Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Samuel nke Mbụ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Elkena na ndị nwunye ya abụọ (1-8)

    • Mgbe Hana na-amụtabeghị nwa, o kpere ekpere ka ọ mụta nwa nwoke (9-18)

    • Hana mụrụ Samuel, nyekwa ya Jehova (19-28)

  • 2

    • Ekpere Hana kpere (1-11)

    • Ihe ọjọọ ụmụ Ịlaị abụọ na-eme (12-26)

    • Jehova kpere ezinụlọ Ịlaị ikpe (27-36)

  • 3

    • Jehova họpụtara Samuel ka ọ bụrụ onye amụma (1-21)

  • 4

    • Ndị Filistia buuru Igbe Ọgbụgba Ndụ (1-11)

    • Ịlaị na ụmụ ya nwụrụ (12-22)

  • 5

    • Mgbe ndị Filistia bu Igbe Ọgbụgba Ndụ laa n’ala ha (1-12)

      • E menyere Degọn ihere (1-5)

      • A tara ndị Filistia ahụhụ (6-12)

  • 6

    • Ndị Filistia bughachiri Igbe Ọgbụgba Ndụ n’Izrel (1-21)

  • 7

    • Ndị Kiriat-jierim gara bulata Igbe Ọgbụgba Ndụ (1)

    • Samuel gwara ndị Izrel ka ha na-efe naanị Jehova (2-6)

    • Ndị Izrel nọ na Mizpa merie ndị Filistia (7-14)

    • Samuel nọ na-ekpere ndị Izrel ikpe (15-17)

  • 8

    • Ndị Izrel gwara Samuel ka ọ họpụtara ha eze (1-9)

    • Samuel gwara ndị Izrel ihe eze ha ga na-eme ha (10-18)

    • Jehova họpụtaara ndị Izrel eze otú ha chọrọ (19-22)

  • 9

    • Samuel na Sọl nọkọrọ (1-27)

  • 10

    • E tere Sọl mmanụ ka ọ bụrụ eze (1-16)

    • A kpọpụtara Sọl, gwa ndị Izrel na ọ bụ ya ga-abụ eze ha (17-27)

  • 11

    • Sọl meriri ndị Amọn (1-11)

    • E mere ka o doo anya na Sọl abụrụla eze (12-15)

  • 12

    • Okwu ikpeazụ Samuel gwara ndị Izrel (1-25)

      • ‘Unu esokwala chi ndị na-abaghị uru ọ bụla’ (21)

      • Jehova agaghị ahapụ ndị ya (22)

  • 13

    • Sọl họpụtara ndị ga na-aga agha (1-4)

    • Sọl mere ihe a na-enyeghị ya ikike ime (5-9)

    • Samuel baara Sọl mba (10-14)

    • Ndị Izrel enweghị ngwá agha (15-23)

  • 14

    • Ike Jonatan nọ na Mikmash kpaa (1-14)

    • Chineke mere ka ndị Izrel merie ndị iro ha (15-23)

    • Sọl ebughị ụzọ chee echiche tupu ya emee ka ndị Izrel ṅụọ iyi (24-46)

      • Ndị mmadụ nọ na-erikọta anụ na ọbara ya (32-34)

    • Ezinụlọ Sọl na agha Sọl lụrụ (47-52)

  • 15

    • Sọl nupụrụ isi hapụ igbu Egag (1-9)

    • Samuel baara Sọl mba (10-23)

      • “Ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà” (22)

    • Jehova jụrụ Sọl ka ọ gharazie ịbụ eze (24-29)

    • Samuel gburu Egag (30-35)

  • 16

    • Samuel tere Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl (1-13)

      • “Jehova na-ahụ ihe dị n’obi” (7)

    • Mmụọ Chineke si n’ime Sọl pụọ (14-17)

    • Devid ghọrọ onye na-akpọrọ Sọl ụbọ akwara (18-23)

  • 17

    • Devid meriri Golayat (1-58)

      • Golayat na-echere ndị Izrel aka mgba (8-10)

      • Devid kwuru na ya ga-alụso Golayat agha (32-37)

      • Devid ji aha Jehova lụso Golayat agha (45-47)

  • 18

    • Devid na Jonatan ghọrọ enyi (1-4)

    • Otú Devid si emeri n’agha mere ka Sọl nwewere ya anyaụfụ (5-9)

    • Sọl nwara igbu Devid (10-19)

    • Devid lụrụ Maịkal nwa Sọl (20-30)

  • 19

    • Sọl kpọkwuru Devid asị (1-13)

    • Devid gbara ọsọ mgbe Sọl chọrọ igbu ya (14-24)

  • 20

    • Jonatan akwụsịghị ịna-akwado Devid (1-42)

  • 21

    • Devid tara achịcha dị nsọ mgbe ọ gara Nọb (1-9)

    • Devid mere ka onye isi na-adịghị mma mgbe ọ gara Gat (10-15)

  • 22

    • Devid gara Adọlam, gaakwa Mizpe (1-5)

    • Sọl nyere iwu ka e gbuo ndị nchụàjà nọ na Nọb (6-19)

    • Abayata gbara ọsọ (20-23)

  • 23

    • Devid napụtara ndị bi na Kaịla (1-12)

    • Sọl nọ na-achụgharị Devid (13-15)

    • Jonatan gara gbaa Devid ume (16-18)

    • Ọ fọrọ obere ka Sọl jide Devid (19-29)

  • 24

    • Devid ekweghị ka e gbuo Sọl (1-22)

      • Devid kwanyeere onye Jehova tere mmanụ ùgwù (6)

  • 25

    • Mgbe Samuel nwụrụ (1)

    • Nebal anabataghị ndị Devid ziri ozi (2-13)

    • Abigel kpara àgwà onye ma ihe (14-35)

      • ‘Jehova ga-echebe gị otú mmadụ si echebe ihe e kechiri n’akpa’ (29)

    • Jehova mere ka Nebal onye nzuzu nwụọ (36-38)

    • Abigel ghọrọ nwunye Devid (39-44)

  • 26

    • Devid ekweghịkwa ọzọ ka e gbuo Sọl (1-25)

      • Devid kwanyeere onye Jehova tere mmanụ ùgwù (11)

  • 27

    • Ndị Filistia nyere Devid Ziklag (1-12)

  • 28

    • Sọl gara na nke nwaanyị na-agba afa n’En-dọọ (1-25)

  • 29

    • Ndị Filistia atụkwasịghị Devid obi (1-11)

  • 30

    • Ndị Amalek lụsoro ndị bi na Ziklag agha, gbaakwa ya ọkụ (1-6)

      • Obi siri Devid ike maka na ọ tụkwasịrị Chineke obi (6)

    • Devid meriri ndị Amalek (7-31)

      • Devid napụtara ndị Amalek ndị niile ha kpụụrụ (18, 19)

      • Otú Devid kwuru ka e si kee ihe ndị ha lụtara n’agha (23, 24)

  • 31

    • Mgbe Sọl na ụmụ ya atọ nwụrụ (1-13)