Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 15

Ajụjụ nke 15: Olee ihe ị ga na-eme ka ị na-enwe obi ụtọ?

“Ọ ka mma na ndị mmadụ na-eri naanị akwụkwọ nri ma hụ ibe ha n’anya kama ịna-ata anụ ehi gbara agba ma kpọọ ibe ha asị.”

Ilu 15:17

“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị. Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso.”

Aịzaya 48:17

“Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ, n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.”

Matiu 5:3

“Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gi.”

Matiu 22:39

“Na-emesokwanụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha na-emeso unu.”

Luk 6:31

“Ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”

Luk 11:28

“Mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”

Luk 12:15

“Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”

1 Timoti 6:8

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”

Ọrụ Ndịozi 20:35