Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ndịozi

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Akwụkwọ ozi e degaara Tiofilọs (1-5)

    • Ndị ga-agba àmà banyere Jizọs ruo ebe kacha anya n’ụwa (6-8)

    • Mgbe Jizọs rịgooro eluigwe (9-11)

    • Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji otu obi zukọọ (12-14)

    • A họpụtara Matayas ka ọ nọchie Judas (15-26)

  • 2

    • Mmụọ nsọ dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs na Pentikọst (1-13)

    • Okwu Pita kwuru (14-36)

    • Ihe ndị mmadụ mere mgbe Pita kwuchara okwu (37-41)

      • E mere puku mmadụ atọ baptizim (41)

    • Ndị Kraịst na-anọkọ, na-erikọ nri, na-ekpekọkwa ekpere (42-47)

  • 3

    • Pita gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ (1-10)

    • Okwu Pita nọ na Varanda Solomọn kwuo (11-26)

      • ‘Chineke ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ (21)

      • Onye amụma dị ka Mosis (22)

  • 4

    • E jidere Pita na Jọn (1-4)

      • Mgbe ụmụ nwoke ndị na-eso ụzọ Jizọs ruru 5,000 (4)

    • Mgbe ndị Sanhedrin na-ekpe Pita na Jọn ikpe (5-22)

      • ‘Anyị enweghị ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma’ (20)

    • Ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ Chineke ka o mee ka ha na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu (23-31)

    • Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-enye ibe ha ihe ndị ha nwere (32-37)

  • 5

    • Ananayas na Safaịra (1-11)

    • Ndịozi nọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube (12-16)

    • A tụrụ ndịozi mkpọrọ, mmụọ ozi akpọpụta ha (17-21a)

    • A kpọtara ndịozi ahụ ọzọ n’ihu ndị Sanhedrin (21b-32)

      • “Anyị ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ” (29)

    • Aro Gameliel tụụrụ ndị Sanhedrin (33-40)

    • Ndịozi kwusara ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ (41, 42)

  • 6

    • A họpụtara ụmụ nwoke asaa ga na-eje ozi (1-7)

    • E boro Stivin ebubo na ọ na-ekwulu Mosis na Chineke (8-15)

  • 7

    • Ihe Stivin kwuru n’ihu ndị Sanhedrin (1-53)

      • Ihe mere n’oge ndị nna nna ndị Juu (2-16)

      • Otú Mosis si duo ndị Izrel na otú ha si kpeere arụsị (17-43)

      • Chineke anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ (44-50)

    • E ji nkume tụgbuo Stivin (54-60)

  • 8

    • Sọl na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs ike (1-3)

    • Ndị Sameria gere ntị n’ozi ọma Filip ziri ha (4-13)

    • E zigara Pita na Jọn Sameria (14-17)

    • Saịmọn nwara iji ego nweta mmụọ nsọ (18-25)

    • Otu nwoke Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ (26-40)

  • 9

    • Mgbe Sọl na-aga Damaskọs (1-9)

    • E zigara Ananayas ka ọ gaa nyere Sọl aka (10-19a)

    • Mgbe Sọl nọ na Damaskọs na-ekwusa ozi ọma gbasara Jizọs (19b-25)

    • Mgbe Sọl gara Jeruselem (26-31)

    • Mgbe Pita gwọrọ Anias (32-35)

    • Mgbe a kpọlitere Dọkas n’ọnwụ (36-43)

  • 10

    • Ọhụụ Kọnịliọs hụrụ (1-8)

    • Pita hụrụ anụ ndị e mere ka ha dị ọcha n’ọhụụ (9-16)

    • Mgbe Pita gara na nke Kọnịliọs (17-33)

    • Pita ziri ndị mba ọzọ ozi ọma (34-43)

      • “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu” (34, 35)

    • Mmụọ nsọ dakwasịrị ndị mba ọzọ, e meekwa ha baptizim (44-48)

  • 11

    • Pita kọọrọ ndịozi ndị ọzọ ihe merenụ (1-18)

    • Banabas na Sọl gara Antiọk nke dị na Siria (19-26)

      • Mgbe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst (26)

    • Agabọs buru amụma na ụnwụ ga-ada (27-30)

  • 12

    • E gburu Jems, tụọ Pita mkpọrọ (1-5)

    • Mmụọ ozi kpọpụtara Pita n’ụlọ mkpọrọ (6-19)

    • Mmụọ ozi mere ka ikpuru gbaa Herọd (20-25)

  • 13

    • E zipụrụ Banabas na Sọl ka ha gaa mba ọzọ na-ekwusa ozi ọma (1-3)

    • Mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na Saịprọs (4-12)

    • Okwu Pọl kwuru n’Antiọk nke dị na Pisidia (13-41)

    • Jehova gwara Pọl ka ọ gaa zie ndị mba ọzọ ozi ọma (42-52)

  • 14

    • E nwekwuru ndị na-eso ụzọ Jizọs n’Aịkoniọm, a kpagbukwara ha (1-7)

    • Ndị Listra chere na Pọl na Banabas bụ chi (8-18)

    • A tụrụ Pọl nkume, ma ọ nwụghị (19, 20)

    • Ha nọ na-agba ọgbakọ dị iche iche ume (21-23)

    • Ha gaghachiri Antiọk nke dị na Siria (24-28)

  • 15

    • Okwu e sere n’Antiọk gbasara ibi úgwù (1, 2)

    • A gara Jeruselem ka e kpebie okwu gbasara ibi úgwù (3-5)

    • Ndị okenye na ndịozi zukọrọ (6-21)

    • Akwụkwọ ozi òtù na-achị isi dere (22-29)

    • E ji akwụkwọ ozi gbaa ọgbakọ dị iche iche ume (30-35)

    • Pọl na Banabas gawara iche iche (36-41)

  • 16

    • Pọl kpọọrọ Timoti (1-5)

    • Pọl hụrụ otu nwoke Masedonia n’ọhụụ (6-10)

    • Otú Lidia si ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs na Filipaị (11-15)

    • A tụrụ Pọl na Saịlas mkpọrọ (16-24)

    • Onye na-elekọta ụlọ nga na ndị ezinụlọ ya mere baptizim (25-34)

    • Pọl kwuru ka ndị isi obodo bịa rịọ ha mgbaghara (35-40)

  • 17

    • Mgbe Pọl na Saịlas nọ na Tesalonaịka (1-9)

    • Mgbe Pọl na Saịlas nọ na Beria (10-15)

    • Mgbe Pọl nọ n’Atens (16-22a)

    • Okwu Pọl kwuru n’Ariopagọs (22b-34)

  • 18

    • Ozi ọma Pọl kwusara na Kọrịnt (1-17)

    • Pọl laghachiri Antiọk nke dị na Siria (18-22)

    • Pọl gara Galeshia na Frijia (23)

    • E nyeere Apọlọs, bụ́ ọkà okwu, aka (24-28)

  • 19

    • Mgbe Pọl nọ n’Efesọs; e megharịrị ụfọdụ ndị baptizim (1-7)

    • Pọl na-aga akụziri ndị mmadụ okwu Chineke (8-10)

    • Ndị mmụọ ọjọọ akwụsịghị Pọl izi ozi ọma (11-20)

    • E nwere ọgba aghara n’Efesọs (21-41)

  • 20

    • Pọl gara Masedonia na Gris (1-6)

    • A kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ na Troas (7-12)

    • Pọl si Troas gaa Maịlitọs (13-16)

    • Pọl na ndị okenye Efesọs zukọrọ (17-38)

      • Pọl ziri ndị mmadụ ihe n’ụlọ n’ụlọ (20)

      • “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe” (35)

  • 21

    • Mgbe Pọl hà na-aga Jeruselem (1-14)

    • Mgbe ha ruru Jeruselem (15-19)

    • Pọl mere ihe ndị okenye gwara ya mee (20-26)

    • Ndị mmadụ malitere ịkpa aghara n’ụlọ nsọ, e jide Pọl (27-36)

    • A hapụrụ Pọl ka ọ gwa ndị gbakọrọnụ okwu (37-40)

  • 22

    • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu ndị gbakọrọnụ (1-21)

    • Pọl kwuru na ya bụ onye Rom, a hapụ ịpịa ya ihe (22-29)

    • Ndị Sanhedrin zukọrọ (30)

  • 23

    • Okwu Pọl kwuru n’ihu ndị Sanhedrin (1-10)

    • Onyenwe anyị gbara Pọl ume (11)

    • A kpara nkata igbu Pọl (12-22)

    • A kpụgara Pọl Sizaria (23-35)

  • 24

    • Ebubo ndị e boro Pọl (1-9)

    • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu Feliks (10-21)

    • E yigharịrị ikpe Pọl ruo afọ abụọ (22-27)

  • 25

    • Mgbe Festọs na-eleba okwu Pọl anya (1-12)

      • “Achọrọ m ka Siza kpee ikpe a” (11)

    • Festọs gwara Eze Agrịpa gbasara Pọl (13-22)

    • A kpọpụtara Pọl n’ihu Agrịpa (23-27)

  • 26

    • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu Agrịpa (1-11)

    • Pọl kọrọ otú o si ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs (12-23)

    • Ihe Festọs na Agrịpa gwara Pọl (24-32)

  • 27

    • E ji ụgbọ mmiri buru Pọl gawa Rom (1-12)

    • Oké ifufe nọ na-ebugharị ụgbọ ahụ (13-38)

    • Ụgbọ ahụ kpuru (39-44)

  • 28

    • Pọl hà ruru Mọlta (1-6)

    • Mgbe Pọl gwọrọ nna Pọbliọs (7-10)

    • Mgbe Pọl hà rutewere Rom (11-16)

    • Pọl gwara ndị Juu nọ na Rom okwu (17-29)

    • Pọl kwusara ozi ọma afọ abụọ n’atụghị egwu (30, 31)