Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 6

Ajụjụ nke 6: Olee amụma ndị dị na Baịbụl gbasara Mezaya?

AMỤMA

“Gịnwa, Betlehem Efrata, . . . ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta.”

Maịka 5:2

OTÚ O SI MEZUO

“Mgbe a mụrụ Jizọs na Betlehem nke Judia n’oge Herọd na-achị, ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa Jeruselem.”

Matiu 2:1

AMỤMA

“Ha kere uwe m, ha fekwaara uwe m nza.”

Abụ Ọma 22:18

OTÚ O SI MEZUO

“Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya ma kee ya ụzọ anọ . . . Ma uwe ime ya enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa si n’elu ruo n’ala. Ha gwara ibe ha, sị: ‘Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị fee nza iji mata onye ọ ga-abụ nke ya.’”

Jọn 19:23, 24

AMỤMA

“Ọ na-echebe ọkpụkpụ ya niile. E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.”

Abụ Ọma 34:20

OTÚ O SI MEZUO

“Ma mgbe ha rutere n’ebe Jizọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọla. N’ihi ya, ha akụjisịghị ya ụkwụ.”

Jọn 19:33

AMỤMA

“A mara ya ube n’ihi mmehie anyị.”

Aịzaya 53:5

OTÚ O SI MEZUO

“Ma otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ. Ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara.”

Jọn 19:34

AMỤMA

‘Ha kwụrụ m ụgwọ ọrụ m, mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.’

Zekaraya 11:12, 13

OTÚ O SI MEZUO

“Otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, gakwuuru ndị isi nchụàjà wee sị ha: ‘Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?’ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.”

Matiu 26:14, 15; 27:5