Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Abụ Ọma

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ndị ezi omume na ndị ajọ omume

      • Ịgụ iwu Chineke na-eme obi ụtọ (2)

      • Ndị ezi omume dị ka osisi na-amị mkpụrụ (3)

      • Ndị ajọ omume dị ka mkpo ọka ifufe na-efesasị (4)

  • 2

    • Jehova na onye o tere mmanụ

      • Jehova na-achị mba dị iche iche ọchị (4)

      • Jehova chiri onye ọ họpụtara eze (6)

      • Kwanyere ọkpara Chineke ùgwù (12)

  • 3

    • Tụkwasị Chineke obi n’agbanyeghị nsogbu

      • “Gịnị mere ndị iro m ji dị nnọọ ọtụtụ?” (1)

      • “Jehova, ọ bụ gị bụ onye nzọpụta” (8)

  • 4

    • Ekpere Devid gosiri na ọ tụkwasịrị Chineke obi

      • “Weenụ iwe, ma unu emehiela” (4)

      • ‘M ga-ehi ụra n’udo’ (8)

  • 5

    • Jehova bụ ebe mgbaba onye ezi omume

      • Chineke kpọrọ ajọ omume asị (4, 5)

      • “Ị bụ onye ezi omume. Biko, duo m” (8)

  • 6

    • Arịrịọ Devid rịọrọ ka e meere ya amara

      • Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Chineke (5)

      • Chineke na-anụ arịrịọ a na-arịọ ya (9)

  • 7

    • Jehova bụ Onyeikpe na-ekpe ikpe ziri ezi

      • ‘Jehova, biko, kpee m ikpe’ (8)

  • 8

    • Ebube Chineke na ùgwù a na-akwanyere mmadụ

      • “Aha gị dị nnọọ ebube” (1, 9)

      • ‘Olee uru mmadụ efu bara?’ (4)

      • E ji ùgwù chọọ mmadụ mma (5)

  • 9

    • Ịkọsa ọrụ dị ebube Chineke na-arụ

      • Jehova bụ ebe mmadụ na-agbaba, aka aghara ịkpa ya (9)

      • Ndị ma aha Chineke na-atụkwasị ya obi (10)

  • 10

    • Jehova na-enyere onye na-enweghị onye na-enyere ya aka aka

      • Ndị ajọ omume na-ekwu na Chineke adịghị (4)

      • Ndị nọ ná nsogbu na-arịọ Jehova arịrịọ (14)

      • ‘Jehova bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi’ (16)

  • 11

    • Iji Jehova mere ebe mgbaba

      • “Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya” (4)

      • Chineke kpọrọ onye tigbuo zọgbuo na-amasị asị (5)

  • 12

    • Jehova na-ebili kpaa ike

      • Okwu Chineke enweghị ntụpọ (6)

  • 13

    • Devid tụrụ anya ka Jehova zọpụta ya

      • “Jehova, ruo ole mgbe?” (1, 2)

      • Jehova na-eji ọtụtụ ihe ọma akwụ mmadụ ụgwọ (6)

  • 14

    • Ndụ onye nzuzu

      • “Jehova adịghị” (1)

      • “E nweghị onye na-eme ihe dị mma” (3)

  • 15

    • Ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova?

      • Onye na-ekwu eziokwu n’obi ya (2)

      • Onye na-anaghị ekwutọ mmadụ (3)

      • Onye na-emezu nkwa ya, a sịgodị na ọ ga-akpa ya aka ọjọọ (4)

  • 16

    • Ihe ọma niile si n’aka Jehova

      • ‘Jehova bụ òkè m’ (5)

      • ‘N’abalị, ihe m na-eche na-akụziri m ihe’ (7)

      • ‘Jehova nọ m n’aka nri’ (8)

      • “Ị gaghị ahapụ m n’ili” (10)

  • 17

    • Ekpere Devid kpere ka e chebe ya

      • “I nyochaala obi m” (3)

      • “Zoo m n’okpuru nku gị” (8)

  • 18

    • Devid toro Chineke maka na ọ zọpụtara ya

      • “Jehova bụ nkume m dị elu” (2)

      • Jehova anaghị ahapụ onye jisiri ya aka ike (25)

      • Ihe Chineke na-eme zuru okè (30)

      • “Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ” (35)

  • 19

    • Iwu Chineke na ihe ndị o kere na-agba àmà

      • “Eluigwe na-akọsa ebube Chineke” (1)

      • Iwu Chineke zuru okè, na-eme ka mmadụ nweghachi ume (7)

      • “Mmehie niile m na-amaghị na m mere” (12)

  • 20

    • A ga-azọpụta eze Chineke tere mmanụ

      • Ụfọdụ tụkwasịrị ụgbọ ịnyịnya obi, ‘ma ọ bụ aha Jehova ka anyị na-akpọ’ (7)

  • 21

    • A ga-agọzi eze nke tụkwasịrị Jehova obi

      • Eze ga-adị ogologo ndụ (4)

      • A ga-emeri ndị iro Chineke (8-12)

  • 22

    • A napụtara ya, ya etoo Chineke

      • “Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (1)

      • ‘Ha feere uwe m nza’ (18)

      • A ga-eto Chineke n’ime ọgbakọ (22, 25)

      • Ndị niile bi n’ụwa ga-efe Chineke (27)

  • 23

    • “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ”

      • “E nweghị ihe ga-akọ m” (1)

      • “Ọ na-eme ka m nweta ume” (3)

      • “Iko m juru n’ọnụ” (5)

  • 24

    • Eze nke dị ebube banyere n’ọnụ ụzọ ámá

      • “Ọ bụ Jehova nwe ụwa” (1)

  • 25

    • Ekpere Devid kpere ka Chineke duo ya ma gbaghara ya

      • “Kụziere m ụzọ gị” (4)

      • “Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi” (14)

      • ‘Gbaghara m mmehie m niile’ (18)

  • 26

    • Irubere Chineke isi

      • “Jehova, biko, nyochaa m” (2)

      • Mụ na ndị ọjọọ anaghị akpa (4, 5)

      • ‘M ga-aga ebe ịchụàjà Chineke gburugburu’ (6)

  • 27

    • Jehova bụ idé ji ndụ m

      • Ụlọ nsọ Chineke na-eme ya obi ụtọ (4)

      • Ndị mụrụ m hapụ m, Jehova ga-elekọta m (10)

      • “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ” (14)

  • 28

    • A zara ọbụ abụ ekpere ya

      • “Jehova bụ ike m na ọta m” (7)

  • 29

    • Olu Jehova dị ike

      • Yiri ọmarịcha uwe dị nsọ fee Chineke (2)

      • ‘Olu Chineke na-ada ka égbè eluigwe’ (3)

      • Jehova na-enye ndị ya ume (11)

  • 30

    • A kwụsịrị ibe ákwá, ṅụrịwa ọṅụ

      • Chineke na-emere mmadụ amara n’oge niile onye ahụ dị ndụ (5)

  • 31

    • Iji Jehova mere ebe mgbaba

      • “M na-enyefe mmụọ m n’aka gị” (5)

      • ‘Jehova Chineke bụ onye eziokwu’ (5)

      • Ihe ọma Chineke na-eme karịrị akarị (19)

  • 32

    • Ndị a gbaghaara mmehie ha na-enwe obi ụtọ

      • ‘M kwupụtaara gị mmehie m’ (5)

      • Chineke ga-eme ka ị mara ihe (8)

  • 33

    • A ga-eto Onye kere ihe niile

      • “Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ” (3)

      • Jehova ji okwu ya na mmụọ ya kee ihe (6)

      • Mba Jehova na-enwe obi ụtọ (12)

      • Anya Jehova dị n’ebe ndị ya nọ (18)

  • 34

    • Jehova na-anapụta ndị ohu ya

      • “Ka anyị niile too aha ya” (3)

      • Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị ya (7)

      • “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma” (8)

      • ‘E nweghị ọkpụkpụ ya a gbajiri agbaji’ (20)

  • 35

    • Ekpere Devid kpere ka a napụta ya n’aka ndị iro

      • A ga-achụsasị ndị iro (5)

      • A ga-anọ n’etiti ìgwè mmadụ too Chineke (18)

      • A kpọrọ m asị n’enweghị ihe m mere (19)

  • 36

    • Ịhụnanya Chineke enweghị atụ

      • Onye ajọ omume anaghị atụ egwu Chineke (1)

      • Ọ bụ Chineke na-enye ndụ (9)

      • “Ọ bụ ìhè gị na-enye anyị ìhè” (9)

  • 37

    • Ihe ga-agaziri ndị tụkwasịrị Jehova obi

      • Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ (1)

      • “Na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi Jehova” (4)

      • “Kwe ka Jehova na-edu gị” (5)

      • “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa” (11)

      • Nri agaghị akọ onye ezi omume (25)

      • Ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo ebighị ebi (29)

  • 38

    • Ekpere onye chegharịrị echegharị kpere

      • ‘M na-echegbu onwe m, obi dara m mbà’ (6)

      • Jehova na-aza ekpere ndị na-echere ya (15)

      • “Mmehie m nọ na-ewute m” (18)

  • 39

    • Otú ndụ si dị mkpirikpi

      • Mmadụ bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ (5, 11)

      • “Elegharala ákwá m na-ebe anya” (12)

  • 40

    • Kelee Chineke, onye na-enweghị atụ

      • Ọrụ Chineke dị ọtụtụ, e nweghị ike ikwucha ha (5)

      • Ihe ka Chineke mkpa abụghị ka a chụọrọ ya àjà (6)

      • “Ime uche gị na-atọ m ụtọ” (8)

  • 41

    • Ekpere onye na-arịa ọrịa kpere

      • Chineke na-enyere onye ọrịa aka (3)

      • Ezigbo enyi ya gbara ya mgba okpuru (9)

  • 42

    • A ga-eto Chineke, Onye Nzọpụta kachanụ

      • Agụụ ife Chineke na-agụ ya otú agụụ mmiri si agụ mgbada (1, 2)

      • “Gịnị mere m ji daa mbà?” (5, 11)

      • “M ga-echere Chineke” (5, 11)

  • 43

    • Chineke bụ Onyeikpe na-anapụta ndị ya

      • “Zite ìhè gị na eziokwu gị” (3)

      • “Gịnị mere m ji daa mbà?” (5)

      • “M ga-echere Chineke” (5)

  • 44

    • Ekpere ụmụ Kora kpere ka e nyere ha aka

      • “Ọ bụ gị zọpụtara anyị” (7)

      • Anyị dị ka “atụrụ a ga-egbu egbu” (22)

      • “Bilie nyere anyị aka” (26)

  • 45

    • Eze e tere mmanụ ga-alụ nwaanyị

      • Ọ na-ekwu okwu dị mma (2)

      • ‘Chineke nyere gị ikike ịchị ruo ebighị ebi’ (6)

      • Mma nwunye eze mara ga-eme ka agụụ ya na-agụ eze (11)

      • Ụmụ ya ndị nwoke ga-abụ ndị isi n’ụwa niile (16)

  • 46

    • “Chineke bụ ebe mgbaba anyị”

      • Ọrụ dị ịtụnanya Chineke na-arụ (8)

      • Chineke na-eme ka agha kwụsị n’ụwa niile (9)

  • 47

    • Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile

      • ‘Jehova dị egwu’ (2)

      • Bụkuonụ Chineke abụ otuto (6, 7)

  • 48

    • Zayọn bụ obodo Eze Ukwu

      • Ọ na-eme ka ụwa niile ṅụrịa ọṅụ (2)

      • Leruonụ obodo a na ụlọ elu ya anya (11-13)

  • 49

    • Ịtụkwasị obi n’akụnụba abaghị uru

      • E nweghị onye nwere ike ịgbapụta nwanne ya (7, 8)

      • Chineke ga-anapụta mmadụ n’ili (15)

      • Akụnụba agaghị anapụtali mmadụ n’aka ọnwụ (16, 17)

  • 50

    • Chineke na-ekpe ikpe n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume

      • Ndị mụ na ha gbara ndụ n’ihi àjà a chụrụ (5)

      • “Ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe” (6)

      • Ọ bụ Chineke nwe anụmanụ niile (10, 11)

      • Chineke gbara ndị ajọ omume n’anwụ (16-21)

  • 51

    • Ekpere onye chegharịrị echegharị kpere

      • M si n’afọ bụrụ onye mmehie (5)

      • “Sachapụ mmehie m” (7)

      • “Mee ka m nwee obi dị ọcha” (10)

      • Chineke na-anabata onye ihe o mere na-ewute (17)

  • 52

    • Tụkwasị Chineke obi n’ihi ịhụnanya ya

      • A dọrọ ndị ji ihe ọjọọ etu ọnụ aka ná ntị (1-5)

      • Ndị ọjọọ na-atụkwasị akụnụba obi (7)

  • 53

    • Ihe e ji mara ndị nzuzu

      • “Jehova adịghị” (1)

      • “E nweghị onye na-eme ihe dị mma” (3)

  • 54

    • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe ọ nọ n’etiti ndị iro

      • “Chineke bụ onye na-enyere m aka” (4)

  • 55

    • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe a gbara ya mgba okpuru

      • Ezigbo enyi ya kparịrị ya (12-14)

      • “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị” (22)

  • 56

    • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe a na-akpagbu ya

      • “M tụkwasịrị Chineke obi” (4)

      • “Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị” (8)

      • “Gịnị ka mmadụ efu ga-eme m?” (4, 11)

  • 57

    • Arịrịọ ọbụ abụ rịọrọ ka e meere ya amara

      • Ọ gbabara n’okpuru nku Chineke (1)

      • Ndị iro dabara n’olulu ha gwuru (6)

  • 58

    • Chineke na-ekpe ụwa ikpe

      • Ekpere e kpere ka a taa ndị ọjọọ ahụhụ (6-8)

  • 59

    • Chineke bụ ọta na ebe mgbaba

      • ‘Emerela ndị ọjọọ ebere’ (5)

      • “M ga-abụ abụ gbasara otú i si dị ike” (16)

  • 60

    • Chineke na-emeri ndị iro ya

      • Mmadụ ịzọpụta anyị abaghị uru (11)

      • “Chineke ga-enye anyị ike” (12)

  • 61

    • Chineke bụ ụlọ elu siri ike na-echebe mmadụ

      • “M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị” (4)

  • 62

    • Ọ bụ Chineke ga-azọpụtali mmadụ

      • “M nwere ndidi, na-echere Chineke” (1, 5)

      • ‘Gwanụ Chineke ihe niile dị unu n’obi’ (8)

      • Mmadụ bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ (9)

      • Atụkwasịla akụnụba obi (10)

  • 63

    • Agụụ ife Chineke ofufe

      • “Ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ” (3)

      • “Ihe kacha mma i nyere m juru m afọ” (5)

      • Ịtụgharị uche banyere Chineke n’abalị (6)

      • ‘M rapaara Chineke n’ahụ́’ (8)

  • 64

    • Chineke ga-echebe ndị ya

      • ‘Chineke ga-agba ndị iro akụ́’ (7)

  • 65

    • Chineke na-elekọta ụwa

      • “Onye na-anụ ekpere” (2)

      • ‘Onye ị họọrọ na-enwe obi ụtọ’ (4)

      • Ihe ọma Chineke na-eme dị ọtụtụ (11)

  • 66

    • Ọrụ Chineke na-eme ka a na-atụ egwu ya

      • ‘Bịanụ hụ ọrụ Chineke na-arụ’ (5)

      • “M ga-emezu nkwa m kwere gị” (13)

      • Chineke na-anụ ekpere (18-20)

  • 67

    • Ndị niile bi n’ụwa ga-atụ egwu Chineke

      • Ụwa ga-amara ihe Chineke na-eme (2)

      • ‘Ka mmadụ niile too Chineke’ (3, 5)

      • ‘Chineke ga-agọzi anyị’ (6, 7)

  • 68

    • ‘Ka a chụsasịa ndị iro Chineke’

      • “Nna ụmụ na-enweghị nna” (5)

      • Chineke na-enye ndị nọ ná nsogbu ụlọ (6)

      • Ụmụ nwaanyị na-ezisa ozi ọma (11)

      • Ụmụ nwoke ndị bụ́ onyinye (18)

      • ‘Jehova na-eburu anyị ibu kwa ụbọchị’ (19)

  • 69

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka a napụta ya

      • “Ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi” (9)

      • “Za m ngwa ngwa” (17)

      • ‘Ha nyere m mmanya gbara ụka’ (21)

  • 70

    • Ọbụ abụ rịọrọ ka e nyere ya aka ngwa ngwa

      • “Mee ngwa ngwa nyere m aka” (5)

  • 71

    • Onye ndị agadi tụkwasịrị obi

      • M tụkwasịrị Chineke obi kemgbe m bụ nwata (5)

      • “Mgbe ike na-adịghịzi m” (9)

      • ‘Chineke na-akụziri m ihe kemgbe m bụ nwata’ (17)

  • 72

    • Udo ga-adị ma onye Chineke chiri eze chịwa

      • “Ihe ga na-agaziri onye ezi omume” (7)

      • Ọ ga-achị malite n’osimiri ruo n’osimiri (8)

      • Ọ ga-anapụta ndị a na-emegbu emegbu (14)

      • Nri ga-eju n’ụwa (16)

      • Ka e too aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi (19)

  • 73

    • Onye na-efe Chineke ghọtara ihe juburu ya anya

      • “Ọ fọrọ obere ka m kpafuo” (2)

      • “A na-enye m nsogbu kwa ụbọchị” (14)

      • ‘Ruo mgbe m batara n’ebe nsọ Chineke’ (17)

      • Ndị ajọ omume guzo n’ala na-amị amị (18)

      • Ịbịa Chineke nso dị m mma (28)

  • 74

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka Chineke cheta ndị ya

      • O chetara otú Chineke si zọpụta ndị ya (12-17)

      • “Cheta otú onye iro si na-akparị gị” (18)

  • 75

    • Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi

      • Ndị ajọ omume ga-aṅụ iko mmanya Jehova bu (8)

  • 76

    • Chineke ga-emeri ndị iro Zayọn

      • Chineke na-azọpụta ndị dị umeala n’obi (9)

      • A ga-emenye ndị iro dị mpako ihere (12)

  • 77

    • Ekpere ọbụ abụ kpere n’oge ọ nọ ná nsogbu

      • Ịtụgharị uche n’ọrụ Chineke (11, 12)

      • “Chineke, olee chi dị ukwuu ka gị?” (13)

  • 78

    • Chineke lekọtara ndị Izrel, ma ha enweghị okwukwe

      • Kọọrọ ya ọgbọ na-abịa abịa (2-8)

      • “Ha enweghị okwukwe na Chineke” (22)

      • “Nri si n’eluigwe” (24)

      • ‘Ha mere ihe wutere Onye Nsọ Izrel’ (41)

      • Otú ha si si n’Ijipt gaa n’Ala Nkwa (43-55)

      • ‘Ha nọ na-ama Chineke aka’ (56)

  • 79

    • Ekpere e kpere mgbe ndị mba ọzọ bịara ọgụ

      • ‘E ji anyị eme ihe ọchị’ (4)

      • ‘Nyere anyị aka n’ihi aha gị’ (9)

      • “Kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ okpukpu asaa” (12)

  • 80

    • A rịọrọ Chineke ka ọ nabataghachi Izrel

      • “Chineke, biko, nabataghachi anyị” (3)

      • Izrel dị ka osisi vaịn Chineke (8-15)

  • 81

    • A gbara ndị Izrel ume ka ha rube isi

      • Unu efela chi ala ọzọ (9)

      • ‘A sị nnọọ na unu ga-ege ntị’ (13)

  • 82

    • Chineke chọrọ ka ndị ya na-ekpe ikpe ziri ezi

      • Chineke na-ekpe ikpe n’etiti “chi dị iche iche” (1)

      • “Kpechitenụ ọnụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya” (3)

      • “Unu bụ chi” (6)

  • 83

    • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe ndị iro bịara

      • “Chineke, biko, agbala nkịtị” (1)

      • Ndị iro dị ka ahịhịa ogwu ifufe na-ebu (13)

      • Aha Chineke bụ Jehova (18)

  • 84

    • Ịga n’ụlọikwuu Chineke gụrụ ọbụ abụ agụụ

      • Onye Livaị chọrọ ịna-anọ n’ụlọ nsọ ka nnụnụ (3)

      • “Ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ gị” (10)

      • ‘Chineke bụ anyanwụ na ọta’ (11)

  • 85

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka a nabataghachi ha

      • Chineke ga-agwa ndị ya na udo ga-adịrị ha (8)

      • Ịhụnanya na eziokwu ga-ezute (10)

  • 86

    • E nweghị chi dị ka Jehova

      • Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie (5)

      • Mba niile ga-efe Jehova (9)

      • “Kụziere m ụzọ gị” (11)

      • ‘Mee ka m jiri obi m niile na-atụ egwu gị’ (11)

  • 87

    • Zayọn bụ obodo ezi Chineke

      • Ndị a mụrụ na Zayọn (4-6)

  • 88

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka e chebe ya

      • “M nọzi n’ọnụ ili” (3)

      • ‘Kwa ụtụtụ, m na-arịọ gị arịrịọ’ (13)

  • 89

    • Abụ a bụrụ banyere ịhụnanya Jehova

      • Ndụ Chineke na Devid gbara (3)

      • Nwa Devid ga-anọru mgbe ebighị ebi (4)

      • Onye Chineke tere mmanụ kpọrọ ya “Nna” (26)

      • A gaghị emebi ọgbụgba ndụ Chineke na Devid (34-37)

      • Mmadụ enweghị ike ịgbanahụ ọnwụ (48)

  • 90

    • Chineke na-anọru ebighị ebi, ma mmadụ anaghị anọte aka

      • Otu puku afọ gara aga dị ka ụnyaahụ (4)

      • Mmadụ na-anọ afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ (10)

      • ‘Kụziere anyị otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị’ (12)

  • 91

    • A ga-echebe ndị bi n’ebe zoro ezo nke Chineke

      • Onye a napụtara n’ọnyà onye na-achụ nta nnụnụ (3)

      • Ịgbaba n’okpuru nku Chineke (4)

      • Ọtụtụ puku mmadụ ga-ada, ma ị gaghị ada (7)

      • E nyere ndị mmụọ ozi iwu ka ha chebe gị (11)

  • 92

    • Jehova kacha elu ruo mgbe ebighị ebi

      • Ọrụ ya dị ebube; ọ ma ihe nke ukwuu (5)

      • ‘Onye ezi omume ga-ama pokopoko ka osisi’ (12)

      • Ndị agadi ka ga na-eme nke ọma (14)

  • 93

    • Ọchịchị dị ebube nke Jehova

      • “Jehova abụrụla Eze” (1)

      • ‘E kwesịrị ịtụkwasị ihe ị na-echetara ndị gị obi’ (5)

  • 94

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka Chineke bọọ ọbọ

      • ‘Olee mgbe ndị ọjọọ ga-akwụsị ịṅụrị ọṅụ?’ (3)

      • Onye Jaa na-adọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ (12)

      • Jehova agaghị ahapụ ndị ya (14)

      • “Ha na-akpa nkata ka ha jiri iwu kpata nsogbu” (20)

  • 95

    • Ife Chineke na irubere ya isi

      • “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya” (7)

      • “Unu akpọchila obi unu” (8)

      • “Ha agaghị eso m zuo ike” (11)

  • 96

    • “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ”

      • Onye ọ bụla kwesịrị ịna-eto Jehova (4)

      • Chi ndị mmadụ na-efe abaghị uru (5)

      • Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ fee Jehova (9)

  • 97

    • Jehova dị elu karịa chi ọzọ niile

      • “Jehova abụrụla Eze” (1)

      • Hụnụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị (10)

      • Ìhè enwuorola ndị ezi omume (11)

  • 98

    • Jehova bụ Onye nzọpụta na-ekpe ikpe ziri ezi

      • Jehova egosila na ọ bụ onye nzọpụta (2, 3)

  • 99

    • Jehova bụ Eze dị nsọ

      • Ọ nọ n’ocheeze dị n’elu ndị cherob (1)

      • Chineke gbaghaara ndị ya, taakwa ha ahụhụ (8)

  • 100

    • Keleenụ Chineke

      • “Jirinụ ọṅụ na-efe Jehova” (2)

      • ‘Ọ bụ Chineke kere anyị’ (3)

  • 101

    • Eze nke na-erubere Chineke isi

      • ‘Agaghị m agbachi ndị dị mpako nkịtị’ (5)

      • ‘M ga-emere ndị na-erube isi amara’ (6)

  • 102

    • Ekpere onye a na-emegbu emegbu kpere

      • “Adị m ka nnụnụ nke nọ naanị ya” (7)

      • “Ndụ m dị ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ” (11)

      • “Jehova ga-arụghachi Zayọn” (16)

      • Jehova ga na-adị ndụ ruo ebighị ebi (26, 27)

  • 103

    • “Ka m too Jehova”

      • Ọ na-ewepụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya (12)

      • Chineke na-emere ụmụ ya ebere (13)

      • Chineke na-echeta na anyị bụ ájá (14)

      • Ocheeze Jehova na ọchịchị ya (19)

      • Ndị mmụọ ozi na-eme ihe Chineke kwuru (20)

  • 104

    • E toro Chineke maka ihe ndị dị ebube o kere

      • Ụwa ga-adị ruo mgbe ebighị ebi (5)

      • E kere mmanya na nri maka mmadụ (15)

      • “Ọrụ ị rụrụ dị nnọọ ọtụtụ” (24)

      • “I mee ka ha kwụsị iku ume, ha na-anwụ” (29)

  • 105

    • Ihe ọma ndị Jehova meere ndị ya

      • Chineke na-echeta ọgbụgba ndụ ya (8-10)

      • “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka” (15)

      • Mgbe Josef bụ ohu, Chineke ji ya rụọ ọrụ (17-22)

      • Ọrụ ebube ndị Chineke rụrụ n’Ijipt (23-36)

      • Ndị Izrel si n’Ijipt pụọ (37-39)

      • Chineke chetara nkwa o kwere Ebreham (42)

  • 106

    • Ndị Izrel ejighị ihe e meere ha kpọrọ ihe

      • Ha chefuru ihe ndị Chineke mere (13)

      • Ha toro ihe yiri oké ehi kama ito Chineke (19, 20)

      • Ha enweghị okwukwe ná nkwa Chineke (24)

      • Ha so fee Bel (28)

      • Ha ji ụmụ ha chụọrọ ndị mmụọ ọjọọ àjà (37)

  • 107

    • Keleenụ Jehova n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ

      • O duru ha ka ha soro ezi ụzọ (7)

      • O nyejuru ha mmiri na nri afọ (9)

      • O si n’ọchịchịrị kpọpụta ha (14)

      • O nyere iwu, e wee gwọọ ha (20)

      • Ọ na-anapụta ndị a na-emegbu emegbu (41)

  • 108

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka o merie ndị iro ya

      • Mmadụ ịzọpụta anyị abaghị uru (12)

      • “Ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike” (13)

  • 109

    • Ekpere onye nọ n’ahụhụ kpere

      • ‘Ka onye ọzọ rụwa ọrụ ọ na-arụbu’ (8)

      • Chineke na-eguzo n’akụkụ ogbenye (31)

  • 110

    • Eze na onye nchụàjà dị ka Melkizedek

      • ‘Chịwa n’etiti ndị iro gị’ (2)

      • Ụmụ okorobịa ndị wepụtara onwe ha dị ka igirigi (3)

  • 111

    • Too Jehova maka ọrụ dị ukwuu ọ na-arụ

      • Aha Chineke dị nsọ, bụrụkwa ihe e kwesịrị ịtụ egwu (9)

      • Mmadụ ịtụ egwu Jehova na-egosi na ọ ma ihe (10)

  • 112

    • Onye ezi omume na-atụ egwu Jehova

      • Ihe ga-agaziri onye ji obi ya agbazinye ihe (5)

      • ‘A ga na-echeta onye ezi omume ruo ebighị ebi’ (6)

      • Ọ na-enye ndị ogbenye ihe (9)

  • 113

    • Chineke na-ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya

      • Ka e too aha Jehova ruo ebighị ebi (2)

      • Chineke na-ehulata (6)

  • 114

    • Otú e si kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt

      • Oké osimiri gbara ọsọ (5)

      • Ugwu wụliri elu ka ebule (6)

      • E mere ka oké nkume siri ike bụrụ isi mmiri (8)

  • 115

    • Naanị Chineke ka e kwesịrị ito

      • Arụsị adịghị ndụ (4-8)

      • E nyere ndị mmadụ ụwa (16)

      • “Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa” (17)

  • 116

    • Abụ e ji kelee Chineke

      • “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ?” (12)

      • ‘M ga-aṅụ ihe dị n’iko iji kelee ya’ (13)

      • “M ga-emezu nkwa m kwere Jehova” (14, 18)

      • Ọnwụ ndị na-erubere Jehova isi na-ewute ya (15)

  • 117

    • A gwara mba niile ka ha too Jehova

      • Ịhụnanya Chineke dị ukwuu (2)

  • 118

    • Ọbụ abụ kelere Jehova na o meriela

      • ‘M kpọkuru Jaa, ya aza m’ (5)

      • “Jehova nọnyeere m” (6, 7)

      • Nkume a jụrụ ajụ ga-aghọ nkume ji ụlọ (22)

      • “Onye na-abịa n’aha Jehova” (26)

  • 119

    • Ọbụ abụ ji okwu Chineke kpọrọ ihe

      • ‘Olee otú ndị na-eto eto ga-esi ebi ndụ dị mma?’ (9)

      • “Ihe ndị ị na-echetara m na-eme m obi ụtọ” (24)

      • “Ọ bụ okwu gị ka m tụkwasịrị obi” (74, 81, 114)

      • “M ji iwu gị kpọrọ ihe nke ukwuu” (97)

      • “M na-aghọta ihe karịa ndị nkụzi m niile” (99)

      • “Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ” (105)

      • “Okwu gị niile bụ eziokwu” (160)

      • Udo na-adịrị ndị ji iwu gị kpọrọ ihe (165)

  • 120

    • Onye mbịarambịa nke chọrọ udo

      • ‘Napụta m n’aka ndị ire ha bụ aghụghọ aghụghọ’ (2)

      • “Achọrọ m udo” (7)

  • 121

    • Jehova na-eche ndị ya nche

      • ‘Ọ bụ Jehova ga-enyere m aka’ (2)

      • Jehova anaghị ehi ụra (3, 4)

  • 122

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka udo dị na Jeruselem

      • Ịga n’ụlọ Jehova na-eme obi ụtọ (1)

      • Ụlọ ndị dị na Jeruselem dịkọtara ọnụ (3)

  • 123

    • Ọbụ abụ rịọrọ Jehova ka o meere ha amara

      • ‘Anya anyị dị n’ebe Jehova nọ’ (2)

      • “A kparịala anyị nke ukwuu” (3)

  • 124

    • “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị”

      • Anyị si n’ọnyà e mebiri emebi gbapụ (7)

      • ‘Aha Jehova na-enyere anyị aka’ (8)

  • 125

    • Jehova na-echebe ndị ya

      • ‘Otú ahụ ugwu si gbaa Jeruselem gburugburu’ (2)

      • “Ka udo dịrị Izrel” (5)

  • 126

    • A kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha

      • “Jehova emeerela anyị nnukwu ihe” (3)

      • Ndị na-ebebu ákwá tiri mkpu ọṅụ (5, 6)

  • 127

    • E wepụ Chineke, ihe niile bụ n’efu

      • “Ọ bụrụ na Jehova arụghị ụlọ” (1)

      • Ụmụ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ (3)

  • 128

    • Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe obi ụtọ

      • Nwunye ya ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ (3)

      • “Ka ị hụ ka ihe na-aga nke ọma na Jeruselem” (5)

  • 129

    • A lụsoro ọbụ abụ ọgụ, ma e merighị ya

      • E mechuru ndị kpọrọ Zayọn asị ihu (5)

  • 130

    • “M nọ ná nnukwu nsogbu na-akpọ gị”

      • “A sị na ọ bụ mmehie ka ị na-ele” (3)

      • Jehova na-agbaghara mmehie n’eziokwu (4)

      • “M na-echeresi Jehova ike” (6)

  • 131

    • Afọ juru ọbụ abụ ka nwatakịrị a kwụsịrị ara

      • Ọ naghị achọ oké ihe (1)

  • 132

    • Jehova họọrọ Devid, họrọkwa Zayọn

      • “Ajụla onye i tere mmanụ” (10)

      • A ga-azọpụta ndị nchụàjà bi na ya (16)

  • 133

    • Ụmụnne ibikọta ọnụ ma dịrị n’otu

      • Dị ka mmanụ a wụsara n’isi Erọn (2)

      • Dị ka igirigi nke na-ada na Hemọn (3)

  • 134

    • Toonụ Chineke n’abalị

      • “Bụrụnụ ndị dị nsọ mgbe unu na-eweli aka unu” (2)

  • 135

    • Toonụ Jaa maka na ọ bụ onye ukwu

      • Ọrụ ebube ndị a rụrụ iji taa ndị Ijipt ahụhụ (8, 9)

      • “Aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi” (13)

      • Arụsị adịghị ndụ (15-18)

  • 136

    • Ịhụnanya Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi

      • Chineke ji amamihe kee eluigwe na ụwa (5, 6)

      • Fero nwụrụ n’Oké Osimiri Uhie (15)

      • Chineke na-echeta ndị nọ ná nsogbu (23)

      • Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri (25)

  • 137

    • N’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn

      • Ha ekweghị abụ abụ a na-abụ na Zayọn (3, 4)

      • A ga-ebibi Babịlọn (8)

  • 138

    • Chineke bi n’elu, ma ọ na-elebara mmadụ anya

      • ‘Ị zara ekpere m’ (3)

      • ‘M nọrọgodị ná nsogbu, ị na-anapụta m’ (7)

  • 139

    • Chineke ma ndị ohu ya nke ọma

      • E nweghị ebe mmadụ ga-aga mmụọ Chineke na-agaghị eru (7)

      • “Otú i si kee m dị ebube” (14)

      • ‘Ị hụrụ m mgbe m na-akabeghị aka’ (16)

      • “Na-edu m n’ụzọ ndụ ebighị ebi” (24)

  • 140

    • Jehova bụ Onye siri ike na-azọpụta ndị ya

      • Ndị ọjọọ dị ka agwọ (3)

      • Ndị tigbuo zọgbuo ga-ala n’iyi (11)

  • 141

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka e chebe ya

      • “Ka ekpere m masị gị ka insens” (2)

      • Mba onye ezi omume baara m ga-adị ka mmanụ (5)

      • Ụgbụ ndị ajọ omume ji sie ọnyà ga-ejide ha (10)

  • 142

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka a napụta ya

      • “E nweghị ebe m ga-agbaga” (4)

      • “Naanị gị ka m nwere” (5)

  • 143

    • Ọbụ abụ cheere Chineke otú ala si echere mmiri

      • ‘M na-echebara ọrụ gị echiche’ (5)

      • “Kụziere m otú m ga-esi na-eme uche gị” (10)

      • ‘Mmụọ nsọ gị dị mma, ka ọ na-edu m’ (10)

  • 144

    • Ekpere ọbụ abụ kpere ka o merie

      • ‘Gịnị ka mmadụ efu bụ?’ (3)

      • ‘Mee ka ndị iro gbasasịa’ (6)

      • Ndị Jehova na-enwe obi ụtọ (15)

  • 145

    • E toro Chineke bụ́ Eze ukwu

      • ‘M ga-akọsa na Chineke bụ onye ukwu’ (6)

      • ‘Jehova na-emere ihe niile o kere ihe ọma’ (9)

      • ‘Ndị na-erubere gị isi ga-eto gị’ (10)

      • Ọchịchị Chineke na-adịru ebighị ebi (13)

      • Chineke na-enyeju ihe ọ bụla afọ (16)

  • 146

    • Tụkwasị Chineke obi, atụkwasịla mmadụ obi

      • Mmadụ nwụọ, ọ na-akwụsị iche echiche (4)

      • Chineke na-ekulite ndị ike gwụrụ (8)

  • 147

    • E toro Chineke maka ọrụ ọma ndị ọ na-arụ

      • Ọ na-akasi ndị obi gbawara obi (3)

      • Ọ na-akpọ kpakpando niile aha (4)

      • Ọ na-eme ka snoo kpuchie ụwa ka ákwà (16)

  • 148

    • Ka ihe niile e kere eke too Jehova

      • “Ndị mmụọ ozi ya niile, toonụ ya” (2)

      • ‘Anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, toonụ ya’ (3)

      • Ka ndị agadi na ụmụaka too Chineke (12, 13)

  • 149

    • Abụ e ji kelee Chineke maka na o meriela

      • Chineke hụrụ ndị ya n’anya (4)

      • A ga-akwanyere ndị na-erubere Chineke isi ùgwù (9)

  • 150

    • Ka ihe niile na-eku ume too Jaa

      • Haleluja! (1, 6)