Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Devid na Abishag (1-4)

    • Adọnaịja nwara iweghara ọchịchị (5-10)

    • Netan na Bat-shiba kụghasịrị atụmatụ Adọnaịja (11-27)

    • Devid kwuru ka e tee Solomọn mmanụ (28-40)

    • Adọnaịja gbagara n’ebe ịchụàjà (41-53)

  • 2

    • Devid gwara Solomọn ihe ndị ọ ga-eme (1-9)

    • Devid nwụrụ, Solomọn achịwazie (10-12)

    • Nkata Adọnaịja kpara tara isi ya (13-25)

    • A chụpụrụ Abayata, gbuo Joab (26-35)

    • E gburu Shimiaị (36-46)

  • 3

    • Solomọn lụrụ nwa Fero (1-3)

    • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ (4-15)

      • Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (7-9)

    • Solomọn kpeere ụmụ nwaanyị abụọ na-azọ nwa ikpe (16-28)

  • 4

    • Ndị na-enyere Solomọn aka n’ọchịchị (1-19)

    • Ihe na-agaziri ndị mmadụ mgbe Solomọn na-achị (20-28)

      • Obi ruru onye ọ bụla ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya (25)

    • Amamihe Solomọn na ilu ndị ọ tụrụ (29-34)

  • 5

    • Eze Haịram buteere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ụlọ (1-12)

    • Ndị Solomọn kpọọrọ ka ha na-arụrụ ya ọrụ (13-18)

  • 6

    • Solomọn rụrụ ụlọ nsọ (1-38)

      • Ọnụ ụlọ dị n’ime ime (19-22)

      • Cherob abụọ (23-28)

      • Ihe ndị a tụrụ atụ, ibo ụzọ abụọ, na ogige dị n’ime (29-36)

      • E ji ihe dị ka afọ asaa rụchaa ụlọ nsọ (37, 38)

  • 7

    • Obí Solomọn (1-12)

    • Haịram ji ezigbo nkà o nwere nyere Solomọn aka (13-47)

      • Ogidi ọla kọpa abụọ (15-22)

      • Nnukwu efere a na-akpọ Oké Osimiri (23-26)

      • Ihe iri e ji ebu ihe na efere iri e ji ọla kọpa rụọ (27-39)

    • A rụchara ihe niile e ji ọlaedo na-arụ (48-51)

  • 8

    • E bubatara igbe ọgbụgba ndụ n’ụlọ nsọ (1-13)

    • Solomọn gwara ndị Izrel okwu (14-21)

    • Ekpere Solomọn kpere iji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (22-53)

    • Solomọn gọziri ndị Izrel (54-61)

    • A chụrụ àjà, meekwa ememme e ji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (62-66)

  • 9

    • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ọzọ ná nrọ (1-9)

    • Onyinye Solomọn nyere Eze Haịram (10-14)

    • Ihe dị iche iche Solomọn rụrụ (15-28)

  • 10

    • Eze nwaanyị Shiba gara na nke Solomọn (1-13)

    • Akụnụba Solomọn enweghị atụ (14-29)

  • 11

    • Ndị nwunye Solomọn mere ka obi ya pụọ n’ife Chineke (1-13)

    • Ndị iro Solomọn (14-25)

    • E kwere Jeroboam nkwa na ọ ga-achị ebo iri n’Izrel (26-40)

    • Solomọn nwụrụ, Rehoboam achịwazie (41-43)

  • 12

    • Rehoboam gwara ndị Izrel okwu ọjọọ (1-15)

    • Ebo iri nupụụrụ Rehoboam isi (16-19)

    • E chiri Jeroboam eze Izrel (20)

    • A gwara Rehoboam ka ọ ghara ịlụso ndị Izrel agha (21-24)

    • Jeroboam kpụrụ nwa ehi ọlaedo a na-efe ofufe (25-33)

  • 13

    • E buru amụma ihe ga-eme ebe ịchụàjà dị na Betel (1-10)

      • Ebe ịchụàjà ahụ gbawara (5)

    • Onye nke Chineke nupụrụ isi (11-34)

  • 14

    • Ahaịja buru amụma ihe ga-eme Jeroboam (1-20)

    • Rehoboam nọ na-achị Juda (21-31)

      • Shaịshak bịara lụso Jeruselem agha (25, 26)

  • 15

    • Abaịjam malitere ịchị Juda (1-8)

    • Esa malitere ịchị Juda (9-24)

    • Nedab malitere ịchị Izrel (25-32)

    • Beasha malitere ịchị Izrel (33, 34)

  • 16

    • Jehova kwuru ihe ga-eme Beasha (1-7)

    • Ịla malitere ịchị Izrel (8-14)

    • Zimraị malitere ịchị Izrel (15-20)

    • Ọmraị malitere ịchị Izrel (21-28)

    • Ehab malitere ịchị Izrel (29-33)

    • Hayel rụsiri Jeriko ike (34)

  • 17

    • Ịlaịja buru amụma na mmiri agaghị ezo n’Izrel (1)

    • Ugoloọma nọ na-ewetara Ịlaịja nri (2-7)

    • Ịlaịja gara na nke otu nwaanyị isi mkpe na Zarefat (8-16)

    • Nwa otu nwaanyị isi mkpe nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ (17-24)

  • 18

    • Ịlaịja gara hụ Obedaya na Ehab (1-18)

    • Ịlaịja na ndị amụma Bel gara n’ugwu Kamel (19-40)

      • “Olee mgbe unu ga-akwụsị ịkwụ ụzọ ebe abụọ?” (21)

    • Afọ atọ na ọkara mmiri na-ezoghị gafere (41-46)

  • 19

    • Ịlaịja gbara ọsọ ndụ ka Jezibel ghara igbu ya (1-8)

    • Jehova mere ka Ịlaịja hụ ya n’ugwu Horeb (9-14)

    • Ịlaịja ga-ete Hazel, Jihu, na Ịlaịsha mmanụ (15-18)

    • A họpụtara Ịlaịsha ka ọ nọchie Ịlaịja (19-21)

  • 20

    • Ndị Siria gara lụso Ehab agha (1-12)

    • Ehab meriri ndị Siria (13-34)

    • E buru ihe ga-eme Ehab n’amụma (35-43)

  • 21

    • Ehab chọrọ ịnara Nebọt ubi vaịn ya (1-4)

    • Jezibel kpara nkata, e gbuo Nebọt (5-16)

    • Ịlaịja kwuru ihe ga-eme Ehab (17-26)

    • Ehab wedara onwe ya ala (27-29)

  • 22

    • Jehoshafat na Ehab jikọrọ aka na-eme ihe (1-12)

    • Mịkaya buru amụma na a ga-emeri Ehab n’agha (13-28)

      • Otu mmụọ ozi ga-eme ka ndị amụma ghaara Ehab ụgha, rafuo ya (21, 22)

    • E gburu Ehab na Remọt-gilied (29-40)

    • Otú ihe dị mgbe Jehoshafat na-achị Juda (41-50)

    • Ehazaya malitere ịchị Izrel (51-53)