Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Dịrị Ka Nwata

Dịrị Ka Nwata

Were Ya:

  • Akwụkwọ Egwú

  1. 1. Jizọs k’anyị n’eso.

    Sọ ya k’anyị n’agbaso.

    Esemokwu juru n’ebe niile.

    Ma, Jizọs gwar’anyị niile

    K’anyị jisi’ike dịrị ka nwata, hụn-dị ‘madụ n’anya.

    (UKWE)

    K’anyị gbalịa hụ ha n’anya dị k’ụmụaka.

    Gị na ha dịrịkwa n’udo ma dị nám-ma.

    K’anyị gbalịa n’em’ebere dị k’ụmụaka.

    Gị na ha jisi’ike k’unu dịrị nám-ma.

  2. 2. Ihe niile n’akan-jọ.

    Àgwàn-dị ‘madụ n’akan-jọ.

    Mkpọrọmasị jur’ebe niile.

    Man-dị Jehova pụr’iche.

    K’anyị sọpụrụ ‘madụ niile ma nyere ha aka.

    (UKWE)

    K’anyị gbalịa hụ ha n’anya dị k’ụmụaka.

    Gị na ha dịrịkwa n’udo ma dị nám-ma.

    K’anyị gbalịa n’em’ebere dị k’ụmụaka.

    Gị na ha jisi’ike k’unu dịrị nám-ma.

    Dịrị ka nwata.

    (AHỊRỊ ỌZỌ)

    K’anyị jisi’ike

    N’efe Jehova,

    N’agbalịs’ike

    N’ozi Jehova.

    K’anyị n’echeta

    Na Jizọs Kraịst sịrị

    K’anyị niile dịrị ka nwata.

    (UKWE)

    K’anyị gbalịa hụ ha n’anya dị k’ụmụaka.

    Gị na ha dịrịkwa n’udo ma dị nám-ma.

    K’anyị gbalịa n’em’ebere dị k’ụmụaka.

    Gị na ha jisi’ike k’unu dịrị nám-ma.

    Dịrị ka nwata.