Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ilu

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ihe mere e ji dee ilu (1-7)

    • Nsogbu iso ndị enyi ọjọọ na-akpata (8-19)

    • Ezigbo amamihe na-eti mkpu n’ámá obodo (20-33)

  • 2

    • Uru amamihe bara (1-22)

      • Chọọ amamihe otú e si achọ akụ̀ zoro ezo (4)

      • Ichebara ihe echiche nke ọma na-echebe mmadụ (11)

      • Ịkwa iko na-akpata nsogbu (16-19)

  • 3

    • Mara ihe ma tụkwasị Jehova obi (1-12)

      • Jiri ihe ndị kacha mma na-efe Jehova (9)

    • Amamihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ (13-18)

    • Amamihe na-echebe mmadụ (19-26)

    • Na-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma (27-35)

      • Meere ndị ọzọ ihe ọma ma ọ bụrụ na ị ga-emeli ya (27)

  • 4

    • Ezigbo ntụziaka nna nyere nwa ya (1-27)

      • Ka amamihe soro n’ihe ndị ị ga-enweta (7)

      • Zere ụzọ ọjọọ (14, 15)

      • Ìhè na-enwusikwu ike n’ụzọ ndị ezi omume (18)

      • “Chebe obi gị” (23)

  • 5

    • Aka ná ntị a dọrọ banyere nwaanyị na-akwa iko (1-14)

    • Ka gị na nwunye gị na-aṅụrị ọṅụ (15-23)

  • 6

    • Kpachara anya otú i si ana ndị mmadụ n’ibé (1-5)

    • “Gị onye umengwụ, gakwuru ndanda” (6-11)

    • Onye nzuzu nke bụ́kwa onye ajọ omume (12-15)

    • Ihe asaa Jehova kpọrọ asị (16-19)

    • Kpachara anya maka nwaanyị ọjọọ (20-35)

  • 7

    • Na-edebe iwu Chineke ka i wee dị ndụ (1-5)

    • A ratara nwa okorobịa na-amaghị ihe (6-27)

      • “Ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya” (22)

  • 8

    • Ihe amamihe kwuru (1-36)

      • ‘Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile Chineke kere’ (22)

      • ‘M nọ n’akụkụ Chineke na-arụ ọrụ’ (30)

      • ‘Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-eme m obi ụtọ’ (31)

  • 9

    • Ezigbo amamihe na-akpọ òkù (1-12)

      • “M ga-eme ka ị dịtee ndụ aka” (11)

    • Nwaanyị nzuzu na-akpọ òkù (13-18)

      • “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ” 17)

  • ILU SOLOMỌN (10:1–24:34)

    • 10

      • Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ (1)

      • Onye na-arụsi ọrụ ike ga-aba ọgaranya (4)

      • Ọtụtụ okwu na-akpata mmehie (19)

      • Ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya (22)

      • Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ (27)

    • 11

      • Ndị dị umeala n’obi na-ama ihe (2)

      • Onye kwụsịrị ife Chineke na-ala ndị ọzọ n’iyi (9)

      • “Ihe na-aga nke ọma ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ” (14)

      • Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka (25)

      • Ihe agaghị agaziri onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya (28)

    • 12

      • Onye na-ejighị mba a na-abara ya kpọrọ ihe enweghị uche (1)

      • ‘Okwu e kwuru n’echeghị echiche dị ka ịma mmadụ mma’ (18)

      • Ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ (20)

      • Jehova kpọrọ ndị na-agha ụgha asị (22)

      • Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ (25)

    • 13

      • Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe (10)

      • Ike na-agwụ mmadụ ma ihe ọ na-atụ anya ya emezubeghị (12)

      • Onye ozi a tụkwasịrị obi na-eweta ozi bara uru (17)

      • Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe (20)

      • Onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọ ya aka ná ntị (24)

    • 14

      • Onye ọ bụla ma ihe na-ewute ya n’obi (10)

      • Ihe dị mma n’anya mmadụ nwere ike ibute ọnwụ (12)

      • Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile (15)

      • Ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi (20)

      • Ahụ́ na-adị mmadụ mma ma obi ruo ya ala (30)

    • 15

      • Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu (1)

      • Anya Jehova na-ahụ ihe niile (3)

      • Ekpere ndị ezi omume na-eme Chineke obi ụtọ (8)

      • Atụmatụ na-aghasasị ma a gbaghị izu (22)

      • Na-atụgharị uche tupu ị zaghachi 

    • 16

      • Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi (2)

      • Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova (3)

      • Ọ bụ Jehova nwe ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe (11)

      • Nganga na-ala mmadụ n’iyi (18)

      • Isi awọ́ bụ okpueze mara mma (31)

    • 17

      • Ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma (13)

      • Tupu esemokwu amalite, pụọ (14)

      • Ezigbo enyi hụrụ enyi ya n’anya mgbe niile (17)

      • “Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ” (22)

      • Onye ma ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu (27)

    • 18

      • Onye na-anọ iche na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru (1)

      • Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike (10)

      • Ọgaranya na-ewere akụ̀ ya ka ihe na-echebe ya (11)

      • Ọ dị mma igecha mmadụ abụọ na-ese okwu ntị (17)

      • E nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya (24)

    • 19

      • Mmadụ ghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ (11)

      • Nwaanyị na-esekarị okwu yiri elu ụlọ na-ehi mmiri (13)

      • Jehova na-enye mmadụ nwaanyị nwere uche (14)

      • Dọọ nwata aka ná ntị mgbe olileanya ka dị (18)

      • Ịnụrụ ndụmọdụ bara uru (20)

    • 20

      • Mmanya na-eme ka a chịwa mmadụ ọchị (1)

      • Onye umengwụ anaghị akọ ihe n’oge oyi (4)

      • Ihe mmadụ na-eche n’obi ya dị ka mmiri miri emi (5)

      • Ikwe nkwa n’echeghị echiche adịghị mma (25)

      • Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha (29)

    • 21

      • Jehova na-eme ka obi eze gaa ebe ọ chọrọ (1)

      • Ime ihe ziri ezi dị mma karịa ịchụ àjà (3)

      • Ịrụsi ọrụ ike na-eme ka ihe gaziere mmadụ (5)

      • A gaghị aza onye na-anaghị ege onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ntị (13)

      • E nweghị amamihe ga-aghasali nzube Jehova (30)

    • 22

      • Inwe ezigbo aha ka inweju akụnụba mma (1)

      • E bido n’oge zụwa nwata, ọ gaghị ahapụ ihe ọ mụtara (6)

      • Onye umengwụ na-atụ ụjọ na ọdụm nọ n’èzí (13)

      • Ịdọ aka ná ntị na-eme ka nzuzu kwụsị (15)

      • Onye ma ọrụ ya nke ọma na-eguzo n’ihu ndị eze (29)

    • 23

      • Kpachara anya ma a kpọọ gị oriri (2)

      • Achụla akụnụba (4)

      • Akụ̀ ị kpatara nwere ike ipu nku fepụ (5)

      • Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya (20)

      • Mmanya na-ata ka agwọ (32)

    • 24

      • Enwerela ndị ọjọọ anyaụfụ (1)

      • A na-eji amamihe arụ ụlọ (3)

      • Onye ezi omume nwere ike ịda, ma ọ ga-ebili (16)

      • Emegwarala ihe e mere gị (29)

      • Ihi ụra na-eme ka mmadụ daa ogbenye (33, 34)

  • ILU SOLOMỌN NKE NDỊ NA-EJERE EZE HEZEKAYA OZI DERE (25:1–29:27)

    • 25

      • Akọsala ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ nụ (9)

      • Okwu e kwuru n’oge kwesịrị ekwesị (11)

      • Agala n’ụlọ mmadụ mgbe niile (17)

      • Kpokwasị icheku ọkụ n’isi onye iro gị (21, 22)

      • Akụkọ ọma dị ka mmiri jụrụ oyi (25)

    • 26

      • Ihe onye umengwụ na-eme (13-16)

      • Etinyela ọnụ n’esemokwu na-agbasaghị gị (17)

      • Zere egwuregwu na-enweghị isi (18, 19)

      • Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ (20, 21)

      • Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ (22)

    • 27

      • Mba mmadụ baara enyi ya bara uru (5, 6)

      • Nwa m, mee m obi ụtọ (11)

      • A na-eji ígwè amụcha ígwè (17)

      • Mara ìgwè atụrụ gị (23)

      • Akụnụba anaghị adịru ebighị ebi (24)

    • 28

      • Ekpere onye na-anaghị eme ihe iwu kwuru bụ ihe arụ (9)

      • A na-emere onye kwupụtara mmehie ya ebere (13)

      • Onye chọrọ ịba ọgaranya ọsọ ọsọ ga-etinye aka n’ihe ọjọọ (20)

      • Ịbara mmadụ mba dị mma karịa ito ya otuto elu ọnụ (23)

      • nweghị ihe ga-akọ onye na-enye ogbenye ihe (27)

    • 29

      • Nwa na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere (15)

      • N’ebe a na-enweghị ọhụụ, ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha (18)

      • Onye na-ewe iwe na-eme ka e sewe okwu (22)

      • A na-akwanyere onye dị umeala n’obi ùgwù (23)

      • Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà (25)

  • 30

    • OKWU EGỌ KWURU (1-33)

      • Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba (8)

      • Ihe ndị afọ na-anaghị eju eju (15, 16)

      • Ihe ndị na-agba mmadụ gharịị (18, 19)

      • Nwaanyị na-akwa iko (20)

      • Ihe ndị ma nnọọ ihe (24)

  • 31

    • OKWU EZE LEMUEL (1-31)

      • Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị? (10)

      • Ọ na-arụsi ọrụ ike (17)

      • Obiọma na-achị ire ya (26)

      • Ụmụ ya na di ya na-aja ya mma (28)

      • Mma na-ala ala (30)