Anyị Bụ Otu Ezinụlọ
Danloduo:
Akwụkwọ Egwú
1. Anyị si n’elu fedata
N’obodo anyị n’amaghị.
Ọ bụ Jehova
N’elekọt’anyị.
Ọ bụ ya n’agọzia-nyị.
Anyị n’agbalị n’ejere y’ozi.
Jehova k’anyị n’efe.
Anyị si n’obia-nyị h’ụmụnn’anyị n’anya.
Anyị n’asị unu:
(UKWE)
“Anyị bụn-dị Jehova.
Anyị dum bụ ezinụlọ.
Anyị si nám-ba d’ich’iche.
Man’anyị
Bụ ezinụlọ.”
2. Unu dum nọ n’echer’anyị,
K’unu kele’anyị, makụ’anyị.
Egwú n’ebido kpọwa nám-gbakọ.
Anyị n’adịkwu n’otu.
M’anyị ma n’ọ bụ naanị Jehova
Mere k’anyị dị n’udo.
K’anyị kelee Jehova, n’ahụkwa ya n’anya
N’ebo nám-ba niile.
(UKWE)
“Anyị bụn-dị Jehova.
Anyị dum bụ ezinụlọ.
Anyị si nám-ba d’ich’iche.
Man’anyị
Bụ ezinụlọ.”
3. Ụgbọelu bua-nyị n’efega
N’ebea-nyị g’ezi oziọ-ma.
Anyị n’enweta ndị chọr’ịnụ
Ozi Jehova ziri.
Ụmụnna n’elet’anyị. Ha n’eme
K’ahụ́ ruo anyị ala.
N’agbanyeghị na ha si n’ebe d’ich’iche,
A’yị hụrụ ha n’anya.
(AHỊRỊ ỌZỌ)
Anyị niile
Nwer’ezinụlọ n’ebe niile n’ụwa,
Si Mali ruo Meksiko,
Si Japan ruo Jamaịka.
(UKWE)
“Anyị bụn-dị Jehova.
Anyị dum bụ ezinụlọ.
Anyị si nám-ba d’ich’iche.
Man’anyị
Bụ ezinụlọ.
Anyị si n’ebo niile.
Anyị dum bụ ezinụlọ.
Anyị nwer’ez’ịhụnanya
N’ihi na a’yị bụn-dị Jehova.
Fiji, Tehiti, na Niu Kaledonia;
Navaho, Blakfut, na Cheroki;
Azebaịjan, Kazakstan, na Estonia,
Anyị dum bụ ezinụlọ.”