Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (1-12)

    • Akụnụba Solomọn (13-17)

  • 2

    • Solomọn kwadebere maka ịrụ ụlọ nsọ (1-18)

  • 3

    • Solomọn malitere ịrụ ụlọ nsọ (1-7)

    • Ebe Kacha Nsọ (8-14)

    • Ogidi abụọ e ji ọla kọpa rụọ (15-17)

  • 4

    • Ebe ịchụàjà, otu nnukwu efere a na-akpọ Oké Osimiri, na efere iri (1-6)

    • Ihe ndị e ji adọsa ọkụ, tebụl iri, na ogige abụọ (7-11a)

    • A rụchara ihe ndị e ji chọọ ụlọ nsọ mma (11b-22)

  • 5

    • Otú e si kwadebe inyefe Chineke ụlọ nsọ ya (1-14)

      • E bubatara igbe ọgbụgba ndụ n’ụlọ nsọ ahụ (2-10)

  • 6

    • Solomọn gwara ndị Izrel okwu (1-11)

    • Ekpere Solomọn ji nyefee Chineke ụlọ nsọ (12-42)

  • 7

    • Ebube Jehova jupụtara n’ụlọ nsọ ya (1-3)

    • Ememme ndị Izrel ji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (4-10)

    • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ (11-22)

  • 8

    • Ihe ndị ọzọ Solomọn rụrụ (1-11)

    • Solomọn haziri otú a ga-esi na-efe Chineke n’ụlọ nsọ (12-16)

    • Ụgbọ mmiri ndị e ziteere Solomọn (17, 18)

  • 9

    • Eze nwaanyị Shiba gara leta Solomọn (1-12)

    • Akụnụba Solomọn (13-28)

    • Mgbe Solomọn nwụrụ (29-31)

  • 10

    • Ndị Izrel gwara Rehoboam na o nweghị ihe jikọrọ ha na ya (1-19)

  • 11

    • Ihe Rehoboam mere mgbe ọ na-achị (1-12)

    • Ndị Livaị ndị ji obi ha niile na-efe Chineke gara biri na Juda (13-17)

    • Ezinụlọ Rehoboam (18-23)

  • 12

    • Shaịshak lụsoro Jeruselem agha (1-12)

    • Mgbe Eze Rehoboam nwụrụ (13-16)

  • 13

    • Abaịja malitere ịchị Juda (1-22)

      • Abaịja meriri Jeroboam (3-20)

  • 14

    • Mgbe Abaịja nwụrụ (1)

    • Esa malitere ịchị Juda (2-8)

    • Esa meriri ndị Etiopia dị otu nde (9-15)

  • 15

    • Ihe ọma dị iche iche Esa mere (1-19)

  • 16

    • Esa gakwuuru ndị Siria ka ha nyere ya aka (1-6)

    • Hanenaị baara Esa mba (7-10)

    • Mgbe Esa nwụrụ (11-14)

  • 17

    • Jehoshafat malitere ịchị Juda (1-6)

    • A gara kụziere ndị nọ n’obodo ndị dị na Juda ihe (7-9)

    • Ndị agha Jehoshafat (10-19)

  • 18

    • Jehoshafat na Ehab gbakọrọ aka na-eme ihe (1-11)

    • Mịkaya buru amụma na a ga-emeri ndị Izrel n’agha (12-27)

    • E gburu Ehab na Remọt-gilied (28-34)

  • 19

    • Jihu baara Jehoshafat mba (1-3)

    • Ihe ọma dị iche iche Jehoshafat mere (4-11)

  • 20

    • Mba ndị bi ndị Juda nso bịara ịlụso ha agha (1-4)

    • Jehoshafat rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka (5-13)

    • Jehova zara ekpere ya (14-19)

    • Chineke rụrụ ọrụ ebube zọpụta ndị Juda (20-30)

    • Mgbe Eze Jehoshafat nwụrụ (31-37)

  • 21

    • Jehoram malitere ịchị Juda (1-11)

    • Ịlaịja detaara Jehoram akwụkwọ ozi (12-15)

    • Jehoram nwụrụ ọnwụ ihere (16-20)

  • 22

    • Ehazaya malitere ịchị Juda (1-9)

    • Atalaya weghaara ọchịchị n’ike (10-12)

  • 23

    • Jehoyada nyere aka e chie Jehoash eze (1-11)

    • E gburu Atalaya (12-15)

    • Ihe ọma dị iche iche Jehoyada mere (16-21)

  • 24

    • Ọchịchị Jehoash (1-3)

    • Jehoash rụziri ụlọ nsọ Chineke (4-14)

    • Jehoash malitere ife arụsị (15-22)

    • Ndị na-ejere Jehoash ozi gara gbuo ya (23-27)

  • 25

    • Amazaya malitere ịchị Juda (1-4)

    • Amazaya na ndị Ịdọm lụrụ agha (5-13)

    • Amazaya fere arụsị (14-16)

    • Amazaya na Jehoash eze Izrel lụrụ agha (17-24)

    • Mgbe Amazaya nwụrụ (25-28)

  • 26

    • Ọzaya malitere ịchị Juda (1-5)

    • Ike ndị Ọzaya kpara n’agha (6-15)

    • Chineke mere ka Ọzaya rịawa ekpenta n’ihi na ọ dị mpako (16-21)

    • Mgbe Ọzaya nwụrụ (22, 23)

  • 27

    • Jotam malitere ịchị Juda (1-9)

  • 28

    • Ehaz malitere ịchị Juda (1-4)

    • Ndị Siria na ndị Izrel meriri ndị Juda n’agha (5-8)

    • Oded dụrụ ndị Izrel ọdụ (9-15)

    • E wedara ndị Juda ala (16-19)

    • Mgbe Ehaz malitere ife arụsị na mgbe ọ nwụrụ (20-27)

  • 29

    • Hezekaya malitere ịchị Juda (1, 2)

    • Ihe ọma ndị Hezekaya mere (3-11)

    • E mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (12-19)

    • A maliteghachiri ịrụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ nsọ (20-36)

  • 30

    • Hezekaya mere Ememme Ngabiga (1-27)

  • 31

    • Hezekaya bibiri ihe ndị e ji efe arụsị (1)

    • A malitere ilekọta ndị nchụàjà na ndị Livaị nke ọma (2-21)

  • 32

    • Senakerib gara ka ọ lụso Jeruselem agha (1-8)

    • Senakerib mara Jehova aka (9-19)

    • Otu mmụọ ozi gara sụọ ndị agha Asiria akwụ (20-23)

    • Mgbe Hezekaya rịara ọrịa na mgbe ọ bịara dị mpako (24-26)

    • Otú ihe si gaziere Hezekaya na mgbe ọ nwụrụ (27-33)

  • 33

    • Manase malitere ịchị Juda (1-9)

    • Manase chegharịrị ná mmehie ya (10-17)

    • Mgbe Manase nwụrụ (18-20)

    • Amọn malitere ịchị Juda (21-25)

  • 34

    • Josaya malitere ịchị Juda (1, 2)

    • Ihe ọma ndị Josaya mere (3-13)

    • A hụrụ akwụkwọ e dere Iwu Chineke (14-21)

    • ọlda buru amụma na ndị Juda ga-ahụsi anya (22-28)

    • Josaya gụpụtaara ndị obodo ya akwụkwọ e dere Iwu Chineke (29-33)

  • 35

    • Josaya haziri Ememme Ngabiga pụrụ iche (1-19)

    • Fero Niko eze Ijipt gburu Josaya (20-27)

  • 36

    • Jehoahaz malitere ịchị Juda (1-3)

    • Jehoyakim malitere ịchị Juda (4-8)

    • Jehoyakin malitere ịchị Juda (9, 10)

    • Zedekaya malitere ịchị Juda  (11-14)

    • E bibiri Jeruselem (15-21)

    • Saịrọs nyere iwu ka a rụghachi ụlọ nsọ Chineke (22, 23)