Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Zekaraya

Isi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (1-6)

      • ‘Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwute unu’ (3)

    • Ọhụụ nke Mbụ: Ndị na-agba ịnyịnya n’ebe e nwere osisi metụl (7-17)

      • “Jehova ga-akasi Zayọn obi ọzọ” (17)

    • Ọhụụ nke Abụọ: Mpi anọ na ndị omenkà anọ (18-21)

  • 2

    • Ọhụụ nke Atọ: Nwoke ji ụdọ e ji atụ̀ ihe (1-13)

      • A ga-atụ Jeruselem atụ̀ (2)

      • Jehova ga-abụ “mgbidi ọkụ gburugburu” (5)

      • Imetụ mkpụrụ anya Chineke aka (8)

      • Ọtụtụ mba ga-esonyere Jehova (11)

  • 3

    • Ọhụụ nke Anọ: E yiwere nnukwu onye nchụàjà uwe dị mma (1-10)

      • Setan megidere Joshụa, nnukwu onye nchụàjà (1)

      • ‘M ga-akpọbata ohu m bụ́ Ome’ (8)

  • 4

    • Ọhụụ nke Ise: Ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ (1-14)

      • ‘Ọ bụghị ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha’ (6)

      • Eledala ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite anya (10)

  • 5

    • Ọhụụ nke Isii: Akwụkwọ mpịakọta na-efe efe (1-4)

    • Ọhụụ nke Asaa: Ihe e ji atụ̀ ihe (5-11)

      • Aha nwaanyị nọ n’ime ya bụ Ajọ Omume (8)

      • E bugara ihe ahụ e ji atụ̀ ihe n’ala Shaịna (9-11)

  • 6

    • Ọhụụ nke Asatọ: Ụgbọ ịnyịnya anọ (1-8)

    • Ome ahụ ga-abụ eze na onye nchụàjà (9-15)

  • 7

    • Jehova anabataghị ibu ọnụ na-esighị ndị ya n’obi (1-14)

      • ‘Ọ̀ bụ m ka unu buuru ọnụ n’eziokwu?’ (5)

      • ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi, na-ahụnụ ibe unu n’anya, na-emerenụ ibe unu ebere’ (9)

  • 8

    • Jehova ga-eme ka eziokwu na udo dịrị na Zayọn (1-23)

      • Jeruselem bụ “obodo eziokwu” (3)

      • “Na-agwanụ ibe unu eziokwu” (16)

      • Oge ibu ọnụ ga-abụzi oge ememme (18, 19)

      • ‘Ka anyị jiri obi anyị niile chọọ Jehova’ (21)

      • Mmadụ iri ga-ejide uwe onye Juu (23)

  • 9

    • Ihe Chineke kpebiri ime mba ndị gbara Juda gburugburu (1-8)

    • Eze Zayọn na-abịa (9, 10

      • Eze dị umeala n’obi nọ n’elu jakị (9)

    • A ga-akpọpụta ndị Jehova a tụrụ mkpọrọ (11-17)

  • 10

    • Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo (1, 2)

    • Jehova ga-eme ka ndị ya dị n’otu (3-12)

      • E si n’ụlọ Juda nweta onyeisi (3, 4)

  • 11

    • Ahụhụ ndị hapụrụ onye ọzụzụ atụrụ Chineke họpụtara ga-ata (1-17)

      • ‘Lekọtanụ atụrụ ndị a chọrọ igbu egbu’ (4)

      • Mkpara abụọ: Ịdị Mma na Ịdị n’Otu (7)

      • Ụgwọ ọrụ onye ọzụzụ atụrụ: mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ (12)

      • A wụsara ego ahụ n’ebe a na-edowe akụ̀ (13)

  • 12

    • Jehova ga-echebe Juda na Jeruselem (1-9)

      • Jeruselem bụ “nkume dị arọ” (3)

    • A ga-ebere onye a mara ube ákwá arịrị (10-14)

  • 13

    • A ga-ewepụ arụsị niile na ndị amụma ụgha (1-6)

      • Ihere ga-eme ndị amụma ụgha (4-6)

    • A ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ (7-9)

      • A ga-anụcha otu ụzọ n’ime ụzọ atọ (9)

  • 14

    • Mmadụ niile ga-efewe ezi Chineke (1-21)

      • Ugwu Oliv ga-agbawa abụọ (9)

      • Jehova ga-abụ otu, nweekwa otu aha (9)

      • A ga-eme ka ndị iro Jeruselem rịa ọrịa ọjọọ (12-15)

      • A ga-eme Ememme Ụlọ Ndò (16-19)

      • Ite ọ bụla ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ (20, 21)