Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ndị Izrel mụbara n’Ijipt (1-7)

    • Fero megbuwere ndị Izrel (8-14)

    • Ụmụ nwaanyị na-aghọ́ nwa hapụrụ ụmụ nwoke ndụ (15-22)

  • 2

    • A mụrụ Mosis (1-4)

    • Ada Fero kpọọrọ Mosis, ya abụrụ nwa ya (5-10)

    • Mosis gbagara Midian ma lụọ Zipora (11-22)

    • Chineke nụrụ ude ndị Izrel na-asụ (23-25)

  • 3

    • Mosis na osisi ogwu ọkụ na-enwu na ya (1-12)

    • Jehova kọwara aha ya (13-15)

    • Jehova gwara Mosis ihe ọ chọrọ ka o mee (16-22)

  • 4

    • Ihe àmà atọ a gwara Mosis mee (1-9)

    • Mosis chere na ya erughị eru ịrụ ọrụ e nyere ya (10-17)

    • Mosis laghachiri Ijipt (18-26)

    • Mosis gakwuuru Erọn (27-31)

  • 5

    • Mosis na Erọn gakwuuru Fero (1-5)

    • E mesikwuru ndị Izrel ike (6-18)

    • Ndị Izrel tawara Mosis na Erọn ụta (19-23)

  • 6

    • Jehova kweghachiri nkwa na ndị Izrel ga-enwere onwe ha (1-13)

      • A matachaghị aha Jehova (2, 3)

    • Usoro ọmụmụ Mosis na Erọn (14-27)

    • A gwara Mosis ka ọ gakwuru Fero ọzọ (28-30)

  • 7

    • Jehova gbara Mosis ume (1-7)

    • Mkpara Erọn ghọrọ nnukwu agwọ (8-13)

    • Ahụhụ nke mbụ: mmiri ghọrọ ọbara (14-25)

  • 8

    • Ahụhụ nke abụọ: mbàrá (1-15)

    • Ahụhụ nke atọ: anwụnta (16-19)

    • Ahụhụ nke anọ: odudu (20-32)

      • A gaghị enwe odudu na Goshen (22, 23)

  • 9

    • Ahụhụ nke ise: anụ ụlọ nwụsịrị (1-7)

    • Ahụhụ nke isii: etuto ọjọọ toro ndị mmadụ na anụmanụ (8-12)

    • Ahụhụ nke asaa: akụ́ mmiri ígwé (13-35)

      • Fero ga-ahụ ike Chineke (16)

      • A ga-akọsa aha Jehova (16)

  • 10

    • Ahụhụ nke asatọ: igurube (1-20)

    • Ahụhụ nke itoolu: oké ọchịchịrị (21-29)

  • 11

    • A mara ọkwa ahụhụ nke iri (1-10)

      • A gwara ndị Izrel ka ha rịọta ndị Ijipt onyinye (2)

  • 12

    • A malitere ime Ememme Ngabiga (1-28)

      • A ga-efesa ọbara n’awara ụzọ (7)

    • Ahụhụ nke iri: e gburu nwa mbụ ọ bụla (29-32)

    • Ndị Izrel si n’Ijipt pụwa (33-42)

      • Afọ 430 gwụrụ (40, 41)

    • Ndị ga-eso eri anụ Ememme Ngabiga (43-51)

  • 13

    • Ọ bụ Jehova nwe oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ (1, 2)

    • Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko (3-10)

    • A ga-ewepụtara Chineke oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ (11-16)

    • E du ndị Izrel gawa n’ụzọ Oké Osimiri Uhie (17-20)

    • Ogidi ígwé ojii na ogidi ọkụ (21, 22)

  • 14

    • Ndị Izrel ruru n’Oké Osimiri Uhie (1-4)

    • Fero chụwara ndị Izrel (5-14)

    • Ndị Izrel gafere Oké Osimiri Uhie (15-25)

    • Oké osimiri riri ndị Ijipt (26-28)

    • Ndị Izrel nwere okwukwe na Jehova (29-31)

  • 15

    • Abụ mmeri Mosis na ndị Izrel bụrụ (1-19)

    • Miriam so ụmụ nwoke bụọ abụ (20, 21)

    • E mere ka mmiri na-elu ilu tọwa ụtọ (22-27)

  • 16

    • Ndị Izrel katọrọ Mosis n’ihi nri (1-3)

    • Jehova nụrụ ntamu ndị Izrel (4-12)

    • E nyere ndị Izrel nnụnụ kwel na mana (13-21)

    • Mana agaghị ada n’Ụbọchị Izu Ike (22-30)

    • E dowere mana ka ọ bụrụ ihe ncheta (31-36)

  • 17

    • Ndị Izrel katọrọ Mosis maka na mmiri adịghị na Horeb (1-4)

    • Mmiri si n’oké nkume gbapụta (5-7)

    • Ndị Amalek lụsoro ndị Izrel agha, e merie ha (8-16)

  • 18

    • Jetro na Zipora bịara (1-12)

    • Jetro gwara Mosis ka ọ họpụta ndị ikpe (13-27)

  • 19

    • Ndị Izrel rutere n’Ugwu Saịnaị (1-25)

      • Izrel ga-abụ alaeze nke ndị nchụàjà na-achị na ya (5, 6)

      • E mere ka ndị Izrel dị nsọ maka ịbịakwute Chineke (14, 15)

  • 20

    • Iwu Iri (1-17)

    • Egwu tụrụ ndị Izrel n’ihi ihe ha hụrụ ma nụ (18-21)

    • A gwara ndị Izrel otú ha ga-esi na-efe Chineke (22-26)

  • 21

    • Iwu e nyere ndị Izrel (1-36)

      • Gbasara ndị Hibru bụ́ ndị ohu (2-11)

      • Gbasara iti mmadụ ihe ma ọ bụ ịkụgbu mmadụ (12-27)

      • Gbasara anụmanụ (28-36)

  • 22

    • Iwu e nyere ndị Izrel (1-31)

      • Gbasara izu ohi (1-4)

      • Gbasara imebi ihe a kụrụ n’ubi (5, 6)

      • Gbasara ịkwụ mmadụ ụgwọ ihe ya (7-15)

      • Gbasara ịrafu mmadụ (16, 17)

      • Gbasara ife Chineke na imegbu mmadụ (18-31)

  • 23

    • Iwu e nyere ndị Izrel (1-19)

      • Gbasara omume ọma na ịkwụwa aka ọtọ (1-9)

      • Gbasara ụbọchị izu ike na ememme dị iche iche (10-19)

    • Mmụọ ozi ga-edu ndị Izrel (20-26)

    • Ala ndị Izrel ga-ebichi na ókè ha (27-33)

  • 24

    • Ndị Izrel kwetara ime ihe Jehova gwara ha (1-11)

    • Mgbe Mosis gara n’Ugwu Saịnaị (12-18)

  • 25

    • Onyinye ndị e wetara maka ụlọikwuu (1-9)

    • Igbe (10-22)

    • Tebụl (23-30)

    • Ihe e ji adọsa ọkụ (31-40)

  • 26

    • Ụlọikwuu (1-37)

      • Ákwà ụlọikwuu (1-14)

      • Frem na ntọala ndị nwere oghere (15-30)

      • Ákwà mgbochi na ákwà ngebichi (31-37)

  • 27

    • Ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ (1-8)

    • Ogige ụlọikwuu (9-19)

    • Mmanụ e ji amụ ọkụ (20, 21)

  • 28

    • Uwe ndị nchụàjà (1-5)

    • Efọd (6-14)

    • Akpa a na-anya n’obi (15-30)

      • Yurim na Tọmịm (30)

    • Uwe na-enweghị aka (31-35)

    • Ákwà isi e kenyere ihe mbadamba e ji ọlaedo mee (36-39)

    • Ihe ndị ọzọ ndị nchụàjà ga-eyi (40-43)

  • 29

    • E mere Erọn na ụmụ ya ndị nchụàjà (1-37)

    • Àjà a ga na-achụ kwa ụbọchị (38-46)

  • 30

    • Ebe ịchụàjà insens (1-10)

    • Ụmụ nwoke ga-akwụ ụgwọ iji gbara ndụ ha ma a gụọ ha ọnụ (11-16)

    • Nnukwu ite e ji ọla kọpa kpụọ a gbanyere mmiri (17-21)

    • Ihe ndị pụrụ iche e ji mee mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ (22-33)

    • Ihe ndị e ji eme insens nsọ (34-38)

  • 31

    • Mmụọ nsọ Chineke jupụtara n’ime ndị nwere nkà (1-11)

    • Ụbọchị Izu Ike bụ ihe àmà dị n’etiti Chineke na Izrel (12-17)

    • Mbadamba nkume abụọ (18)

  • 32

    • Ndị Izrel fere nwa ehi ọlaedo (1-35)

      • Mosis nụrụ ụda abụ ndị Izrel (17, 18)

      • Mosis kụriri mbadamba nkume ndị e dere iwu (19)

      • Ụmụ Livaị rubeere Jehova isi (26-29)

  • 33

    • Chineke baara ndị Izrel mba (1-6)

    • A mara ụlọikwuu nzute n’ebe dịpụtụrụ adịpụ (7-11)

    • Mosis rịọrọ Jehova ka o gosi ya ebube ya (12-23)

  • 34

    • Mosis wapụtara mbadamba nkume abụọ ọzọ (1-4)

    • Mosis hụrụ ebube Jehova (5-9)

    • Chineke kwughachiri ọgbụgba ndụ ya na Izrel (10-28)

    • Ihu Mosis nwuru ka ìhè (29-35)

  • 35

    • Ntụziaka gbasara Ụbọchị Izu Ike (1-3)

    • Onyinye ndị e wetara maka ụlọikwuu (4-29)

    • Mmụọ Chineke jupụtara n’ime Bezalel na Oholiab (30-35)

  • 36

    • Onyinye ndị e wetara karịrị akarị (1-7)

    • A rụwara ụlọikwuu ahụ (8-38)

  • 37

    • A rụrụ Igbe ahụ (1-9)

    • Tebụl (10-16)

    • Ihe e ji adọsa ọkụ (17-24)

    • Ebe ịchụàjà insens (25-29)

  • 38

    • Ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ (1-7)

    • Nnukwu ite e ji ọla kọpa kpụọ (8)

    • Ogige ụlọikwuu (9-20)

    • E depụtara ihe ndị e ji rụọ ụlọikwuu ahụ (21-31)

  • 39

    • A kpara uwe ndị nchụàjà (1)

    • Efọd 2-7)

    • Akpa a na-anya n’obi (8-21)

    • Uwe na-enweghị aka (22-26)

    • Ihe ndị ọzọ ndị nchụàjà ga-eyi (27-29)

    • Ihe mbadamba e ji ọlaedo mee (30, 31)

    • Mosis leruru ihe ndị a rụrụ anya (32-43)

  • 40

    • A mara ụlọikwuu ahụ (1-33)

    • Ebube Jehova juru n’ụlọikwuu ahụ (34-38)