Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Job

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Job bara ọgaranya, na-akwụwa aka ọtọ (1-5)

    • Setan kwuru na ọ bụghị n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke (6-12)

    • Akụnụba Job lara n’iyi, ụmụ ya anwụọkwa (13-19)

    • Job ataghị Chineke ụta (20-22)

  • 2

    • Setan kwuru ọzọ na ọ bụghị n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke (1-5)

    • A hapụrụ Setan ka o mee ka Job rịawa ọrịa (6-8)

    • Nwunye Job sịrị: “Kpọọ Chineke iyi nwụọ” (9, 10)

    • Ndị enyi Job atọ bịara (11-13)

  • 3

    • Job bụrụ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ (1-26)

      • Ọ jụrụ ihe mere o ji na-ata ahụhụ (20, 21)

  • 4

    • Okwu mbụ Elifaz kwuru (1-21)

      • O kwuru na aka Job adịghị ọcha (7, 8)

      • Ihe otu mmụọ gwara ya (12-17)

      • ‘Chineke atụkwasịghị ndị ohu ya obi’ (18)

  • 5

    • Elifaz ka na-ekwu okwu mbụ ya (1-27)

      • ‘Chineke na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha’ (13)

      • ‘Ajụla aka ná ntị Chineke na-adọ gị’ (17)

  • 6

    • Job sara ihe a gwara ya (1-30)

      • O kwuru na ákwá ọ na-ebe ziri ezi (2-6)

      • Ndị bịara ịkasi ya obi na-aghọ ya aghụghọ (15-18)

      • “Eziokwu anaghị afụ ụfụ” (25)

  • 7

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-21)

      • Ndụ mmadụ dị ka ebe a manyere ya ịrụ ọrụ ike (1, 2)

      • “Gịnị mere o ji bụrụ m ka i lekwasịrị anya?” (20)

  • 8

    • Okwu mbụ Bildad kwuru (1-22)

      • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na ụmụ Job mehiere (4)

      • ‘Ọ bụrụ na ị na-eme ezi omume, Chineke ga-echebe gị’ (6)

      • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job anaghị asọpụrụ Chineke (13)

  • 9

    • Job sara ihe a gwara ya (1-35)

      • Mmadụ efu enweghị ike ịrụ Chineke ụka (2-4)

      • ‘Chineke na-eme ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta’ (10)

      • Mmadụ enweghị ike ịsa Chineke okwu (32)

  • 10

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-22)

      • ‘Gịnị mere Chineke ji esesa m okwu?’ (2)

      • Chineke adịghị ka Job, bụ́ mmadụ efu (4-12)

      • ‘Ka m kurutụ ume’ (20)

  • 11

    • Okwu mbụ Zofa kwuru (1-20)

      • Ọ sịrị na okwu Job abaghị uru (2, 3)

      • Ọ gwara Job ka o sepụ aka n’ihe ọjọọ (14)

  • 12

    • Job sara ihe a gwara ya (1-25)

      • “Unu akaghị m” (3)

      • “Abụrụla m onye ndị enyi ya ji eme ihe ọchị” (4)

      • ‘Chineke nwere amamihe’ (13)

      • Chineke karịrị ndị ikpe na ndị eze (17, 18)

  • 13

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-28)

      • ‘Ọ ga-akara m mma ka m gwa Chineke okwu’ (3)

      • “Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru” (4)

      • “Ama m na aka m dị ọcha” (18)

      • Ọ jụrụ ihe mere Chineke ji were ya ka onye iro (24)

  • 14

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-22)

      • Mmadụ anaghị ebite ndụ aka, nsogbu na-ezukwa ya ahụ́ (1)

      • “Osisi nwedịrị olileanya” (7)

      • “A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili” (13)

      • “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” (14)

      • Ọrụ aka Chineke ga-agụ ya agụụ (15)

  • 15

    • Okwu nke abụọ Elifaz kwuru (1-35)

      • O kwuru na Job anaghị atụ egwu Chineke (4)

      • O kwuru na Job dị mpako (7-9)

      • ‘Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi’ (15)

      • ‘Ọ bụ onye ajọ omume na-ata ahụhụ’ (20-24)

  • 16

    • Job sara ihe a gwara ya (1-22)

      • “Kama unu ga-akasi m obi, unu na-akpatakwuru m nsogbu” (2)

      • O kwuru na Chineke lekwasịrị ya anya ka ọ taa ya ahụhụ (12)

  • 17

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-16)

      • “Ndị na-akwa mmadụ emo gbara m gburugburu” (2)

      • “O meela ka m bụrụ onye ndị mmadụ ji eme ihe ọchị” (6)

      • “M ga-agazi biri n’ili” (13)

  • 18

    • Okwu nke abụọ Bildad kwuru (1-21)

      • O kwuru ihe na-eme ndị ajọ omume (5-20)

      • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job amaghị Chineke (21)

  • 19

    • Job sara ihe a gwara ya (1-29)

      • Job weere mba ndị enyi ya baara ya ka ihe na-enweghị isi (1-6)

      • Ọ sịrị na a hapụla ya (13-19)

      • “Onye mgbapụta m dị ndụ” (25)

  • 20

    • Okwu nke abụọ Zofa kwuru (1-29)

      • O kwuru na Job kparịrị ya (2, 3)

      • Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job bụ onye ajọ omume (5)

      • O kwuru na ihe ọjọọ na-atọ Job ụtọ (12, 13)

  • 21

    • Job sara ihe a gwara ya (1-34)

      • ‘Gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ omume?’ (7-13)

      • O kwuru na ndị na-akasi ya obi ebughị ezigbo ihe n’obi (27-34)

  • 22

    • Okwu nke atọ Elifaz kwuru (1-30)

      • “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke?” (2, 3)

      • O kwuru na Job dị anyaukwu nakwa na o mesiri ndị ọzọ ike (6-9)

      • ‘Lọghachikwuru Chineke ka ihe dịrị gị ná mma’ (23)

  • 23

    • Job sara ihe a gwara ya (1-17)

      • Ọ chọrọ ịnọ n’ihu Chineke kwuo otú o si bụrụ na aka ya dị ọcha (1-7)

      • O kwuru na ya ahụghị Chineke (8, 9)

      • ‘Ahapụghị m ụzọ ya gawa ebe ọzọ’ (11)

  • 24

    • Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-25)

      • ‘Gịnị mere na Chineke ekpebibeghị oge ọ ga-ekpe ikpe?’ (1)

      • O kwuru na Chineke kwere ka ihe ọjọọ na-eme (12)

      • Ndị mmehie hụrụ ọchịchịrị n’anya (13-17)

  • 25

    • Okwu nke atọ Bildad kwuru (1-6)

      • ‘Olee otú mmadụ ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke?’ (4)

      • O kwuru na mmadụ ịkwụwa aka ọtọ abaghị uru (5, 6)

  • 26

    • Job sara ihe a gwara ya (1-14)

      • “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị” (1-4)

      • ‘E nweghị ihe Chineke kokwasịrị ụwa na ya’ (7)

      • ‘Naanị obere ihe n’ihe ndị Chineke na-eme’ (14)

  • 27

    • Job kpebiri na ya ga-ejisi Chineke aka ike (1-23)

      • “Agaghị m ahapụ ịkwụsi ike n’ebe Chineke nọ” (5)

      • Onye na-anaghị asọpụrụ Chineke enweghị olileanya (8)

      • “Gịnị mere na okwu unu enweghị isi na ọdụ?” (12)

      • Onye ajọ omume na-emecha gbara aka (13-23)

  • 28

    • Job kwuru ihe dị iche n’amamihe na akụ̀ ndị dị n’ala (1-28)

      • Mbọ mmadụ na-agba ka o gwupụta akụ̀ ndị dị n’ala (1-11)

      • Amamihe bara uru karịa nkume pel (18)

      • Ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe (28)

  • 29

    • Job chetara oge ihe dịịrị ya ná mma (1-25)

      • A na-akwanyere ya ùgwù n’ọnụ ụzọ ámá obodo (7-10)

      • Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi (11-17)

      • Onye ọ bụla na-ege ntị na ndụmọdụ ya (21-23)

  • 30

    • Job kwuru otú ihe si gbanweere ya (1-31)

      • O kwuru na ndị na-abaghị uru na-akwazi ya emo (1-15)

      • Ọ dị ya ka Chineke anaghị enyere ya aka (20, 21)

      • “Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji” (30)

  • 31

    • Job kwuru ihe gosiri na ya na-akwụwa aka ọtọ (1-40)

      • “Mụ na anya m agbaala ndụ” (1)

      • Ọ sịrị ka Chineke jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ya (6)

      • Ọ naghị agba n’èzí (9-12)

      • Ọ hụghị ego n’anya (24, 25)

      • Ọ naghị ekpere arụsị (26-28)

  • 32

    • Elaịhu tinyere ọnụ n’ihe a na-ekwu (1-22)

      • O wesara Job na ndị enyi Job iwe (2, 3)

      • O cheere ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya ekwuwe (6, 7)

      • Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe (9)

      • Ọ na-enu Elaịhu enu ikwu okwu (18-20)

  • 33

    • Elaịhu baara Job mba maka na ọ na-ekwu na ya bụ onye ezi omume (1-33)

      • A hụrụ ihe mgbapụta (24)

      • Ka o nweghachi ike okorobịa (25)

  • 34

    • Elaịhu kwuru na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi (1-37)

      • Job sịrị na Chineke kpere ya ikpe mkpegbu (5)

      • Ezi Chineke anaghị eme ihe ọjọọ (10)

      • Job amaghị ihe ọ na-ekwu (35)

  • 35

    • Elaịhu gosiri na ihe Job na-ekwu ekwesịghị ekwesị (1-16)

      • Job sịrị na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke (2)

      • Chineke nọ n’eluigwe, e nweghị ihe mmehie na-eme ya (5, 6)

      • Job kwesịrị ichere Chineke (14)

  • 36

    • Elaịhu kwuru otú Chineke si dị ukwuu (1-33)

      • Ihe na-agaziri ndị na-erube isi, ma a na-ajụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke (11-13)

      • “È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi?” (22)

      • Job kwesịrị ịja Chineke mma (24)

      • “Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata” (26)

      • Chineke na-eduzi mmiri ozuzo na àmụ̀mà (27-33)

  • 37

    • Ihe ndị Chineke kere na-egosi na ọ dị ukwuu (1-24)

      • Chineke nwere ike ịkwụsị ọrụ mmadụ na-arụ (7)

      • “Chebara ọrụ dị ebube Chineke na-arụ echiche” (14)

      • Ndị mmadụ enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Chineke (23)

      • Mmadụ ọ bụla ekwesịghị iche na ya ma ihe (24)

  • 38

    • Jehova gosiri na mmadụ erughị ihe ọ bụla (1-41)

      • ‘Ebee ka ị nọ mgbe e kere ụwa?’ (4-6)

      • Ụmụ Chineke tiri mkpu otuto (7)

      • Ajụjụ ndị a jụrụ Job gbasara ihe ndị e kere eke (8-32)

      • “Iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe” (33)

  • 39

    • Chineke ji anụmanụ ndị o kere gosi na e nweghị ihe mmadụ ma (1-30)

      • Ewu ọhịa na ele (1-4)

      • Jakị ọhịa (5-8)

      • Atụ́ (9-12)

      • Enyí nnụnụ (13-18)

      • Ịnyịnya (19-25)

      • Agụ nkwọ na ugo (26-30)

  • 40

    • Ajụjụ ndị Jehova jụkwuru Job (1-24)

      • Job kwuru na e nweghị ihe ọzọ ya ga-ekwu (3-5)

      • “Ị̀ ga-asị na anaghị m ekpe ikpe ziri ezi?” (8)

      • Chineke kọwara ụdị ike Enyí Mmiri nwere (15-24)

  • 41

    • Chineke kwuru otú Agụ Iyi si dị egwu (1-34)

  • 42

    • Ihe Job sara Jehova (1-6)

    • A baara ndị enyi Job atọ mba (7-9)

    • Jehova mere ka Job bụrụkwa ọgaranya (10-17)

      • Ụmụ Job ndị nwoke na ndị nwaanyị (13-15)