Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Jenesis

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Otú e si kee eluigwe na ụwa (1, 2)

    • Ụbọchị isii e ji kee ụwa (3-31)

      • Ụbọchị nke 1: ìhè; ehihie na abalị (3-5)

      • Ụbọchị nke 2: mbara (6-8)

      • Ụbọchị nke 3: ala nkịtị na ahịhịa ndụ (9-13)

      • Ụbọchị nke 4: ihe ndị na-enye ìhè (14-19)

      • Ụbọchị nke 5: azụ̀ na nnụnụ (20-23)

      • Ụbọchị nke 6: anụmanụ na mmadụ (24-31)

  • 2

    • Chineke zuru ike n’ụbọchị nke asaa (1-3)

    • Jehova Chineke, Onye kere eluigwe na ụwa (4)

    • Nwoke na nwaanyị bi n’Iden (5-25)

      • E ji ájá kpụọ mmadụ (7)

      • Osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ (15-17)

      • Chineke kere nwaanyị (18-25)

  • 3

    • Otú mmadụ si mehie (1-13)

      • Ụgha mbụ (4, 5)

    • Ikpe Jehova mara ndị nnupụisi (14-24)

      • Amụma e buru gbasara nwa nwaanyị ahụ (15)

      • A chụpụrụ mmadụ ahụ n’Iden (23, 24)

  • 4

    • Ken na Ebel (1-16)

    • Ụmụ Ken (17-24)

    • Set na Ịnọsh nwa ya (25, 26)

  • 5

    • Malite n’oge Adam ruo n’oge Noa (1-32)

      • Adam mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị (4)

      • Ịnọk so Chineke na-eje ije (21-24)

  • 6

    • Ụmụ Chineke lụrụ ụmụ nwaanyị n’ụwa (1-3)

    • A mụrụ ndị Nefilim (4)

    • Ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme wutere Jehova (5-8)

    • A gwara Noa ka ọ rụọ ụgbọ (9-16)

    • Chineke kwuru na ya ga-eme ka mmiri tojuo n’ụwa (17-22)

  • 7

    • Noa na ezinụlọ ya banyere n’ụgbọ (1-10)

    • Mmiri zoro tochie ụwa (11-24)

  • 8

    • Mmiri talatara n’ụwa (1-14)

      • Noa zipụrụ otu nduru (8-12)

    • Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ pụta (15-19)

    • Nkwa Chineke kwere banyere ụwa (20-22)

  • 9

    • Iwu Chineke nyere mmadụ niile (1-7)

      • Iwu o nyere banyere ọbara (4-6)

    • Ọgbụgba ndụ eke na egwurugwu (8-17)

    • Amụma Noa buru gbasara ụmụ ya (18-29)

  • 10

    • Ebe mba dị iche iche si (1-32)

      • Ụmụ Jefet (2-5)

      • Ụmụ Ham (6-20)

        • Nimrọd mara Jehova aka (8-12)

      • Ụmụ Shem (21-31)

  • 11

    • Ụlọ elu a rụrụ na Babel (1-4)

    • Jehova ghagburu asụsụ ndị mmadụ (5-9)

    • Malite n’oge Shem ruo n’oge Ebram (10-32)

      • Ezinụlọ Tira (27)

      • Ebram si n’obodo Ọọ kwapụ (31)

  • 12

    • Ebram si na Heran kwapụ gawa Kenan (1-9)

      • Nkwa Chineke kwere Ebram (7)

    • Ebram na Seraị gara biri n’Ijipt (10-20)

  • 13

    • Ebram laghachiri Kenan (1-4)

    • Ebram na Lọt biwere iche iche (5-13)

    • Chineke kweghachiri Ebram nkwa (14-18)

  • 14

    • Ebram napụtara Lọt (1-16)

    • Melkizedek gọziri Ebram (17-24)

  • 15

    • Ndụ Chineke na Ebram gbara (1-21)

      • A ga-emesi ụmụ Ebram ike ruo afọ 400 (13)

      • Chineke kweghachiri Ebram nkwa (18-21)

  • 16

    • Hega na Ishmel (1-16)

  • 17

    • Ebreham ga-abụ nna ọtụtụ mba (1-8)

      • Aha Ebram ga-abụzi Ebreham (5)

    • Ọgbụgba ndụ ibi úgwù (9-14)

    • Aha Seraị ga-abụzi Sera (15-17)

    • E kwere Ebreham nkwa na ọ ga-amụta Aịzik (18-27)

  • 18

    • Ndị mmụọ ozi atọ gara n’ụlọ Ebreham (1-8)

    • Sera ga-amụta nwa nwoke; ọ chịrị ọchị (9-15)

    • Ebreham rịọrọ ka a ghara ibibi Sọdọm (16-33)

  • 19

    • Ndị mmụọ ozi gara n’ụlọ Lọt (1-11)

    • A gwara Lọt na ezinụlọ ya ka ha gbapụ (12-22)

    • E bibiri Sọdọm na Gọmọra (23-29)

      • Nwunye Lọt ghọrọ ogidi nnu (26)

    • Lọt na ụmụ ya (30-38)

      • Ebe obodo Moab na Amọn si (37, 38)

  • 20

    • A napụtara Sera n’aka Abimelek (1-18)

  • 21

    • A mụrụ Aịzik (1-7)

    • Ishmel ji Aịzik na-eme ihe ọchị (8, 9)

    • A chụpụrụ Hega na Ishmel (10-21)

    • Ndụ Ebreham na Abimelek gbara (22-34)

  • 22

    • A gwara Ebreham ka ọ chụọ Aịzik n’àjà (1-19)

      • A ga-esi n’aka nwa Ebreham gọzie mba niile (15-18)

    • Ezinụlọ Ribeka (20-24)

  • 23

    • Sera nwụrụ, e lie ya (1-20)

  • 24

    • A chọtaara Aịzik nwaanyị (1-58)

    • Ribeka lakwuuru Aịzik (59-67)

  • 25

    • Ebreham lụrụ nwaanyị ọzọ (1-6)

    • Ebreham nwụrụ (7-11)

    • Ụmụ Ishmel (12-18)

    • A mụrụ Jekọb na Ịsọ (19-26)

    • Ịsọ nyefere Jekọb ihe o kwesịrị inweta dị ka ọkpara (27-34)

  • 26

    • Aịzik na Ribeka gara biri na Gira (1-11)

      • Chineke kwere Aịzik nkwa o kweburu nna ya (3-5)

    • E sesara Aịzik okwu n’ihi olulu mmiri (12-25)

    • Ndụ Aịzik na Abimelek gbara (26-33)

    • Ụmụ nwaanyị Het Ịsọ lụrụ (34, 35)

  • 27

    • Aịzik gọziri Jekọb (1-29)

    • Ịsọ rịọrọ ka a gọzie ya, ma ihe o mere ewuteghị ya (30-40)

    • Ịsọ buuru Jekọb iwe n’obi (41-46)

  • 28

    • Aịzik zigara Jekọb Padan-eram (1-9)

    • Nrọ Jekọb rọrọ na Betel (10-22)

      • Chineke kwere Jekọb nkwa o kweburu nna ya (13-15)

  • 29

    • Jekọb na Rechel hụrụ (1-14)

    • Jekọb hụrụ Rechel n’anya (15-20)

    • Jekọb lụrụ Lia na Rechel (21-29)

    • Ụmụ anọ Lia mụụrụ Jekọb: Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda (30-35)

  • 30

    • Bilha mụrụ Dan na Naftalaị (1-8)

    • Zilpa mụrụ Gad na Asha (9-13)

    • Lia mụrụ Ịsaka na Zebulọn (14-21)

    • Rechel mụrụ Josef (22-24)

    • Jekọb nwekwuru ìgwè anụ ụlọ (25-43)

  • 31

    • Jekọb lawara Kenan n’agwaghị Leban (1-18)

    • Leban chụkwutere Jekọb (19-35))

    • Ndụ Jekọb na Leban gbara (36-55)

  • 32

    • Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jekọb (1, 2)

    • Jekọb jikeere ịga hụ Ịsọ (3-23)

    • Jekọb na mmụọ ozi gbara mgba (24-32)

      • Aha Jekọb ga-abụzi Izrel (28)

  • 33

    • Jekọb na Ịsọ hụrụ (1-16)

    • Jekọb garuru Shikem (17-20)

  • 34

    • E dinara Daịna (1-12)

    • Ụmụ Jekọb ghọrọ aghụghọ (13-31)

  • 35

    • Jekọb tụfuru chi ndị mba ọzọ (1-4)

    • Jekọb rutere Betel (5-15)

    • A mụrụ Benjamin; Rechel nwụrụ (16-20)

    • Ụmụ iri na abụọ Izrel mụrụ (21-26)

    • Aịzik nwụrụ (27-29)

  • 36

    • Ụmụ Ịsọ (1-30)

    • Ndị eze Ịdọm na ndị bụ́ ndị isi na ya (31-43)

  • 37

    • Nrọ Josef (1-11)

    • Josef na ụmụnne ya ndị na-enwere ya anyaụfụ (12-24)

    • E rere Josef, ya abụrụzie ohu (25-36)

  • 38

    • Juda na Tema (1-30)

  • 39

    • Josef jewere ozi n’ụlọ Pọtịfa (1-6)

    • Josef jụrụ ime ihe nwunye Pọtịfa kwuru (7-20)

    • A tụrụ Josef mkpọrọ (21-23)

  • 40

    • Josef kọwara nrọ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ (1-19)

      • ‘Ọ bụ Chineke na-akọwa nrọ’ (8)

    • Ememme ụbọchị a mụrụ Fero (20-23)

  • 41

    • Josef kọwara nrọ Fero (1-36)

    • Fero mere Josef onye ukwu (37-46a)

    • Josef malitere ikpokọta nri n’Ijipt (46b-57)

  • 42

    • Ụmụnne Josef gara Ijipt (1-4)

    • Josef hụrụ ụmụnne ya ma nwalee ha (5-25)

    • Ụmụnne Josef lọghachikwutere Jekọb (26-38)

  • 43

    • Ụmụnne Josef kpọ Benjamin gaghachi Ijipt (1-14)

    • Josef na ụmụnne ya hụrụ ọzọ (15-23)

    • Josef na ụmụnne ya riri nri (24-34)

  • 44

    • A hụrụ iko ọlaọcha Josef n’akpa Benjamin (1-17)

    • Juda rịọchiteere Benjamin arịrịọ (18-34)

  • 45

    • Josef gwara ụmụnne ya onye ọ bụ (1-15)

    • Ụmụnne Josef lawara ịga kpọta Jekọb (16-28)

  • 46

    • Jekọb na ndị ezinụlọ ya kwagara Ijipt (1-7)

    • Aha ndị kwagara Ijipt (8-27)

    • Josef gara Goshen ịhụ Jekọb (28-34)

  • 47

    • Jekọb gara hụ Fero (1-12)

    • Josef gosiri na ọ ma ihe (13-26)

    • Izrel biweziri na Goshen (27-31)

  • 48

    • Jekọb gọziri ụmụ Josef (1-12)

    • A gọziri Ifrem karịa nwanne ya (13-22)

  • 49

    • Amụma Jekọb buru mgbe ọ na-anwụ (1-28)

      • Shaịlo ga-esi n’agbụrụ Juda (10)

    • Jekọb kwuru ebe ọ chọrọ ka e lie ya (29-32)

    • Jekọb nwụrụ (33)

  • 50

    • Josef liri Jekọb na Kenan (1-14)

    • Josef gwara ụmụnne ya ọzọ na ya agbagharala ha (15-21)

    • Ihe ndị mere ụbọchị ole na ole tupu Josef anwụọ (22-26)

      • Ihe Josef kwuru ka e mee ọkpụkpụ ya (25)