Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya M

Ịhụnanya M

Were Ya:

  • Akwụkwọ Egwú

  1. 1. Ọ bụ gị

    Bụ nwaanyị dịm n’obi.

    Ọ bụ gị

    N’emedam obi.

    Omume gị n’eme

    K’obi n’atọm ụtọ.

    Ka Chineke

    Mee k’anyị bie n’udo.

    M hụrụ gị n’anya

    Maka n’ị n’akwadom.

    Ị bụ ezi nwaanyị

    N’asọpụrụ di ya.

    (UKWE)

    Anyị ga n’ebi n’udo

    N’agbanyeghị nsogbu.

    Jehova ga n’eme k’anyị dị nám-ma,

    Ịhụnanyam.

  2. 2. Ị hụrụm n’anya.

    Ị n’eche banyerem.

    Anyị abụọ

    Ga n’efe Jehova.

    O dokwaram anya

    N’ihem n’amasị gị.

    Ọ bụ gị ga n’abụ

    Onyem hụrụ n’anya.

    (UKWE)

    Anyị ga n’ebi n’udo

    N’agbanyeghị nsogbu.

    Jehova ga n’eme k’anyị dị nám-ma,

    Ịhụnanyam.

    Anyị ga n’ebi n’udo

    N’agbanyeghị nsogbu.

    Jehova ga n’eme k’anyị dị nám-ma,

    Ịhụnanyam,

    Ịhụnanyam,

    Obim.