Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agbaghara Kpamkpam

Na-agbaghara Kpamkpam

Danloduo:

  • Akwụkwọ Egwú

  1. 1. E nwer’onye kpasurum iwe.

    Ma, gịnị g’eme k’anyị mezie?

    Gịnị g’eme k’anyị kpezie?

    M kwesịrị ịgbaghara ya.

    Ma, m chewe na o sighịm n’aka,

    Obim agagh’ekwem gbaghara.

    (TUPU UKWE)

    Kam jisi’ike kọọrọ ya Chinekem.

    Jehova maar’ihe niile n’ewutem.

    Ọ g’enyerem aka ma

    (UKWE)

    Mee kam wetu’obi.

    Ọ bụ ya g’emedam obi.

    Biko, Jehova Chineke,

    Mee kam n’agbaghara.

    A’yị mejọọ Jehova,

    Ọ n’agbaghara ma n’echefu ya.

    Biko, Jehova Chineke,

    Mee kam n’agbaghara.

    N’agbaghara.

  2. 2. M gbalịrị kam kwụs’iw’iwe.

    Man’iwe ka jurum n’obi.

    Gịnị g’eme k’iwe pụọm n’obi?

    Ihe g’eme k’anyị dị nám-ma

    Bụ mam gbaghara ma chefuchaa ya.

    Ọ bụ ya g’enyerem aka.

    (TUPU UKWE)

    Kam jisi’ike kọọrọ ya Chinekem.

    Jehova maar’ihe niile n’ewutem.

    Ọ g’enyerem aka ma

    (UKWE)

    Mee kam wetu’obi.

    Ọ bụ ya g’emedam obi.

    Biko, Jehova Chineke,

    Mee kam n’agbaghara.

    A’yị mejọọ Jehova,

    Ọ n’agbaghara ma n’echefu ya.

    Biko, Jehova Chineke,

    Mee kam n’agbaghara.

    N’agbaghara.

    N’agbaghara.

    N’agbaghara.

    N’agbaghara.