Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Baịbụl Na-ekwu

OTÚ Ị GA-ESI CHỌTA AMAOKWU NDỊ DỊ NA BAỊBỤL

Akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dị iri isii na isii. E kere ha ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik (“Agba Ochie”), nke abụọ abụrụ Akwụkwọ Nsọ Grik (“Agba Ọhụrụ”). E kebiri akwụkwọ nke ọ bụla dị na Baịbụl n’isi n’isi nakwa n’amaokwu n’amaokwu. Ọ bụrụ na e dee aha akwụkwọ dị na Baịbụl, nọmba mbụ na-eso ya bụ isi ya, nọmba ọzọ na-eso ya abụrụ amaokwu ya. Dị ka ihe atụ, Jenesis 1:1 pụtara Jenesis isi mbụ, amaokwu mbụ.