ya. (Ọrụ Ndịozi 2:38, 41; 8:12) Ụmụ ọhụrụ agaghị emeli ihe ndị a.

Gịnị ka ime baptizim n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ pụtara?

  Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ime mmadụ baptizim “n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara na onye a na-eme baptizim ghọtara onye Nna ahụ na Ọkpara ya bụ, ghọta ọkwá ha, ghọtakwa ọrụ mmụọ nsọ Chineke na-arụ. Iji maa atụ: Pita onyeozi gwara otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, sị: “N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jewe ije!” (Ọrụ Ndịozi 3:6) Ihe Pita kwuru doro anya. Ọ ma ọkwá Kraịst, nabata ya, ma kwuo ihe ahụ iji gosi na ọrụ ebube ahụ ọ rụrụ si n’aka ya.

  •   Ọ bụ Jehova b Chineke bụ “Nna.” Ebe ọ bụ Jehova bụ Onye kere ihe niile, Onye Na-enye Ndụ, nakwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ bụ ya kacha ihe niile elu.​—Jenesis 17:1; Mkpughe 4:11.

  •   Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ “Ọkpara” ahụ, onye nyere ndụ ya maka anyị. (Ndị Rom 6:23) A gaghị azọpụta anyị ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ọrụ dị mkpa Jizọs na-arụ iji mezuo ihe Chineke bụ n’obi maka ụmụ mmadụ ma gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya.​—Jọn 14:6; 20:31; Ọrụ Ndịozi 4:8-12.

  •   “Mmụọ nsọ” bụ ike Chineke ji arụ ọrụ. c Chineke ji mmụọ nsọ ya kee ihe, mee ka ihe dị iche iche dịrị ndụ, zie ndị amụma ya na ndị ọzọ ozi, nyekwa ha ike ha ga-eji eme uche ya. (Jenesis 1:2; Job 33:4; Ndị Rom 15:18, 19) Chineke jikwa mmụọ nsọ ya duo ndị dere Baịbụl, ha edee uche ya.​—2 Pita 1:21.

Mmadụ ime baptizim ihe karịrị otu ugboro ọ̀ bụ mmehie?

  Ọtụtụ na-ahapụ okpukpe ha kpewe okpukpe ọzọ. Gịnịzi ka ha ga-eme ma ọ bụrụ na ha mere baptizim na chọọchị ha na-agabu? Ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma ha mee baptizim ọzọ? Ụfọdụ na-asị na ọ bụ ihe ọjọọ. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji ekwu otú ahụ bụ n’ihi otú ha si ghọta Ndị Efesọs 4:5, ebe sịrị: “E nwekwara otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptizim.” Ma, ihe amaokwu Baịbụl a na-ekwu abụghị na mmadụ ime baptizim ihe karịrị otu ugboro bụ ihe ọjọọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

 Ihe ndị gbara amaokwu ahụ gburugburu. Ihe ndị gbara Ndị Efesọs 4:5 gburugburu gosiri na ihe Pọl onyeozi na-ekwu ebe ahụ bụ na ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịdị n’otu ma kwere otu ihe. (Ndị Efesọs 4:1-3, 16) Ha ga-adị n’otu otú ahụ naanị ma ha na-eso otu Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, kwere otu ihe, ya bụ, ihe ha kweere gbasara ihe Baịbụl na-akụzi ga-abụ otu, nakwa ma ha na-eme ihe ndị Baịbụl kwuru na onye chọrọ ime baptizim kwesịrị ime.

 Pọl onyeozi gwara ụfọdụ ndị merela baptizim ka ha mee baptizim ọzọ. Ihe mere o ji gwa ha ihe a bụ maka na mgbe ha mere baptizim, ha aghọtachabeghị eziokwu Ndị Kraịst na-akụzi.​—Ọrụ Ndịozi 19:1-5.

 Ihe ga-eme ka Chineke nabata baptizim mmadụ mere. Mmadụ ga-aghọtarịrị eziokwu ndị Baịbụl na-akụzi ka Chineke nwee ike ịnabata baptizim ya. (1 Timoti 2:3, 4) Ọ bụrụ na mmadụ mere baptizim mgbe o kweere ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị okpukpe na-akụzi gbasara Baịbụl, Chineke agaghị anabata baptizim ya. (Jọn 4:23, 24) Onye ahụ nwere ike iche na ọ na-eme ihe dị mma, ma ọ ‘maghị Chineke nke ọma’ tupu ya emee baptizim ahụ. (Ndị Rom 10:2) Onye ahụ chọọ ka ya na Chineke dị ná mma, ọ ga-amụta eziokwu dị na Baịbụl, mewe ihe ọ mụtara, nyefee Chineke ndụ ya, meekwa baptizim ọzọ. O mee ụdị baptizim a, baptizim ahụ o meghachiri agaghị abụ mmehie. Kama n’eziokwu, ọ bụ ihe o kwesịrị ime.

Ụdị baptizim ndị ọzọ e kwuru okwu ha na Baịbụl

  Baịbụl kwuru banyere ụdị baptizim ndị ọzọ dị iche na baptizim nke ahụ a na-emikpu ndị na-eso ụzọ Kraịst na mmiri. Lee ụfọdụ n’ime ha.

 Baptizim Jọn Onye Na-eme Baptizim nọ na-eme. d Jọn mere ndị Juu na ndị mba ọzọ ndị malitere ikpe okpukpe ndị Juu baptizim iji gosi na ha echegharịala ná mmehie ha mere n’Iwu Mosis, bụ́ Iwu Chineke si n’aka Mosis nye ndị Izrel. Baptizim Jọn mere ndị mmadụ mere ka ha dị njikere ịmata Mezaya, bụ́ Jizọs onye Nazaret, ma nabata ya.​—Luk 1:13-17; 3:2, 3; Ọrụ Ndịozi 19:4.

 Baptizim e mere Jizọs. Baptizim Jọn Onye Na-eme Baptizim mere Jizọs pụrụ iche. Jizọs zuru okè, o meghịkwa mmehie ọ bụla. (1 Pita 2:21, 22) N’ihi ya, baptizim o mere apụtaghị na o chegharịala ma ọ bụkwanụ na ọ “na-arịọ Chineke ka o mee ka o nwee ezigbo akọnuche.” (1 Pita 3:21) Kama, o gosiri na ọ na-enyefe Chineke onwe ya ime uche ya ebe ọ bụ Mezaya ma ọ bụ Kraịst e buru n’amụma. Ịnwụ maka anyị sokwa n’uche Chineke ọ bịara ime.​—Ndị Hibru 10:7-10.

 Iji mmụọ nsọ mee mmadụ baptizim. Ma Jọn Onye Na-eme Baptizim ma Jizọs Kraịst kwuru banyere iji mmụọ nsọ eme mmadụ baptizim. (Matiu 3:11; Luk 3:16; Ọrụ Ndịozi 1:1-5) Baptizim nke a na ime mmadụ baptizim n’aha mmụọ nsọ abụghị otu ihe. (Matiu 28:19) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

 Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs ka e ji mmụọ nsọ mee baptizim. E ji mmụọ nsọ tee ndị a mmanụ maka na a họọrọ ha ka ha soro Kraịst rụọ ọrụ n’eluigwe. Ha ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa. e (1 Pita 1:3, 4; Mkpughe 5:9, 10) Ha ga-achị nde kwuru nde ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs.​—Matiu 5:5; Luk 23:43.

 Ime mmadụ baptizim ka ya na Kraịst Jizọs dịrị n’otu nakwa ka ọ nwụọ ụdị ọnwụ Kraịst nwụrụ. A na-emekwa ndị e ji mmụọ nsọ mee baptizim ‘baptizim ka ha na Kraịst Jizọs dịrị n’otu.’ (Ndị Rom 6:3) N’ihi ya, ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe, ka a na-eme ụdị baptizim a. E mee ha baptizim ka ha na Kraịst dịrị n’otu, ha na-esozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọ bụ Jizọs bụ Onyeisi ọgbakọ a, hanwa abụrụ ahụ́ ya.​—1 Ndị Kọrịnt 12:12, 13, 27; Ndị Kọlọsi 1:18.

 A na-emekwa Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘baptizim ka ha nwụọ ụdị ọnwụ Jizọs nwụrụ.’ (Ndị Rom 6:3, 4) Ha na-eme ka Jizọs. Ha na-erubere Chineke isi kama ime ihe dị onwe ha mma, ha makwa na ha agaghị adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. A na-emecha ha baptizim a nwere ihe ọ nọchiri anya ya ma ha nwụọ, a kpọlitekwa n’ọnwụ n’eluigwe, ha abụrụ mmụọ.​—Ndị Rom 6:5; 1 Ndị Kọrịnt 15:42-44.

 Iji ọkụ eme mmadụ mmadụ baptizim. Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ndị ọ na-ezi ozi ọma, sị: “Onye ahụ [ya bụ, Jizọs] ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim. O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edowekwa ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ a na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.” (Matiu 3:11, 12) Buru n’uche na e nwere ihe dị iche n’iji ọkụ eme mmadụ baptizim na iji mmụọ nsọ eme mmadụ baptizim. Gịnị ka ihe Jọn kwuru pụtara?

 Ọka wit nọchiri anya ndị ga-ege Jizọs ntị ma rubere ya isi. A ga-eji mmụọ nsọ mee ha baptizim. Mkpo ọka ahụ nọchiri anya ndị na-agaghị ege Jizọs ntị. A ga-eji ọkụ mee ha baptizim, nke pụtara na a ga-ebibi ha mbibi ebighị ebi.​—Matiu 3:7-12; Luk 3:16, 17.

a Akwụkwọ bụ́ Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “baptizim” pụtara “imikpu mmadụ na mmiri, mmiri ekpuchie onye ahụ kpamkpam, ya esizie na mmiri pụta.”

b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?

c Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

d Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim?

e Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?

f Baịbụl jikwa okwu bụ́ “baptizim” kọwaa otú dị iche iche e si asacha ihe ndị e ji efe ofufe, dị ka imikpu arịa dị iche iche na mmiri. (Mak 7:4; Ndị Hibru 9:10) Ma nke a dị nnọọ iche na mmikpu e mikpuru Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na mmiri.