Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Aịzaya

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Nna na ụmụ ya ndị na-enupụrụ ya isi (1-9)

    • Jehova anaghị anabata mmadụ ife ya iji mezuo iwu (10-17)

    • “Bịanụ ka anyị kpezie” (18-20)

    • A ga-amaliteghachi irubere Chineke isi na Zayọn (21-31)

  • 2

    • E buliri ugwu Jehova elu (1-5)

      • Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè (4)

    • A ga-eweda ndị dị mpako ala n’ụbọchị Jehova (6-22)

  • 3

    • Ndị isi ndị Juda na-eduhie ha (1-15)

    • A ga-ekpe ụmụ nwaanyị Zayọn na-achụ nwoke ikpe (16-26)

  • 4

    • Ụmụ nwaanyị asaa ga-ejide otu nwoke aka (1)

    • Ihe Jehova mere ka o pulite ga-adị ebube (2-6)

  • 5

    • Abụ gbasara ubi vaịn Jehova (1-7)

    • Ihe ndị ga-eme ubi vaịn Jehova (8-24)

    • Chineke wesara ndị ya iwe (25-30)

  • 6

    • Ọhụụ a hụrụ ka Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya (1-4)

      • ‘Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova dị’ (3)

    • E mere ka egbugbere ọnụ Aịzaya dị ọcha (5-7)

    • E ziri Aịzaya ka ọ gaa zie ndị mmadụ ozi (8-10)

      • “Lee m, ziga m” (8)

    • “Jehova, ruo ole mgbe?” (11-13)

  • 7

    • Ozi e ziri Eze Ehaz (1-9)

      • Shia-jeshọb (3)

    • A ga-amụ Ịmanuel iji gosi ihe ga-eme n’ọdịnihu (10-17)

    • Ihe ga-eme ndị na-anaghị efe Chineke (18-25)

  • 8

    • Ndị Asiria ga-abịa lụso ndị Juda agha (1-8)

      • Meha-shalal-hash-baz (1-4)

    • Unu atụla egwu, “Chineke nọnyeere anyị!” (9-17)

    • Aịzaya na ụmụ ya bụ ihe na-egosi ihe Jehova zubere (18)

    • Sinụ n’iwu Chineke mata ihe unu chọrọ ịmata, unu ajụla ndị mmụọ ọjọọ ase (19-22)

  • 9

    • Ndị Galili hụrụ ezigbo ìhè (1-7)

      • A ga-amụ “Onyeisi Udo” (6, 7)

    • Ihe Chineke ga-eme ndị Izrel (8-21)

  • 10

    • Ihe Chineke ga-eme ndị Izrel (1-4)

    • Chineke ga-eji ndị Asiria gosi na iwe ji ya (5-11)

    • Ahụhụ a ga-ata ndị Asiria (12-19)

    • Ndị fọrọ n’ezinụlọ Jekọb ga-alọghachi (20-27)

    • Chineke ga-ekpe ndị Asiria ikpe (28-34)

  • 11

    • Ome Jesi ga-achị otú dị mma (1-10)

      • Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo (6)

      • Amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa (9)

    • Ndị fọdụrụ ga-alọghachi (11-16)

  • 12

    • Abụ e ji ekele Jehova (1-6)

      • “Jaa Jehova bụ ike m” (2)

  • 13

    • Ihe Chineke kpebiri ime Babịlọn (1-22)

      • Ụbọchị Jehova dị nso (6)

      • Ndị Midia ga-emeri ndị Babịlọn (17)

      • O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ biri na Babịlọn ọzọ (20)

  • 14

    • Ndị Izrel ga-ebirighachi n’ala ha (1, 2)

    • A ga-ama eze Babịlọn njakịrị (3-23)

      • Onye na-enwu ka kpakpando ga-esi n’eluigwe daa (12)

    • Jehova ga-eji aka ya bibie onye Asiria (24-27)

    • Ihe Chineke kpebiri ime ndị Filistia (28-32)

  • 15

    • Ihe Chineke kpebiri ime ndị Moab (1-9)

  • 16

    • Ihe ndị ọzọ Chineke kpebiri ime ndị Moab (1-14)

  • 17

    • Ihe Chineke kpebiri ime Damaskọs (1-11)

    • Jehova ga-abara mba dị iche iche mba (12-14)

  • 18

    • Ihe a ga-eme ndị Etiopia (1-7)

  • 19

    • Ihe Chineke kpebiri ime Ijipt (1-15)

    • Ndị Ijipt ga-amara Jehova (16-25)

      • A ga-arụrụ Jehova ebe ịchụàjà n’Ijipt (19)

  • 20

    • Ihe na-egosi ihe ga-eme ndị Ijipt na ndị Etiopia (1-6)

  • 21

    • Ihe Chineke kpebiri ime ala ịkpa nke dị ka oké osimiri (1-10)

      • Onye nche nọ n’ụlọ nche na-eche nche (8)

      • “Babịlọn adaala!” (9)

    • Ihe Chineke kpebiri ime Duma na ọzara (11-17)

      • “Onye nche, chi ọ̀ bọwala?” (11)

  • 22

    • Ihe Chineke kpebiri ime Ndagwurugwu Ọhụụ (1-14)

    • Elayakim nọchiri Shebna bụ́ onye na-elekọta ụlọ (15-25)

      • E nwere ihe otu ntu a kụbara n’ahụ́ ụlọ pụtara (23-25)

  • 23

    • Ihe Chineke kpebiri ime Taya (1-18)

  • 24

    • Jehova ga-eme ka ala a tọgbọrọ nkịtị (1-23)

      • Jehova abụrụla Eze na Zayọn (23)

  • 25

    • Ihe ọma dị iche iche ga-emere ndị Chineke (1-12)

      • Jehova ga-akpọ nnukwu oriri a ga-aṅụ mmanya dị mma (6)

      • Ọnwụ agaghịzi adị (8)

  • 26

    • Abụ gbasara ịtụkwasị Chineke obi na ịzọpụta ndị mmadụ (1-21)

      • Jaa Jehova bụ Oké Nkume na-adịru mgbe ebighị ebi (4)

      • Ndị bi n’ụwa ga-amụta ime ezi omume (9)

      • “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ” (19)

      • Banyenụ n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime zoo (20)

  • 27

    • Jehova gburu nnukwu anụ mmiri (1)

    • Abụ gbasara ndị Izrel, ndị a kpọrọ ubi vaịn (2-13)

  • 28

    • Ndị aṅụrụma, bụ́ ndị Ifrem, ga-ata ahụhụ (1-6)

    • Ndị nchụàjà Juda na ndị amụma ndị na-adagharị n’ihi mmanya na-egbu ha (7-13)

    • “Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ” (14-22)

      • Nkume dị oké ọnụ nke dị na Zayọn (16)

      • Ọrụ dị ịtụnanya Jehova rụrụ (21)

    • Ihe atụ otú Jehova si enye ndụmọdụ nke na-eme ka mmadụ mara ihe (23-29)

  • 29

    • Ariel ga-ata ahụhụ (1-16)

      • Chineke jụrụ ndị na-ejighị obi ha na-efe ya (13)

    • Ndị ntị chiri ga-anụ ihe, ndị ìsì ga-ahụkwa ụzọ (17-24)

  • 30

    • E nweghị uru ọ bụla aka ndị Ijipt na-enye ga-aba (1-7)

    • Ndị mmadụ anabataghị amụma a na-eburu ha (8-14)

    • Ịtụkwasị Chineke obi ga-eme ka mmadụ dị ike (15-17)

    • Jehova na-emere ndị ya amara (18-26)

      • Jehova bụ Onye Ozizi Kachanụ (20)

      • “Lekwanụ ụzọ” (21)

    • Jehova ga-ata ndị Asiria ahụhụ maka ihe ha mere (27-33)

  • 31

    • Ọ bụ Chineke na-enyere mmadụ ezigbo aka (1-9)

      • Ịnyịnya ndị Ijipt bụ anụ ahụ́ (3)

  • 32

    • E nwere otu eze na ndị isi ga na-ekpe ikpe ziri ezi ma ha chịwa (1-8)

    • A dọrọ ụmụ nwaanyị na-anaghị eji ihe ọ bụla akpọrọ ihe aka ná ntị (9-14)

    • Ihe ọma ndị ga-emere ndị mmadụ mgbe Chineke ga-awụsa ha mmụọ ya (15-20)

  • 33

    • Ahụhụ a ga-ata ndị ajọ omume na ihe ọma ga-emere ndị ezi omume (1-24)

      • Jehova bụ Onyeikpe, Onye na-enye iwu, na Eze (22)

      • E nweghịzi onye ga-asị: “Ahụ́ adịghị m” (24)

  • 34

    • Jehova na-eweso mba niile iwe (1-4)

    • A ga-eme ka Ịdọm tọgbọrọ nkịtị (5-17)

  • 35

    • Ụwa ga-abụ paradaịs ọzọ (1-7)

      • Ndị ìsì ga-ahụwa ụzọ, ndị ntị chiri anụwakwa ihe (5)

    • Ndị a gbapụtara ebe e ji ha eji ga na-aga n’Ụzọ Dị Nsọ (8-10)

  • 36

    • Senakerib bịara ịlụso Juda agha (1-3)

    • Rabshake kparịrị Jehova (4-22)

  • 37

    • Hezekaya si n’aka Aịzaya rịọ Chineke ka o nyere ha aka (1-7)

    • Senakerib menyere ndị bi na Jeruselem ụjọ (8-13)

    • Ekpere Hezekaya kpere (14-20)

    • Aịzaya gwara Hezekaya ihe Chineke kwuru (21-35)

    • Otu mmụọ ozi gburu ndị Asiria dị 185,000 (36-38)

  • 38

    • Hezekaya rịara ọrịa, gbakeekwa (1-22)

      • Abụ Hezekaya ji kelee Chineke (10-20)

  • 39

    • Ndị si Babịlọn bịa zie Hezekaya ozi (1-8)

  • 40

    • A kasiri ndị Chineke obi (1-11)

      • Onye nọ n’ala ịkpa na-eti mkpu (3-5)

    • Otú Chineke si dị ebube (12-31)

      • Mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ (15)

      • Chineke bi n’ebe dị elu karịa “ụwa dị gburugburu” (22)

      • Chineke na-akpọ kpakpando niile aha n’otu n’otu (26)

      • Ike anaghị agwụ Chineke (28)

      • Ndị nwere olileanya na Jehova ga-enwetaghachi ike (29-31)

  • 41

    • Onye si ebe ọwụwa anyanwụ nke na-emeri mba dị iche iche (1-7)

    • Chineke họọrọ Izrel ka ọ bụrụ ohu ya (8-20)

      • ‘Ebreham bụ enyi m’ (8)

    • Chineke gwara arụsị dị iche iche ka ha zara ọnụ ha (21-29)

  • 42

    • Ohu Chineke na ọrụ e nyere ya (1-9)

      • ‘Jehova bụ aha m’ (8)

    • Abụ ọhụrụ e ji eto Jehova (10-17)

    • Ndị Izrel kpuru ìsì, ntị chikwara ha (18-25)

  • 43

    • Jehova ga-akpọkọta ndị ya ọzọ (1-7)

    • A ga-anwale chi dị iche iche (8-13)

      • “Unu bụ ndị àmà m” (10, 12)

    • Ndị Babịlọn ga-ahapụ ndị Chineke (14-21)

    • “Ka anyị leba okwu mụ na unu anya” (22-28)

  • 44

    • Ihe ọma ndị ga-emere ndị Chineke họọrọ (1-5)

    • Ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wezụga Jehova (6-8)

    • Arụsị mmadụ na-apị anaghị aba uru ọ bụla (9-20)

    • Jehova bụ Onye Mgbapụta ndị Izrel (21-23)

    • Chineke ga-esi n’aka Saịrọs mee ka ihe dị otú ọ dịbu (24-28)

  • 45

    • Chineke họpụtara Saịrọs ka o merie Babịlọn (1-8)

    • Ụrọ ekwesịghị isesa onye ji ya na-akpụ ihe okwu (9-13)

    • Mba dị iche iche ga na-akwanyere ndị Izrel ùgwù (14-17)

    • Ihe niile Chineke kere dị mma, ihe niile o kwuru ga-emezukwa (18-25)

      • Chineke kere ụwa ka ndị mmadụ biri na ya (18)

  • 46

    • Chineke ndị Izrel na-efe na chi dị iche iche ndị Babịlọn na-efe (1-13)

      • Jehova kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu (10)

      • Nnụnụ na-eri anụ nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa (11)

  • 47

    • A ga-ebibi Babịlọn (1-15)

      • Ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu agaghị enyeliri ya aka (13-15)

  • 48

    • A baara ndị Izrel mba, meekwa ka ha dị ọcha (1-11)

    • Jehova ga-emesi Babịlọn ike (12-16a)

    • Chineke na-akụzi ihe bara uru (16b-19)

    • “Sinụ na Babịlọn pụọ” (20-22)

  • 49

    • Ọrụ ohu Jehova ga-arụ (1-12)

      • E nwere onye ga-abụrụ mba dị iche iche ìhè (6)

    • A ga-akasi ndị Izrel obi (13-26)

  • 50

    • Mmehie ndị Izrel mere kpatara nsogbu (1-3)

    • Ohu Jehova nke na-erube isi (4-11)

      • Ire na ntị ndị a na-akụziri ihe (4)

  • 51

    • Zayọn ga-adị ka ubi Iden (1-8)

    • Onye kere ndị bi na Zayọn kasiri ha obi (9-16)

    • Iko nke na-egosi na iwe ji Jehova (17-23)

  • 52

    • Zayọn, teta! (1-12)

      • Ụkwụ ndị na-ezi ozi ọma mara ezigbo mma (7)

      • Ndị nche nọ na Zayọn ji otu olu na-eti mkpu (8)

      • Ndị na-ebu arịa Jehova kwesịrị ịdị nsọ (11)

    • A ga-ebuli ohu Jehova elu (13-15)

      • Onye e mere ihe otú ndị ma ya na-agaghị amata ya (14)

  • 53

    • Ohu Jehova tara ahụhụ, nwụọ, e liekwa ya (1-12)

      • E ledara ohu Jehova anya, e jighịkwa ya kpọrọ ihe (3)

      • O buuru ọrịa anyị na ihe na-egbu anyị mgbu (4)

      • “A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu” (7)

      • O buuru mmehie ọtụtụ ndị (12)

  • 54

    • Zayọn na-amụghị nwa ga-enwe ọtụtụ ụmụ ndị nwoke (1-17)

      • Jehova bụ di Zayọn (5)

      • Jehova ga-akụziri ụmụ Zayọn ihe (13)

      • Ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso Zayọn ọgụ agaghị enwe isi (17)

  • 55

    • A kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa rie ma ṅụọ n’akwụghị ụgwọ (1-5)

    • Chọọnụ Jehova, kwerekwanụ na ihe o kwuru ga-emezurịrị (6-13)

      • Ụzọ Chineke dị elu karịa nke mmadụ (8, 9)

      • Okwu Chineke ga-emezurịrị (10, 11)

  • 56

    • A ga-agọzi ndị mba ọzọ na ndị ọnaozi (1-8)

      • Ụlọ ekpere maka mba niile (7)

    • Ndị nche kpuru ìsì bụ nkịta dara ogbi (9-12)

  • 57

    • Onye ezi omume na ndị jisiri Chineke aka ike na-ala n’iyi (1, 2)

    • E kwuru otú ndị Izrel si na-agba akwụna (3-13)

    • A ga-akasi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha obi (14-21)

      • Ndị ajọ omume yiri oké osimiri nke na-enweghị ike ịdajụ (20)

      • Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume (21)

  • 58

    • Ibu ọnụ nke dị mma na nke na-adịghị mma (1-12)

    • Iwere Ụbọchị Izu Ike ka ụbọchị obi ụtọ (13, 14)

  • 59

    • Mmehie ndị Izrel na-eme ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma (1-8)

    • Ikwupụta mmehie (9-15a)

    • Jehova napụtara ndị chegharịrị echegharị (15b-21)

  • 60

    • Ebube Jehova na-enwu ka ìhè na Zayọn (1-22)

      • Ka nduru ndị feere na-aga n’akwụ́ ha (8)

      • A ga-eji ọlaedo dochie ọla kọpa (17)

      • Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ (22)

  • 61

    • Onye e tere mmanụ izi ozi ọma (1-11)

      • “Afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara” (2)

      • “Nnukwu osisi nke ezi omume” (3)

      • Ndị ala ọzọ ga-abịa nye aka (5)

      • “Ndị nchụàjà Jehova” (6)

  • 62

    • Aha ọhụrụ a ga na-akpọ Zayọn (1-12)

  • 63

    • Ihe Jehova mere mba dị iche iche maka ihe ha mere (1-6)

    • Ihe Jehova mere n’oge gara aga iji gosi na ọ naghị akwụsị ịhụ ndị ya n’anya (7-14)

    • Ekpere ndị chegharịrị echegharị kpere (15-19)

  • 64

    • Ekpere ọzọ ndị chegharịrị echegharị kpere (1-12)

      • Ọ bụ Jehova kpụrụ anyị (8)

  • 65

    • Jehova ga-ata ndị na-ekpere arụsị ahụhụ (1-16)

      • Chi Ihu Ọma na chi Akara Aka (11)

      • “Ndị ohu m ga na-eri ihe” (13)

    • Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ (17-25)

      • Ha ga-arụ ụlọ, kọọkwa ubi vaịn (21)

      • E nweghị onye ga-arụsi ọrụ ike na nkịtị (23)

  • 66

    • Ofufe nke dị Chineke mma na nke na-adịghị ya mma (1-6)

    • Zayọn na ụmụ ya (7-17)

    • A kpọkọtara ndị mmadụ na Jeruselem ka ha fee Chineke (18-24)