Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 1

Ajụjụ nke 1: Ònye bụ Chineke?

“Ka ndị mmadụ mara na aha gị bụ Jehova nakwa na ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.”

Abụ Ọma 83:18

“Maranụ na Jehova bụ Chineke. Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị.”

Abụ Ọma 100:3

“Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m. Anaghị m enye onye ọzọ ùgwù ruuru m. Anaghịkwa m enye arụsị a pịrị apị otuto e kwesịrị inye m.”

Aịzaya 42:8

“A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.”

Ndị Rom 10:13

“N’eziokwu, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.”

Ndị Hibru 3:4

“Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a. Ònye kere ha? Ọ bụ Chineke, onye na-edu ha n’ìgwè, na-agụkwa ha ọnụ. Ọ na-akpọ ha niile aha n’otu n’otu. O nweghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ, n’ihi na ike ya dị egwu, ume ya enweghịkwa atụ.”

Aịzaya 40:26